bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 4
Mark 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
1
Ọzọ kwa, Jisọs gara nꞌakụkụ osimiri Galili bido izi ihe. Ọtụtụ mmadụ gbakwara ya gburugburu. Nꞌihi nke a ọ banyere nꞌụgbọ mmiri ahụ.
2
O ziri ha ọtụtụ ihe. Ọ bụkwa ilu ka o ji zie ha ihe. Nke a bụ otu nꞌime ihe o ziri ha.
3
“Geenụ ntị! Otu nwoke gara nꞌubi ya ikụ ọka. Mgbe ọ na-agha mkpụrụ ọka ndị a, ụfọdụ dara nꞌakụkụ ụzọ. Ngwangwa ụmụ nnụnụ bịara tụrụ ha loo.
5
Ụfọdụ mkpụrụ ọka ahụ dara nꞌala dị nkume nkume, ebe aja ntakịrị dị. Ha puputara ọsịịsọ nꞌihi na ala dị nꞌebe ahụ emighị emi.
6
Ma mgbe anwụ wara, ọ chagburu ha mee anwụ wara, ọ chagburu ha mee ka ha kpọọ, nꞌihi na mgbọrọgwu ha emikpughị emikpu nꞌala.
7
Ụfọdụ nꞌime ọka ahụ dara nꞌala ebe ogwu ogwu dị. Mgbe ha pupụtara too, ogwu dị nꞌebe ahụ kpagburu ha. Ha amịkwaghị mkpụrụ.
8
“Ma ụfọdụ ọka ahụ dara nꞌezi ala, puo, too, mịakwa mkpụrụ. Ụfọdụ nꞌime ha mịrị iri mkpụrụ ọka atọ, ụfọdụ iri isii, ụfọdụ narị.”
9
Jisọs sịrị ha, “Onye ọ bụla nwere ntị ịnụ ihe ya nụrụ.”
10
Emesịa, mgbe nanị Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọ, ụfọdụ ndị nụrụ ozizi ya, ha na ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị ka mkpụrụ ahụ a ghara pụtara?”
11
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụ unu ka ọ dịrị ịmata ihe omimi nile nke alaeze Chineke, ma ndị ọzọ, ndị na-anọghị nꞌebe a ugbu a, bụ ndị ga-anụ ha nꞌilu.
12
Nꞌihi na Aịzaya buru amụma banyere ha sị, ‘Ha ga-ele anya lekwasị, ma ha agaghị ahụ ihe ọ bụla. Ha ga-ege ntị, gesiekwa ike, ma ha agaghị aghọta ihe ọ bụla. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha aghọta, ha agaghị echegharị bịakwute Chineke ka ọ gbaghara ha.’ ”
13
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ndị ahụ ya na ha nọ ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na o siiri unu ike ịghọta ilu ntakịrị a, unu ga-esikwanụ aṅaa ghọta okwu nile m na-aga ikwu nꞌoge dị nꞌihu?”
14
Jisọs kọwara ilu ahụ sị, “Ọgha mkpụrụ ahụ bụ onye ọ bụla na-ekwusa ozi ọma Chineke. Ozi ọma Chineke bụkwa ọka ahụ. Ọgha mkpụrụ na-agagharị na-agbalị ikwusara ndị mmadụ okwu Chineke.
15
Mkpụrụ ọka nke dara nꞌakụkụ ụzọ nọchiri anya obi ndị ahụ nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara wepụ okwu ahụ ha nụrụ nꞌobi ha ka ọ hapụ ịbara ha uru.
16
Obi ndị ọzọ dị ka ala nkume nkume ebe ụfọdụ mkpụrụ ọka ahụ danyere. Ndị a bụ ndị jiri ọṅụ nabata ozi ọma ahụ.
17
Ma okwu ahụ ha nụrụ adabanyeghị nke ọma nꞌala ala obi ha ọ dịghị anọgidekwa. Ya mere, mgbe nsogbu na mkpagbu bidoro nꞌihi ime ihe ahụ ha nụrụ na Chineke chọrọ ka ha mee, ha na-akwụsị.
18
“Obi ndị ọzọ dị ka ala ahụ ogwu dị, ebe ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ọka ahụ danyere. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ nabatakwa ya.
19
Ma echiche banyere ihe dị nꞌụwa a, ya na agụụ ịba ụba, na echiche ọjọọ dị iche iche, na-akpagbu okwu ha nụrụ. Ha adịghị amịkwa mkpụrụ.
20
“Obi ụfọdụ dị ka ala ọma ahụ. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ, nabata ya nꞌobi ha. Ha na-eji okwu ha nụrụ rụpụta ezi ọrụ. Ụfọdụ na-amị iri mkpụrụ atọ, ndị ọzọ iri mkpụrụ isii, ndị ọzọ narị mkpụrụ karịa nke a kụrụ.”
21
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ò ziri ezi ịmụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, ma ọ bụ nꞌokpụrụ ihe ndina? É, è! Nꞌihi na ebe e kwesịrị ịdọba iheọkụ bụ nꞌelu tebulu.
22
“Ihe ọ bụla zoro ezo ga-emesi pụta ìhè. Ihe ọ bụla e kpuchiri ekpuchi ka a ga-emesiakwa kpughee.
23
Onye ọ bụla nwere ntị ịnụ ihe ya nụrụ.”
24
Ọ gwakwara ha sị, “Kpacharanụ anya banyere ihe unu ji okwu unu na-anụ eme. Nꞌihi na ọ bụ ụzọ unu siri mesoo ndị mmadụ mmeso ka a ga-esi mesoo unu. Nꞌezie, mmeso Chineke ga-emeso unu ga-adị ukwuu karịa.
25
Onye nwere ihe ka a ga-enyekwa ihe ọzọ, ma nwoke ahụ na-enweghị ihe ka a ga-anapụ ọ bụladị ihe nke o nwere.”
26
Jisọs gara nꞌihu gwa ha sị, “Alaeze Chineke dị ka nwoke gara nꞌubi ya ghaa mkpụrụ.
27
Emesịa, ọ na-alaghachi nꞌụlọ ya chefuo ihe nile banyere mkpụrụ ahụ ọ ghara. Ma mgbe ụbọchị ole na ole gafere, mkpụrụ ahụ na-epuputa too, ma onye ọrụ ubi ahụ amaghị otu o si puo, ma ọ bụ otu o si too, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ ọ na-eme inyere mkpụrụ ọka ahụ aka ipu.
28
Ọ bụ ala ahụ na-eme ka mkpụrụ ahụ puo. Na mbụ ọ na-epupụta, emesịa, o too, ma nꞌikpeazụ, ọ na-amị mkpụrụ.
29
Mgbe ọka ahụ chara ịghọ ya, nwoke a na-eji mma ya bịa gbutuo ọka ahụ, ghọọkwa mkpụrụ ọka laa, nꞌihi na oge iwe ihe nꞌubi eruola.”
30
“Gịnị ọzọ ka anyị pụrụ ịsị na alaeze Chineke yiri? Ụdị ilu dị aṅaa ka anyị ga-eji kọwaa ya?
31
Anyị nwere ike ịsị na alaeze Chineke dị ka mkpụrụ mọsụtadị. Ọ bụ otu nꞌime mkpụrụ dịkarịsịrị nta nꞌụwa. Ma mgbe mmadụ weere ya kụọ,
32
ọ na-eto buo nnọọ ibu. Ọ na-enwe alaka dị ogologo. Ụmụ nnụnụ na-abịakwa wuo akwụ ha nꞌalaka ya.”
33
Jisọs jiri ọtụtụ ilu gwa ndị mmadụ ahụ okwu. Ọ gwara ha okwu ole na ole ha nwere ike ịnụ.
34
Oge nile ọ gwara ha okwu, o ji ilu kwuo okwu ahụ. Ma ya na ndị na-eso ụzọ ya nanị nọdụ, ọ na-akọwara ihe ihe nile.
35
Nꞌoge anyasị ụbọchị ahụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ka anyị banyenụ nꞌụgbọ mmiri gafee nꞌofe ọzọ nke osimiri a.”
36
Ndị na-eso ụzọ ya mere ihe o kwuru. Ha na Jisọs banyere nꞌụgbọ, hapụ igwe mmadụ ahụ. Ụfọdụ ụgbọ mmiri sokwara ha nꞌazụ.
37
Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga, oke ifufe dị ike bidoro ife. Ebili mmiri bidoro na-amagharị, mmiri bidokwara ịbanye nꞌime ụgbọ ha. Mmiri banyere nꞌụgbọ ha dị ukwuu ruo na ụgbọ ha chọrọ imikpu nꞌime mmiri.
38
Mgbe ihe ndị a nile na-eme, Jisọs nọrị nꞌime ụgbọ ahụ na-arahụ ụra. O jiri akwa a fụkọtara afụkọta hinye nꞌisi ya. Ndị na-eso ụzọ ya tụrụ oke egwu mgbe ihe ndị a na-eme, gbaara ọsọ tie mkpu kpọtee ya, na-asị, “Nna anyị ukwu! Ọ dịghị emetụ gị nꞌobi na anyị nile ga-anwụ ma ụgbọ anyị mikpuo?”
39
Jisọs biliri ọtọ, baara ifufe ahụ mba sị, “Dere jii!” Ngwangwa, ifufe ahụ kwụsịrị ifegharị, ebe nile dekwaara jii.
40
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Ebee ka okwukwe unu gara?”
41
Ha nile tụrụ egwu, jụrịtaa onwe ha sị, “Onye ka nwoke a bụ? Nwoke a ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu?”
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16