bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 9
Mark 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
1
Emesịa, Jisọs gwara ha sị, “Eziokwu ka m na-agwa unu, mgbe m na-asị, na e nwere ụfọdụ nꞌime ndị guzo nꞌebe a, ugbu a, ndị na-agaghị anwụ, tutuu ha ahụ ka alaeze Chineke ji ike bịa.”
2
Mgbe abalị isii gasịrị, Jisọs kpọọrọ Pita, na Jemes na Jọn, duru ha rigoro nꞌelu ugwu. Nꞌebe ahụ ka ha nọdụrụ nanị ha. Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ, ha hụrụ Jisọs ka ọdịdị ya gbanwere nꞌihu anya ha.
3
Uwe ya nwupụkwara ọcha karịa uwe ọcha ọ bụla nke anya hụrụla.
4
Na mberede, ha hụrụ Ịlaịja na Mosisi ka ha pụtara soro Jisọs na-ekwu okwu. Mgbe ahụ Pita tiri mkpu sị, “Onye ozizi, ọ dị mma ka anyị nọdụ nꞌebe a ka anyị wuo ọnụ ụlọ nta atọ. Otu ga-abụ nke gị, otu nke Mosisi, nke ọzọ kwa nke Ịlaịja.”
6
Pita amakwaghịnụ ihe ọ na-ekwu, nꞌihi na oke egwu tụrụ ha atọ.
7
Ma mgbe Pita kpụ okwu ya nꞌọnụ, igwe ojii kpuchigidere ha nile. Site nꞌime igwe ojii ahụ, ha nụrụ olu kwuru okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya! Geenụ ntị nꞌokwu ya.”
8
Na mberede, mmadụ atọ ahụ lere anya gburugburu ha, ma ọ dịkwaghị onye ọzọ ha hụrụ, karịa Jisọs.
9
Mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs gwara ha sị, “Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ihe banyere ihe a anya unu hụrụ taa, tutuu ruo mgbe m sitere nꞌọnwụ bilie.”
10
Mmadụ atọ ahụ, Pita, na Jemes na Jọn agwaghị onye ọ bụla ihe ha hụrụ. Ma ha kwurịtara okwu nꞌetiti onwe ha itule ihe Jisọs bu nꞌuche mgbe ọ sị na ọ ga-esi nꞌọnwụ bilie.
11
Mgbe ahụ ha jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere ndị ozizi iwu jiri sị na Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa?”
12
Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie, Ịlaịja kwesịrị ibu ụzọ bịa idozi ihe nile. Ma nꞌuche unu, gịnị mere ndị amụma jiri dee na Nwa nke mmadụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?
13
Ka m gwa unu eziokwu, Ịlaịja abịalarị. Ma ndị mmadụ mesokwara ya mmeso dị ka ndị amụma kwuru na ha ga-emeso ya.”
14
Mgbe ha bịaruru nꞌebe ndị na-eso ụzọ Jisọs toolu ahụ nọ, ha hụrụ igwe mmadụ dị ukwuu ka ha gbara ha gburugburu. Nꞌetiti igwe mmadụ ahụ, ha hụrụ ndị ozizi iwu ka ha na ndị ozi ahụ nọ na-arụrịta ụka.
15
Mgbe igwe mmadụ ahụ hụrụ Jisọs, ọdịdị ya juru ha anya. Ha gbaara ọsọ gaa kelee ya.
16
Jisọs juru ndị ozizi iwu ahụ ajụjụ sị, “Gịnị ka unu na ndị na-eso ụzọ m na-ekwu?”
17
Otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi, akpọtaara m gị nwa m nwoke a ka ị gwọọ ya. Mmụọ ọjọọ na-esogbu ya. O mekwara ka ọ daa ogbi.
18
Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nꞌala. Mgbe ahụ ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ ya, na-ata ikikiri eze. Anụ ahụ ya na-adị sisiriri dị ka onye nwụrụ anwụ. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”
19
Jisọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Lee ka okwukwe unu si dị nta! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupuu unu ekwere? Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-edi ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwanta nwoke ahụ!”
20
Ha kpọtaara ya nwanta ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ Jisọs, o nugharịrị nwanta ahụ nke ukwuu. Nwanta ahụ dara nꞌala na-atụrụ onwe ya nꞌala, na-agbọkwa ụfụfụ nꞌọnụ ya.
21
Jisọs jụrụ nna nwanta ahụ, “Olee mgbe ihe a bidoro?” Nna ya zara sị, “Site na mgbe ọ bụ nwanta nta.
22
Mmụọ ọjọọ a na-eme ya ka ọ daba nꞌọkụ, ma ọ bụ na mmiri, ime ka ọ nwụọ. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”
23
Jisọs jụrụ nna nwanta ahụ sị, “Gịnị mere i ji na-asị Ọ̀ bụrụ na i nwere ike? Ọ dịghị ihe onye ọ bụla nwere okwukwe na-agaghị enweta.”
24
Nna nwanta ahụ zara sị, “Ekweere m, biko mee ka m nwee okwukwe karịa.”
25
Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agba ọsọ na-abịa nꞌebe ọ nọ, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nꞌime nwanta a pụta! Abanyekwala nꞌime ya ọzọ!”
26
Mmụọ ọjọọ ahụ tiri mkpu akwa, nugharịa nwanta ahụ ọzọ, site nꞌime ya pụta. Nwanta ahụ dara tọgbọrọ nꞌala dị ka onye nwụrụ anwụ. Ndị nile nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”
27
Ma Jisọs jidere ya nꞌaka selite ya elu, mee ka o guzo nꞌụkwụ ya. Nwanta ahụ guzokwara.
28
Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nꞌebe ahụ pụọ. Mgbe ha batara nꞌụlọ ebe ha na-anọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị ya, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”
29
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị site nꞌike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị mmụọ ọjọọ ahụ.”
30
Ha siri nꞌebe ahụ pụọ gafee Galili. Jisọs achọghị ka onye ọ bụla mata ebe ha nọ,
31
nꞌihi na o ji oge ahụ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, ha ga-egbukwa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie.”
32
Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Ha tụkwara egwu ịgwa ya ka ọ kọwaa ihe ọ na-ekwu.
33
Emesịa, ha ruru Kapanọm. Mgbe ha banyere nꞌụlọ, Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu na-arụrịta ụka banyere ya mgbe anyị nọ nꞌụzọ?”
34
Ọ dịghị onye ọ bụla nꞌetiti ha kwuru ihe ọ bụla. Nꞌihi na mgbe ha nọ nꞌụzọ, ha na-arụrịta ụka banyere onye ka ibe ya ukwuu nꞌime ha.
35
Jisọs nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ka ha bịa nọdụ ya gburugburu. Mgbe ha nọdụsịrị ala, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ ịbụ onye ka ibe ya ukwuu, onye ahụ ga-eburu ụzọ bụrụ onye dịkarịsịrị nta, na onye na-ejere ibe ya ozi.”
36
Mgbe ahụ o kuuru otu nwantakịrị mee ka o guzo nꞌetiti ha. O kuuru nwanta ahụ nꞌaka ya sị ha,
37
“Onye ọ bụla nabatara otu nꞌime ụmụntakịrị ndị a nꞌaha m, na-anabata m. Ma onye ọ bụla nabatara m, ọ bụghị m ka ọ nabatara, kama ọ na-anabata Chineke onye zitere m.”
38
Jọn, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya gwara Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ ma anyị kwụsịrị ya, nꞌihi na ọ bụghị otu nꞌime ndị na-eso anyị.”
39
Ma Jisọs zara sị ya, “Ị garaghị akwụsị ya. Nꞌihi na onye ọ bụla ji aha m na-arụ ọrụ ịrịba ama agaghị ekwu okwu ọjọọ megide m.
40
Nꞌihi na onye ọ bụla na-adịghị emegide m, dịnyeere m.
41
Eziokwu ka m na-agwa unu, onye ọ bụla ga-ekunye unu otu iko mmiri nꞌaha m, nꞌihi na unu bụ ndị nke m, ga-anatakwa ụgwọ ọru ya.
42
“Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emee ka otu nꞌime ndị a dị nta kweere na m, mehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume buru ibu nꞌolu ya, tụnye ya nꞌime osimiri, ebe mmiri ga-eri ya.
43
“Ọ bụrụ na aka gị emee ka i mehie, gbupụ ya. Ọ dịrị gị mma iji otu aka dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, karịa na ị ga-eji aka abụọ banye nꞌọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ na-adịghị anyụ anyụ.
45
“Ọ bụrụ na ụkwụ gị emee ka i mehie gbupụ ya tụfuo, nꞌihi na ọ kara gị mma ịbụ onye ụkwụ rụrụ karịa na ị ga-abụ onye nwezuru ụkwụ ya abụọ e tinyekọtaa gị na ha nꞌọkụ ala mmụọ.
47
“Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka i mehie, ghụpụ ya tụfuo ya. Ọ dịrị gị mma na i ji otu anya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nꞌalaeze Chineke, karịa na i ga-enwe anya abụọ a tụba gị nꞌọkụ ala mmụọ, ebe a na-adịghị emenyụ ọkụ ahụ emenyụ.
49
Ebe a ga-eji ọkụ nụọ onye ọ bụla dị ka ite.
50
“Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnụ etufuo ụtọ ya, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ dị ụtọ ọzọ? Ya mere, unu etufula ụtọ unu. Unu na ibe unu biri nꞌudo.”
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16