bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 16
Mark 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
1
Nꞌoge anyasị ụbọchị nke ọzọ ya, Meri Magdalin, Meri nne Jemes na Salomi gara zụta ụda dị iche iche ha ga-eji tee ahụ Jisọs mmanụ.
2
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị Sọnde, mgbe anyanwụ wara, ụmụ nwanyị ndị a buuru ihe ahụ ha zụrụ bido ịga nꞌili ahụ.
3
Mgbe ha nọ nꞌụzọ, ha juru onwe ha ajụjụ sị, “Onye ga-enugharịrị anyị nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ?”
4
Ma mgbe ha bịarutere lelie anya elu, ha hụrụ na e nugharịala nkume ukwu ahụ.
5
Ha banyere nꞌime ili ahụ. Nꞌime ya ha hụrụ nwokorọbịa yi uwe ọcha ka ọ nọdụrụ ala nꞌakụkụ aka nri ili ahụ. Ụjọ tụrụ ụmụ nwanyị a!
6
Ma nwokorọbịa ahụ gwara ha sị, “Unu atụla ụjọ, amaara m na ọ bụ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nꞌobe ka unu na-achọ. Ọ nọkwaghị nꞌebe a, o sitela nꞌọnwụ bilie! Lee ebe e nyibere ya na mbụ.
7
Ugbu a laghachinụ kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya, ha na Pita. Gwa ha na Jisọs eburula ha ụzọ gaa Galili izute ha. Unu ga-ahụ ya nꞌebe ahụ dị ka ọ gwara unu tupuu ọ nwụọ.”
8
Ụmụ nwanyị ahụ gbapụtara site nꞌili ahụ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọ bụla ihe ọ bụla, nꞌihi na ụjọ jupụtara ha obi.
9
Nꞌụbọchị mbụ nꞌizu ụka, mgbe Jisọs si nꞌọnwụ bilie, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, nwanyị ahụ o sitere nꞌahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.
10
Meri lara gaa chọpụta ndị na-eso ụzọ Jisọs ka ha nọ nꞌọnọdụ iru uju na ịkwa akwa, gwa ha na Jisọs esitela nꞌọnwụ bilie.
11
Mgbe ha nụrụ ihe Meri kwuru, ha ekwenyeghị na ọ bụ eziokwu.
12
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs mere ka mmadụ abụọ nꞌime ha hụ ya anya, mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga otu obodo nta. Ma Jisọs gosiri ha onwe ya dị ka onye ọbia.
13
Mgbe mmadụ abụọ a chọpụtara na ọ bụ Jisọs ka ha hụrụ, ha gbaghachiri Jerusalem gaa kọọrọ ndị ọzọ, ma ha ekwenyeghị.
14
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ha, mgbe ha nile nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nꞌihi enweghị okwukwe ha, na nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌihe Meri na ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha banyere mbilite nꞌọnwụ ya.
15
Emesịakwa, ọ gwara ha sị, “Gaanụ nꞌime ụwa nile kwusaa ozi ọma nye onye ọ bụla nꞌebe ọ bụla.
16
Ndị kweere na ndị e mere baptizim ka a ga-azọpụta. Ma ndị jụrụ ikwere ka ọmụma ikpe dịrị.
17
“Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche.
18
Aka ha ka ha ga-eji tụtụlie agwọ, ma ọ gaghị ata ha. Ọ bụrụ na ha aṅụọ nsi, ọ gaghị egbu ha. Ha ga-ebikwasị ndị ọrịa aka nꞌahụ, mee ka ahụ dị ha mma.”
19
Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nꞌeluigwe, ebe ọ nọdụrụ nꞌakụkụ aka nri Chineke.
20
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ kwusaa ozi ọma nꞌebe nile. Onyenwe anyị nọnyekwaara ha. O gosiri na okwu ha bụ eziokwu site nꞌinye ha ike ịrụ ọrụ ebube nke ya na nkwusa ozi ọma ahụ so.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16