bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 14
Mark 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 15 →
1
Abalị abụọ tupu e mee mmemme ngabiga, nke bụ oge ndị Juu na-eri beredi a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee, ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi jide Jisọs ka ha gbuo ya.
2
Ma ha gwarịtara onwe ha sị, “Anyị agaghị eme nke a nꞌoge mmemme a, ka ọgba aghara hapụ ịdị.”
3
Nꞌoge ahụ Jisọs nọ na Betani nꞌụlọ Saịmọn onye ekpenta. Nꞌoge ha na-eri nri anyasị, otu nwanyị batara nꞌime ụlọ ahụ. O bu karama mmanụ otite dị oke ọnụ ahịa. Ọ kụwara karama mmanụ ahụ, wụọ Jisọs mmanụ ahụ nile nꞌisi.
4
Ụfọdụ ndị nọ nꞌebe ahụ were iwe nke ukwuu. Ha sịrịtara onwe ha, “A ga-akpọ nke a gịnị? Nke a bụ nnọọ oke mmebi!
5
A gaara ere mmanụ a ihe karịrị nari naịra atọ, were ego e retara nye ndị ogbenye.” Ha tamuru ntamu megide ya.
6
Ma Jisọs sịrị ha, “Hapụnụ nwanyị a aka. Unu enyela ya nsogbu. Ọ bụ ezi ọrụ ka ọ rụụrụ m.
7
Unu na ndị ogbenye na-anọ oge nile. Unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọ bụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.
8
“Nwanyị a na-agbalị ime ihe o nwere ike, ọ na-ete m mmanụ a ugbu a iji kwadoo ahụ m maka olili a ga-eli ya.
9
Ana m agwa unu eziokwu na ebe ọ bụla e kwusara ozi ọma a nꞌụwa nile, ọrụ a nwanyị a rụrụ ka a ga-akọkwa akụkọ ya, iji cheta ihe o mere.”
10
Mgbe ahụ Judas Iskarịọt, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya jekwuuru ndị isi nchụaja ịgba izu otu ọ ga-esi rara Jisọs nye ha nꞌaka.
11
Mgbe ndị isi nchụaja nụrụ okwu o ji bịa ha ṅụrịrị ọṅụ kwe ya nkwa inye ya ego. Site nꞌụbọchị ahụ Judas bidoro ịchọgharị ụzọ ọ ga-esi rara Jisọs nye.
12
Nꞌụbọchị mbụ nke mmemme ngabiga, mgbe ndị Juu na-egbu atụrụ ha ji achụ aja ngabiga ahụ, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa doziere gị ihe, maka iri ori ngabiga?”
13
Jisọs ziri mmadụ abụọ nꞌime ndị na-eso ụzọ ya ozi sị ha, “Gaanụ nꞌime obodo. Mgbe unu na-aga nꞌụzọ unu ga-ezute otu nwoke bu ite mmiri. Soronụ ya gaa ebe ọ bụla ọ na-aga.
14
Mgbe unu rutere nꞌụlọ ebe ọ banyere, gwanụ onyenwe ụlọ ahụ sị, Onye ozizi anyị sị ka anyị jụọ gị ebe ị kwadoro ka ya na ndị na-eso ụzọ ya nọdụ rikọọ oriri ngabiga anyasị.
15
Nwoke ahụ ga-egosi unu otu ọnụ ụlọ buru ibu nꞌelu ụlọ ahụ, ebe e dozichara ihe nile. Kwadoonụ nri anyị nꞌebe ahụ.”
16
Ndị na-eso ụzọ ya abụọ ahụ hapụrụ ebe ahụ baa nꞌime obodo. Ha hụrụ nwoke ahụ dị ka Jisọs gwara ha. Mgbe ha ruru nꞌụlọ ahụ ha bidokwara ịkwado nri anyasị ahụ.
17
Nꞌanyasị, Jisọs bịarutere nꞌụlọ ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya.
18
Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs gwara ha sị, “Eziokwu ka m na-agwa unu, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye. Ee, otu onye so m ugbu a na-eri nri!”
19
Okwu a Jisọs kwuru mere ka obi jọọ ndị na-eso ụzọ ya njọ. Ha bidoro ịjụ ya nꞌotu nꞌotu sị, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”
20
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ otu onye nꞌime unu iri na abụọ. Otu onye mụ na ya na-amanyekọta aka nꞌime otu efere nri a.
21
Leenụ! mụ bụ Nwa nke mmadụ na-aga ịnwụ dị ka ndị amụma si kwuo ya nꞌoge gara aga. Ma lee ụdị ahụhụ na-eche nwoke ahụ e sitere nꞌaka ya rara m nye! Nꞌezie, ọ gaara adịrị ya mma ma a sị na a mụghị ya!”
22
Mgbe ha nọ na-eri nri, Jisọs weere otu ogbe beredi kelee Chineke ekele nꞌihi ya, nyawaa ya. O nyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Werenụ beredi a taa, nꞌihi na ọ nọchiri anya anụ ahụ m.”
23
Emesịa, o buuru iko mmanya nye Chineke eleke nꞌihi ya, bunyekwa ndị na-eso ụzọ ya. Ha nile sitere nꞌiko ahụ ṅụọ mmanya.
24
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Mmanya a unu ṅụrụ nọchiri anya ọbara a na-awụsị nꞌihi ọtụtụ mmadụ. Ọbara a na-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ dị nꞌetiti Chineke na mmadụ guzosie ike.
25
Eziokwu ka m na-agwa unu na agaghị aṅụkwa mmanya a ọzọ tutuu ruo mgbe m ga-aṅụ mmanya ọzọ karịrị ya mma nꞌalaeze Chineke.”
26
Emesịa, ha bụrụ abụ, site nꞌebe ahụ pụọ, gaa nꞌugwu olivu.
27
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Na mgbe na-adịghị anya ugbu a, unu nile ga-ahapụ m gbalaa, nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnụ ndị amụma kwuo sị, ‘Aga m egbu onye ọzụzụ atụrụ, mee ka igwe atụrụ ya gbasasịa.’
28
Ma mgbe m si nꞌọnwụ bilie, aga m aga Galili izute unu nꞌebe ahụ.”
29
Pita gwara ya sị, “A sịkwa na ndị ọzọ a nile ahapụ gị gbalaa, ọ dịghị mgbe m ga-ahapụ gị gbalaa!”
30
Jisọs sịrị Pita, “Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na taa, ọ bụghị echi, tupu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.”
31
Pita kwusiri ike sị, “Ọ dịghị! Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ndị ọzọ bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs kwukwara otu okwu ahụ.
32
Emesịa, ha gara ije rute ebe a na-akpọ Getsemanị. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nọdụnụ nꞌebe a ka m gaa nꞌihu nke nta ikpe ekpere.”
33
Ọ gwara Pita na Jemes, na Jọn ka ha soro ya. Mgbe o bidoro ịga nꞌihu o bidokwara inwe obi ọjọọ na obi ịlọ mmiri nke ukwuu.
34
Ọ gwara mmadụ atọ ahụ sị, “Obi m na-achọ itiwa ruo nꞌọnwụ nꞌihi ihe mgbu dị nꞌime ya. Nọdụnụ nꞌebe a soro m chee nche.”
35
Ọ hapụrụ ha gaa nꞌihu nke nta, daa nꞌala. O kpere ekpere rịọ ma ọ ga-ekwe mee ka ihe ọjọọ na-akwado ịdakwasị ya gabiga, hapụ ịbịakwasị ya.
36
O kpere ekpere sị, “Nna, o nweghị ihe nyịrị gị ime. Ekwela ka ihe ọjọọ a bịakwasị m. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mezuo, kama ka uche gị mezuo.”
37
Emesịa, ọ lọghachiri azụ nꞌebe mmadụ atọ ahụ nọ, chọpụta na ha nọ nꞌụra. Ọ kpọrọ Pita sị ya, “Pita, ọ̀ bụ ụra ka ị na-arahụ? Ọ̀ bụ na i nweghị ike soro m chee nche otu awa?
38
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa. Ọ na-agụ mmụọ m agụụ ime ihe Chineke chọrọ, ma anụ ahụ adịghị ike.”
39
Ọ hapụkwara ha ọzọ gaakwa nꞌihu, kpeekwa otu ụdị ekpere ahụ.
40
Mgbe ọ lọghachiri azụ ọ hụrụ na ha na-arahụ ụra, nꞌihi na ike gwụrụ ha. Ha amakwaghị ihe ha ga-agwa ya.
41
Ọ hapụkwara ha gaa kpeekwa ekpere ọzọ. Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ gwara ha sị, “Ùnu nọrịrị na-arahụ ụra ma na-ezukwa ike? O zuola! Bilienụ! Oge ịrahụ ụra agafeela! Lee! A rarala mụ bụ Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ.
42
Bilienụ! Bịanụ ka anyị pụọ! Lee! Onye ahụ raara m nye na-abịa!”
43
Mgbe ọ kpụ okwu a nꞌọnụ, lee Judas, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya bịara. Ya na igwe mmadụ so. Ụfọdụ nꞌime ha ji mma, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị Juu zitere ha ijide Jisọs.
44
Tupuu ha abịaruo ebe Jisọs nọ Judas gwara ha sị, “Onye unu ga-ejide bụ onye ahụ m ga-ekele. Kpụrụnụ ya pụọ!”
45
Ya mere, Judas bịakwutere Jisọs nꞌotu oge ahụ sị ya, “Onye ozizi!” Ọ bakụrụ ya.
46
Nꞌotu oge ahụ, igwe mmadụ ahụ jiri aka ike jide Jisọs.
47
Ma otu onye nꞌime ndị nọ nꞌebe ahụ mịpụtara mma ya gbupụ ntị otu onye na-ejere onyeisi nchụaja ozi.
48
Jisọs jụrụ ndị ahụ jidere ya ajụjụ sị, “Abụ m onye na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike unu jiri buru mma na osisi pụta ijide m?
49
Ụbọchị nile ka mụ na unu nọ mgbe m na-ezi ihe nꞌụlọ nso ukwu Chineke, ma unu ejideghị m. Ma ihe ndị a na-eme ugbu a ime ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru na ha ga-eme mezuo.”
50
Nꞌoge a ndị na-eso ụzọ ya nile ahapụla ya gbalaa.
51
Ma ọ dị otu nwokorọbịa soro ha. Ọ ma akwa. Mgbe ndị ahụ chọrọ ijide ya
52
ọ gbara ọsọ. Ma akwa ya dapụrụ, ya agbara ọtọ ihu na azụ gbalaa.
53
Ndị jidere Jisọs duuru ya gaa nꞌụlọ onyeisi nchụaja ebe ndị isi nchụaja nile na ndị okenye na ndị ozizi iwu zukọrọ.
54
Pita sooro ha, ma ọ nọ ebe dị anya. O sooro ha bata nꞌezi onyeisi nchụaja. Nꞌezi ahụ, o sooro ndị nche nọdụ ọdụ na-anya ọkụ.
55
Ndị isi nchụaja na ndị isi ikpe ụlọ ikpe ukwu ndị Juu zukọrọ na-agbalị ịchọpụta ebubo ha ga-ebo Jisọs, ka ha site na ya gbuo ya. Ma o nweghị ihe ha chọpụtara.
56
Ọtụtụ mmadụ bịara gbaa ama ụgha, ma o nweghị onye ama nke ya na nke ibe ya dakọtara.
57
Nꞌikpeazụ, ụfọdụ mmadụ biliri boo ya ebubo ụgha a,
58
ha sịrị, “Anyị nụrụ mgbe nwoke a kwuru sị, ‘Aga m ala ụlọ nsọ ukwu a mmadụ wuru nꞌiyi, ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị aga m ewukwa ụlọ nsọ ọzọ, nke a na-ejighị aka mmadụ wuo.’ ”
59
Otu ọ dị, ama ha adakọtakwaghị.
60
Mgbe ahụ, onyeisi nchụaja biliri ọtọ nꞌihu ha jụọ Jisọs ajụjụ sị, “Ị̀ chọghị ikwu okwu? Gịnị ka i nwere ikwu banyere ebubo ndị a e boro gị?”
61
Ma Jisọs ekwughị okwu ọ bụla. Ọzọ kwa, onyeisi nchụaja jụrụ Jisọs sị, “Ị̀ bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke bụ Onye a gọziri agọzi?”
62
Jisọs zara sị ya, “Ee, abụ m ya. Ọ bụkwa eziokwu ka m na-agwa unu mgbe m na-asị, na unu ga-ahụ m, bụ Nwa nke mmadụ, ka m sooro Chineke nọdụ nꞌaka nri ocheeze ya nꞌeluigwe. Unu ga-ahụkwa m ka m na-abịaghachi nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.”
63
Mgbe onyeisi nchụaja nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ọ dọwara uwe ya nꞌiwe, tie mkpu sị, “Gịnị ọzọ ka anyị na-achọ? Ọ bara uru ịchọkwa ndị ọzọ ga-agbagide ya ama?
64
Unu anụla okwu arụ si ya nꞌọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha nile tiri mkpu sị, “O kwesịrị ọnwụ!”
65
Mgbe ahụ ụfọdụ nꞌime ha bidoro ịgbụ ya ọnụ mmiri. Ndị ọzọ jiri akwa kechie anya ya, bido jiri aka ha na-eti ya ihe. Mgbe ha na-eti ya ihe, ha na-agwa ya sị, “Onye amụma, gwa anyị, ònye tiri gị ihe?” Ọ bụladị ndị nche nọ nꞌebe ahụ kpụpụtara ya nꞌezi na-eti ya ihe.
66
Mgbe Pita nọ nꞌezi nꞌakụkụ ọkụ, otu nꞌime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịara nso ebe ọ nọ.
67
Mgbe ọ hụrụ Pita ka ọ na-anya ọkụ, ọ bịara nso lezie ya anya nke ọma. Mgbe ahụ ọ gwara Pita sị, “Ị bụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs onye Nazaret.”
68
Ma Pita gọrọ agọ sị ya, “Amaghị m, aghọtaghị m ihe ị na-ekwu.” Mgbe Pita na-ekwu okwu, o ji azụ azụ pụọ gaa guzo nꞌakụkụ ụzọ e si abata nꞌezi ụlọ ahụ.
69
Mgbe nwagbọghọ ahụ hụrụ Pita ọzọ, o gosiri ya ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ sị ha, “Nwoke a bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs.”
70
Ma Pita gọkwara agọ nke ụgboro abụọ. Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo Pita nso sịrị ya, “Nꞌezie, ị bụ otu nꞌime ndị na-eso Jisọs, nꞌihi na ị bụ onye Galili.”
71
Mgbe ahụ Pita bidoro ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụrụ ndị ahụ iyi na-asị, “Nꞌezie, amaghị m onye nwoke a unu na-ekwu okwu ya bụ.”
72
Nꞌotu oge ahụ kwa, oke ọkụkọ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara ihe Jisọs gwara ya. Nꞌihi na Jisọs gwara ya sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị ugboro atọ.” Mgbe Pita tụlere okwu ndị a nꞌobi ya, o bidoro ịkwa akwa.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16