bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 3
Mark 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 4 →
1
Ọzọ kwa, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌime ya ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
2
Ụfọdọ mmadụ nọ na-ele ya anya ịhụ ihe ọ ga-eme. Ha chọrọ ịmata ma Jisọs ọ ga-agwọ nwoke a nꞌụbọchị izuike. Ha na-echekwa ibo ya ebubo mmebi iwu maka edebeghị ụbọchị izuike nsọ.
3
Ma Jisọs gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Bilie, bịa guzo nꞌetiti ụlọ ekpere a.”
4
Mgbe nwoke ahụ pụtara guzo ebe Jisọs ziri ya, Jisọs tụgharịrị jụọ ndị mmadụ ajụjụ sị, “Olee ihe unu chere bụ ihe dị mma? Ọ̀ bụ inyere mmadụ aka nꞌụbọchị izuike ka ọ bụ imerụ mmadụ ahụ? Ọ̀ bụ ịzọpụta mmadụ ka ọ bụ igbu ya?” O nweghị onye kwuru okwu nꞌetiti ndị ahụ nile.
5
Jisọs lere ha anya nꞌiwe. Enweghị ọmiko ha were ya iwe nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Setipụ aka gị!” Nꞌotu mgbe ahụ nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Mgbe ọ na-eme nke a aka ya dizikwara nke ọma.
6
Ngwangwa, ndị Farisii nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ sitere nꞌebe ahụ pụọ nꞌiwe. Ha gara soro ndị otu Herọd gbaa izu otu ha ga-esi gbuo Jisọs.
7
Ma Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌebe ahụ pụọ gaa nọdụ nꞌakụkụ osimiri. Ọtụtụ mmadụ sooro ya, ndị sitere Galili, na Judia,
8
na Jerusalem, na Idumia, na ofe Jọdan. Na ndị sitere nꞌakụkụ Taịa na Saịdọn. Ọtụtụ ndị a bịakwutere Jisọs nꞌihi na ha anụla akụkọ ọrụ ebube nile ọ na-arụ.
9
Nꞌihi ịdị ukwuu nke igwe mmadụ ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha doo ụgbọ mmiri nso. Ọ ga-abanye nꞌụgbọ mmiri ma ọ bụrụ na ọ raa ya ahụ iguzokwa nꞌelu ala, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-enute nꞌebe ọ nọ.
10
Ọ gwọọla ọtụtụ ndị ọrịa. Nꞌihi ya ọtụtụ ndị nwere ọrịa na-agbalịkwa ịbịarute ya nso ịmetụ ya aka.
11
Mgbe ọ bụla kwa ndị mmụọ ọjọọ na-achị hụrụ Jisọs ha na-ada nꞌala nꞌihu ya na-eti mkpu akwa na-asị, “Ị bụ Okpara Chineke!”
12
Ma Jisọs na-abara ha mba, nyekwa ha iwu ka ha hapụ ịkọwa onye ọ bụ.
13
Emesịa, Jisọs rigooro nꞌelu ugwu. Nꞌebe ahụ ọ kpọrọ nye onwe ya ụfọdụ nꞌime igwe mmadụ ahụ, ndị ọ chọrọ. Ha bịakwutekwara ya.
14
Ọ họpụtara mmadụ iri na abụọ. Ndị a bụ ndị ya na ha ga-anọ. Ndị ọ ga-ezipụ ikwusa ozi ọma ahụ.
15
Ndị a ka ọ ga-enyekwa ike ịgwọ ọrịa, na ịchụpụ mmụọ ọjọọ.
16
Ndị a bụ aha mmadụ iri na abụọ ọ họpụtara: Saịmọn, onye Jisọs nyere aha ọzọ, nke bụ Pita.
17
Jemes na Jọn ụmụ Zebedi. Jisọs nyere ha aha ọzọ, nke bụ, Ụmụ egbe eluigwe.
18
Anduru na Filip, Batolomiu na Matiu, Tọmọs na Jemes nwa Alfiọs. Tadịọs na Saịmọn. Saịmọn a bụ onye so nꞌotu ndị Juu chọrọ iji ike kwatuo ọchịchị ndị Rom.
19
Na Judas Iskarịọt nwoke ahụ mesịrị rara Jisọs nye nꞌaka ndị gburu ya.
20
Mgbe nke a gasịrị, Jisọs laghachiri nꞌụlọ ahụ o bi. Ọ dịghị anya ndị mmadụ bidoro na-abịakwutekwa ya. Ndị mmadụ dị nnọọ ukwuu mee ka Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụ inwe ohere iri ihe.
21
Mgbe ndị ikwu Jisọs nụrụ nke a, ha bịara gbalịa idulata ya nꞌụlọ ha. Ha sịrị, “Isi adịghị ya mma.”
22
Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “O bu ekwensu nꞌisi. Ọ bụkwa ekwensu a na-enye ya ike o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”
23
Ma Jisọs kpọrọ ndị kwuru okwu a ka ha bịakwute ya. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu nꞌilu, nꞌụzọ ha ghọtara, jụọ ha ajụjụ sị, “Ekwensu ọ̀ ga-esi aṅaa chụpụ ekwensu?
24
Alaeze nke ọgba aghara dị nꞌime ya enweghị ike iguzo.
25
Otu a kwa, ezinụlọ nke ịlụ ọgụ dị nꞌime ya enweghị ike iguzo.
26
Ọ bụrụkwa na ịlụ ọgụ adịrị nꞌezinụlọ ekwensu, ekwensu ọ̀ pụrụ ịrụpụta ihe ọ bụla?
27
Mmadụ ọ bụla adịghị nke nwere ike ịbanye nꞌụlọ nwoke dị ike kwakọrọ ngwongwo o ji biri, ma o nwere ike ime nke a ma o buru ụzọ mee otu ihe. O buru ụzọ kee nwoke ahụ dị ike eriri, o nwere ike banye bukọrọ ngwongwo dị nꞌụlọ ya.
28
“Ana m agwasị unu okwu a ike na-asị na mmehie ọ bụla adịghị nke mmadụ mere megide Chineke nke mgbaghara na-adịghị. Ọ dịkwaghị ụdị nkwulu ọ bụla Chineke na-agaghị agbaghara.
29
Ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara. A gaghị agbaghara ya mmehie nkwulu a nꞌụwa a ma ọ bụ nꞌụwa ọzọ.”
30
Jisọs kwuru nke a nꞌihi na ndị ozizi iwu sịrị na ọrụ ebube nile ọ na-arụ bụ site nꞌike ekwensu bi nime ya.
31
Mgbe ahụ nne Jisọs na ụmụnne ya bịara nꞌebe ọ nọ na-ezi ihe, guzoro nꞌezi. Ha ziri ozi ka a kpọọ ya.
32
Ndị mmadụ gbara ya gburugburu mgbe ozi ahụ bịara sịrị ya, “Lee, nne gị na ụmụnne gị guzo nꞌezi. Ha chọrọ ịhụ gị.”
33
Ma Jisọs zara sị ha, “Onye bụ nne m? Ndị ole bụkwa ụmụnne m?”
34
O lere anya nꞌihu ndị nọ ya gburugburu sị, Ndị a bụ nne m na umunne m.
35
“Onye ọ bụla na-eme uche Chineke bụ nwanne m nwoke na nwanne m nwanyị, na nne m.”
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16