bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 5
Mark 5
Igbo 1988
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 6 →
1
Emesịa, ha jeruru ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ebe ha kwụsịrị bụ nꞌobodo Gerazin.
2
Otu mgbe ahụ ha si nꞌime ụgbọ ha wụdata, onye buru ụzọ zute ha bụ nwoke mmụọ ọjọọ na-achị. O sitere nꞌebe a na-eli ozu pụta.
3
Nꞌihi na ogige ili ahụ bụ ebe o ji mere ebe obibi ya. Ọ bụkwa nwoke dị ike. Mmadụ ọ bụla enweghị ike iji, ọ bụladi eriri igwe kee ya agbụ.
4
Nꞌihi na mgbe ọ bụla e kere ụkwụ na aka ya, ọ na-adọbisi eriri e ji kee ya. Ọ na-akpakwa ike nke ukwuu.
5
Oge nile, ehihie na abalị, ọ na-agagharị nꞌogige ili ahụ, na nꞌugwu dị gburugburu ebe ahụ, na-eti mkpu, na-eji nkume dị nkọ na-egbukasị onwe ya ahụ.
6
Mgbe Jisọs nọ nꞌebe dị anya, nwoke ahụ hụrụ ya gbara ọsọ bịa daa nꞌụkwụ ya,
7
na-eti mkpu na-asị, “Gịnị ka ị chọrọ iji m mee, Jisọs, Ọkpara Chineke dị elu? Eji m aha Chineke na-arịọ gị, biko atala m ahụhụ dị ukwuu.”
8
Mmụọ ọjọọ ahụ siri otu a kwuo okwu nꞌihi na Jisọs nyere ya iwu ka o site nꞌime nwoke ahụ pụta.
9
Jisọs jụrụ mmụọ ọjọọ ahụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zara sị, “Aha m bụ igwe, nꞌihi na anyị dị ọtụtụ.”
10
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọsiri Jisọs arịrịọ ike ka ọ hapụ iziga ha nꞌebe dị anya.
11
Igwe ezi nọ nso nꞌebe ahụ na-akpa nri, na ndịda ugwu dị nꞌebe ahụ.
12
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs sị, “Biko, ziga anyị nꞌime igwe ezi a.”
13
Jisọs kwenyere ka ha banye nꞌime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị a bara nꞌime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ nile ọnụ ọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nꞌime osimiri, ebe mmiri riri ha nile.
14
Ndị nọ na-elekọta igwe ezi ahụ gbaara ọsọ laa nꞌime obodo, kọsaa akụkọ ihe Jisọs mere nꞌobodo nile dị ebe ahụ gburugburu. Nꞌihi nke a ọtụtụ mmadụ pụtara ilere ihe mere.
15
Mgbe ha pụtara, ha hụrụ Jisọs. Ha hụkwara nwoke ahụ Jisọs sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. O yi uwe, nọdụ ala dị ka onye isi zuru oke.
16
Ndị ahụ nọ mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ kọọrọ mmadụ nile ihe mere nwoke ahụ. Ha kọkwaara ha akụkọ banyere mmụọ ọjọọ ndị ahụ a chụpụrụ, na ihe mere igwe ezi ndị ahụ.
17
Nꞌihi ya, ndị mmadụ ahụ bidoro ịrịọ Jisọs ka ọ pụọra ha nꞌala ha, gaa ebe ọzọ.
18
Nꞌihi ya, Jisọs banyekwara nꞌime ụgbọ mmiri. Ma nwoke ahụ Jisọs si nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ rịọrọ Jisọs ka o soro ha.
19
Ma Jisọs sịrị ya, “É, è, kama laghachikwuru ndị ezinụlọ gị na ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe ọma Chineke meere gị. Na otu Chineke siri meere gị ebere.”
20
Nwoke ahụ hapụrụ ha laa. O sitere nꞌobodo iri ahụ, bụ Dekapolis, na-akọ akụkọ ihe Jisọs meere ya. Ndị nile nụkwara okwu ya ka akụkọ ahụ juru anya nke ukwuu.
21
Mgbe Jisọs rukwara nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, igwe mmadụ zukọrọ gbaa ya gburugburu.
22
Otu onyeisi ụlọ ekpere ndị Juu aha ya bụ Jairọs bịara daa nꞌala nꞌihu ya.
23
Ọ rịọsịrị Jisọs arịrịọ ike sị ya, “Biko, ada m nwanyị nọ ugbu a nꞌọnụ ọnwụ bịa ngwangwa ka i metụ ya aka ka ọ dịkwa ndụ.”
24
Jisọs sooro nwoke a. Mgbe ha nọ nꞌụzọ na-aga, oke igwe mmadụ sooro ha.
25
Nꞌime igwe mmadụ ahụ otu nwanyị nọ ya onye nọrọrị nꞌọrịa afọ iri na abụọ. Ọrịa ya bụ oruru ọbara nke na-adịghị akwụsị akwụsị.
26
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị dibia agbalịala inyere ya aka ma o nweghị onye ọ bụla nwere ike gwọọ ya. O mefuokwala ego nile o nwere maka ịgwọ onwe ya.
27
Mgbe ọ nụrụ akụkọ ọrụ nile Jisọs na-arụ, o sooro igwe mmadụ ahụ, site nꞌetiti ha bịaruo nso nꞌazụ Jisọs, metụ uwe ya aka.
28
Nꞌihi na nwanyị a ekwuolarị nꞌobi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ uwe ya aka amaara m na ahụ ga-adị m mma.”
29
Ihe nile mekwara dị ka nwanyị a si chee ya nꞌobi ya. Nꞌihi na mgbe o metụrụ Jisọs aka ọbara ahụ kwụsịrị ịgba. Ọ matakwara na ahụ adịla ya mma.
30
Mgbe ahụ kwa Jisọs nꞌonwe ya matara na ike esitela ya nꞌahụ pụọ. Ọ tụgharịrị jụọ ajụjụ sị, “Ònye metụrụ uwe m aka?”
31
Ndị na-eso ụzọ ya gwara ya sị, “Lee na ọtụtụ mmadụ na-eso gị nꞌazụ, gịnị bụkwa uru ịjụ ajụjụ banyere onye metụrụ gị aka?”
32
Ma Jisọs tụgharịrị hụ nwanyị ahụ metụrụ ya aka.
33
Ụjọ tụrụ nwanyị ahụ. Ọ nọkwa na-ama jijiji. Ma ebe ọ maara na e sitela nꞌaka ahụ o metụrụ Jisọs gwọọ ya, ọ bịakwutere Jisọs daa nꞌala nꞌụkwụ ya kọọrọ ya ihe nile dị ka o siri mee.
34
Jisọs zara sị, “Ada m, okwukwe gị emeela ka ahụ dị gị mma. Laa nꞌudo. Bụrụkwa onye nweere onwe ya site na nrịrịa!”
35
Mgbe Jisọs nọ na-agwa nwanyị ahụ okwu, ndị ozi sitere nꞌụlọ Jaịrọs bịarute. Ha gwara Jaịrọs okwu sị, “Enyekwala onye ozizi nsogbu ọzọ, nꞌihi na ada gị anwụọla.”
36
Mgbe Jisọs nụrụ ozi ahụ, ọ gwara Jaịrọs okwu sị, “Atụla egwu. Nanị ihe ị ga-eme bụ inwe okwukwe.”
37
Mgbe ahụ Jisọs nyere iwu ka onye ọ bụla kwụsị iso ya gaa nꞌụlọ ahụ. Ma ọ kpọọrọ Pita, na Jemes, na Jọn.
38
Mgbe ha bịarutere nꞌụlọ ahụ, Jisọs hụrụ na ebelebe egbuola. Ndị mmadụ nọ na-akwa akwa, na-etikwa mkpu akwa.
39
Jisọs banyere nꞌụlọ ahụ jụọ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa na-etikwa mkpu akwa? Nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, ọ na-arahụ ụra!”
40
Mgbe ahụ, ndị nọ nꞌebe ahụ bidoro iji Jisọs ime ihe ọchị. Nꞌihi ya Jisọs chụpụrụ ha site nꞌụlọ ahụ. Ọ kpọọrọ nne na nna nwanta ahụ na Pita na Jemes na Jọn banye nꞌime ụlọ ahụ ebe nwanta ahụ dina.
41
O selitere nwanta ahụ nꞌaka sị ya, “Nwanta nwanyị bilie ọtọ!” Nwanta nwanyị a agbaala afọ iri na abụọ.
42
Otu mgbe ahụ nwanta ahụ biliri ọtọ bido na-ejegharị nꞌime ụlọ ahụ. Ọṅụ jupụtara obi nne na nna ya.
43
Ma Jisọs dọrọ ha aka na ntị ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla ihe mere. Ọ sịrị ha, “Nyenụ ya nri ka o rie!”
← Chapter 4
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 6 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16