bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 15
Mark 15
Igbo 1988
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 16 →
1
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, ndị isi nchụaja na ndị okenye na ndị ozizi iwu na ndị nile na-eso ha anọdụ nꞌụlọ ikpe ndị Juu zukọtara ikpebi ihe ọzọ ha ga-eme. Ha kpebiri iji ndị nche duru Jisọs jekwuru Paịlet, bụ onye na-achị obodo ndị Juu nꞌoge a.
2
Mgbe Pailet hụrụ Jisọs, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ị bụ eze ndị Juu?” Jisọs zara sị ya, “Ee, ọ bụ dị ka i siri kwuo ya.”
3
Mgbe ahụ ndị isi nchụaja bidoro ikwu ọtụtụ ihe ọjọọ ha sị na Jisọs mere. Ma Jisọs emegheghị ọnụ ya ịgọrọ onwe ya.
4
Nke a mere Pailet jiri jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ị̀ dịghị ekwu okwu? Lee ọtụtụ ebubo ha na-ebo gị!”
5
Ma Jisọs ekwughị ihe ọ bụla. Nke a juru Pailet anya.
6
Nꞌoge ahụ, ọ bụ omenala na Pailet ga-ahapụrụ ndị Juu otu onye nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌoge mmemme ngabiga. Onye mkpọrọ Pailet na-ahapụ na-abụ onye ahụ ndị Juu chọrọ.
7
Nꞌoge ahụ kwa, otu nwoke a na-akpọ Barabas nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ya na ụfọdụ ndị na-ebu aghara, ndi gbukwara mmadụ nꞌoge ọgba aghara ahụ.
8
Igwe mmadụ gbakọrọ na-ajụ Pailet ka o mezuo omenala ahụ site nꞌịhapụrụ ha otu onye.
9
Mgbe ahụ Pailet jụrụ ha, “Unu chọrọ ka m hapụrụ unu eze ndị Juu?”
10
Nꞌihi na Pailet maara na ndị isi nchụaja sitere nꞌekworo chọọ igbu Jisọs, nꞌihi na ihe banyere ya dị ọtụtụ mmadụ mma.
11
Ma ndị isi nchụaja kwaliri igwe mmadụ ka ha kwagide Pailet ka ọ hapụrụ ha Barabas kama Jisọs.
12
Pailet jụrụ ha, “Gịnị ka unu chọrọ ka m jiri nwoke a unu kpọrọ eze ndị Juu mee?”
13
Ha tiri mkpu sị, “Kpọgide ya nꞌobe!”
14
Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Nꞌihi gịnị? Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere?” Ma igwe mmadụ ahụ tiri mkpu na-asị, “Kpọgide ya nꞌobe!”
15
Ebe ọ bụ na Pailet chọrọ ime ka obi tọọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụrụ Barabas. Emesịa, o nyere ndị agha ya iwu ka ha pịa Jisọs ihe. Nꞌikpeazụ, o nyefere ya ka a kpọgide ya nꞌobe.
16
Ndị agha ndị Rom ahụ duuru Jisọs baa nꞌime ime ogige ụlọ onye ọchichị ahụ. Ha kpọkọtara ndị agha nile nọ nꞌebe ahụ.
17
Ha yikwasịrị Jisọs uwe ndị eze, nke na-acha uhie uhie. Ha jikwa ogwu kpaa okpu ha kpukwasịrị ya nꞌisi.
18
Emesịa, ha bidoro ikele ya, na-eti mkpu na-asị, “Ka eze ndị Juu nwee ogologo ndụ!”
19
Mgbe ha nọ na-eme ya ihe ọchị a, ha jikwa osisi na-eti ya nꞌisi ọtụtụ mgbe, na-agbụkwa ya ọnụ mmiri. Ha gburu ikpere nꞌihu ya na-akpọ isi ala na-enye ya.
20
Mgbe ike gwụrụ ha iji ya mee ihe ọchị, ha yipụrụ ya uwe uhie uhie ahụ, yikwasịkwa ya uwe nke aka ya. Emesịa, ha duuru ya pụọ, ịkpọgide ya nꞌobe.
21
Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga ebe ha ga-anọ kpọgide ya nꞌobe, ha zutere otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, onye Sirini. Nwoke a bụ nna Alegzanda na Rufọs. Ndị agha kwagidere ya ka o buru obe Jisọs.
22
Nꞌikpeazụ, ha duuru Jisọs rute ebe a na-akpọ Gọlgọta, nke pụtara, ebe okpokoro isi.
23
Ha nyere ya mmanya a gwara ọgwụ, nke ga-egbochi ya inwe ihe mgbu, ma Jisọs jụrụ ịṅụ ya.
24
Emesịa, ha kpọgidere ya nꞌosisi. Ndị agha ahụ kere uwe ya nꞌetiti onwe ha, fee nza ịchọpụta onye ga-enwe nke ọ ga-enwe.
25
Ọ bụ nꞌelekere toolu nke ụtụtụ ka ha jiri kpọgide ya nꞌosisi.
26
Ọ dị ihe e dere kụpanye nꞌelu osisi ahụ. Ebe ahụ ka e dere ebubo e boro Jisọs. Nke a bụ ihe ha dere, “EZE NDỊ JUU”.
27
A kpọgidekwara mmadụ abụọ na-apụnarị mmadụ ihe nꞌụbọchị ahụ. Otu onye nꞌaka nri Jisọs, onye nke ọzọ nꞌaka ekpe ya.
28
Nꞌụzọ dị otu a, e mezuru ihe akwụkwọ nsọ kwuru sị, “A gụkọtara ya na ndị mmadụ ọjọọ.”
29
Ndị mmadụ si nꞌebe ahụ ha kpọgidere ya nꞌobe gafee fufere isi ha na-akwa ya emu na-asị, “Leenụ ya ugbu a! Nke a bụ nwoke ahụ sị na ya ga-akwatụ ụlọ nsọ ukwu Chineke wụgharịa ya nꞌime ụbọchị atọ!
30
Gịnị ka ị nọ nꞌelu obe ahụ na-eme? A sị na ị bụ onye ahụ ị na-akpọ onwe gị, site nꞌelu obe ahụ rịdata! Zọpụtanụ onwe gị!”
31
Ọ bụladị ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu kwakwara ya emu na-asị, “O nwere ike ịzọpụta ndị ọzọ, ma ọ pụghị ịzọpụta onwe ya.”
32
Ha tikuru Jisọs sị ya, “Bịa, Onye nzọpụta, eze Izirel, si nꞌelu obe ahụ rịdata! Anyị ga-ekwerekwa na ị bụ ihe nile i kwuru na ị bụ.” Ndị ahụ akpọgidekọrọ ha na Jisọs nꞌobe nọkwa na-abụ ya ọnụ.
33
Nꞌihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie, ọchịchịrị gbachikọtara ebe nile. Ọchịchịrị a dịgidere ruo nꞌelekere atọ nke ehihie.
34
Nꞌelekere atọ nke ehihie ụbọchị ahụ, Jisọs tiri mkpu akwa nꞌoke olu sị, “Elọi, Elọi, lama sabaktani!” Nke pụtara, “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ nanị m nꞌebe a?”
35
Ma ụfọdụ ndị guzo nso ebe a kpọgidere ya nꞌobe nụrụ okwu a Jisọs kwuru. Ha sịrị, “Geenụ ntị, ọ na-akpọ Ịlaịja!”
36
Ya mere, otu onye nꞌime ha gbara ọsọ gaa weta ogbo, denye ya nꞌime mmanya gbara ụka, fanye ya nꞌogologo osisi, welie ya elu detụ ya nꞌọnụ Jisọs. Mgbe ọ na-eme nke a, ọ sịrị, “Ka anyị leenụ ma Ịlaịja ọ ga-abịa wetuo ya nꞌosisi a!”
37
Mgbe Jisọs tikwara mkpu ọzọ, o kubiri ume, nwụọ.
38
Nꞌotu mgbe ahụ, akwa mgbochi ụlọ nsọ ukwu Chineke, bụ nke dị nꞌetiti ebe nsọ na ebe kachasị nsọ, sitere nꞌelu gbawaa abụọ ruo nꞌọnụ ala ala ya.
39
Mgbe ọchịagha ndị Rom guzo nso nꞌobe ahụ hụrụ otu Jisọs siri nwụọ, ọ sịrị, “Nꞌezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”
40
Ụfọdụ ụmụ nwanyị guzo nꞌebe dị anya na-ele ihe ndị a nile ka ha na-eme. Ndị a bụ Meri Magdalin, Meri nne Jemes nke nta, na Joses, na Salomi.
41
Ụmụ nwanyị ndị a bụ ndị naara eso Jisọs na-ahụ maka mkpa ya, mgbe ọ nọ na Galili. Ha na ụmụ nwanyị ndị ọzọ ndị nọkwa nꞌebe ahụ so Jisọs bịa Jerusalem.
42
Ihe ndị a nile mere nꞌụbọchị ọ ga-abụ o jie bọọ, ọ bụrụ ụbọchị izuike ndị Juu. Ọ bụkwa nꞌoge anyasị ka ha mere.
43
Josef, onye Arimatia, otu nꞌime ndị na-anọ nꞌụlọ ikpe ndị Juu, na onye a na-asọpụrụ, onye bụkwa onye na-ele anya ọbịbịa alaeze ahụ, jiri obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o nye ya ike ibudata ahụ Jisọs.
44
Ọ juru Pailet anya ịnụ na Jisọs anwụọla. Ọ kpọrọ ọchịagha ndị Rom jụọ ya ma ọ bụ eziokwu na Jisọs anwụọla.
45
Mgbe ọchịagha ahụ gwara Pailet na Jisọs anwụọla, Pailet nyere Josef ike iwetu ahụ Jisọs na ili ya.
46
Josef zụtara akwa ọcha dị ogologo. O wedatara ahụ Jisọs, jiri akwa ọcha ahụ kee ya. Emesịa, o buuru ozu Jisọs buba ya nꞌime ili nke aka ya, nke o gwuru nꞌime nkume. Nꞌikpeazụ, o nuketara otu nkume buru ibu, jiri ya mechie ọnụ ili ahụ.
47
Meri Magdalin na Meri nne Jisọs guzo nꞌebe ahụ na-ele anya, hụ ebe e bubara ozu Jisọs.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16