bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 2
Mark 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 3 →
1
Mgbe ụfọdụ ụbọchị gasịrị, Jisọs lọghachiri na Kapanọm. Ọ dịkwaghị anya site nꞌoge ọ lọtara ọtụtụ mmadụ matara na ọ lọtala.
2
Nꞌihi ya, igwe mmadụ zukọtara nꞌime ụlọ ahụ ọ nọ. Ndị mmadụ dị nnọọ ukwuu. Ha nọchiri ụzọ e si abanye nꞌụlọ ahụ. Mmadụ enwekwaghị ike isite nꞌọnụ ụzọ ahụ bata. Jisọs kwusaara ha ozi ọma.
3
Ọ dịghị anya mmadụ anọ bịarutere nꞌebe igwe mmadụ ndị a gbakọrọ. Ha bu enyi ha nꞌute, bụ onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
4
Mgbe ha bịara nso ọnụ ụzọ ahụ, ha chọpụtara na ha enweghị ike isite na ya gafee, baa nꞌime ụlọ ahụ. Nꞌihi ya, ha rigooro elu ụlọ ahụ Jisọs nọ nꞌime ya, gwupuo elu ụlọ ahụ. Ha kenyere ụdọ dị ogologo nꞌute ahụ enyi ha dina nꞌime ya, sitekwa nꞌoghere ahụ ha mere wetuo ute ahu.
5
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe dị ukwuu nꞌime ya ịgwọ enyi ha nwoke, ọ sịrị onye ọrịa ahụ, “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.”
6
Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ enweghị ọṅụ nꞌobi ha nꞌihi okwu a Jisọs kwuru.
7
Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Gịnị mere nwoke a ji esi otu a ekwu okwu ikwulu Chineke? Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie ya.”
8
Ngwangwa Jisọs ghọtara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ jụrụ ha ajụjụ a, “Gịnị mere okwu m kwuru jiri wetara unu obi ọjọọ?
9
Olee nke dị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ na a gbagharala ya mmehie ya, ka ọ bụ ịgwa ya ka o bilie chịrị ute ya laa?
10
Ma igosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie,
11
ana m asị gị, onye ọrịa, bilie ọtọ, chịrị ute gị laa!”
12
Nꞌotu mgbe ahụ nwoke a, onye ọrịa ahụ, biliri. Ọ chịlitere ute ya pụọ nꞌihu mmadụ nile. Nke a juru ndị nile nọ nꞌebe ahụ anya. Ha toro Chineke na-asị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a mbụ!”
13
Emesịa, Jisọs pụrụ gaa nꞌakụkụ osimiri ahụ, kwusaara ndị gbara ya gburugburu ozi ọma.
14
Mgbe ọ na-agakwa nꞌihu, Jisọs hụrụ Livayị nwa Alfeọs ebe ọ nọdụrụ nꞌụlọ ndị ọnaụtụ, nke bụkwa ebe ọ na-arụ ọrụ. Jisọs sịrị ya, “Soro m.” Ngwangwa Livayị sooro ya.
15
Nꞌabalị ahụ, Livayị kpọrọ Jisọs oriri nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara ọtụtụ ndị enyi ya, ndị ọnaụtụ dị ka ya onwe ya, na ọtụtụ ndị mmehie. Ha nile na Jisọs nọkọkwara nꞌotu tebulu na-eri nri. Ndị a ha na Jisọs na-erikọ nri bụkwa ụdị ndị na-esogharị ya ebe ọ bụla ọ na-ekwusa ozi ọma.
16
Mgbe ndị ozizi iwu na ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-erikọ nri?”
17
Mgbe Jisọs nụrụ ajụjụ ha na-ajụ, ọ sịrị ha, “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị mma, kama ọ bụ ndị ọrịa ka ọ na-akpa. Abịaghị m ịgwa ndị ezi omume ka ha chegharịa, kama abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha si na mmehie ha chegharịa.”
18
Ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị Farisii na-ebu ọnụ oge nile. Ya mere, otu ụbọchị, ụfọdụ mmadụ bịakwutere Jisọs jụọ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị adịghị ebu ọnụ?”
19
Jisọs zara ha sị, “Ò ziri ezi ka ndị a kpọrọ oriri ọlụlụ di na nwụnye hapụ iri ihe mgbe di nwanyị nọ nꞌebe ahụ? Ya mere, mgbe di nwanyị nọ ya ibu ọnụ adịghị mkpa nꞌihi na ọ ga-enye ha ihe oriri.
20
Ma oge na-abịa mgbe di nwanyị na-agaghị anọ. Nꞌoge ahụ ha ga-ebu ọnụ.
21
O zighị ezi iji akwa ọhụrụ duchie ebe akwa ochie siri dọkaa nꞌihi na nke a ga-eme ka akwa ochie ahụ jọọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ.
22
Otu a kwa, ndị mmadụ adịghị etinye mmanya ọhụrụ dị ike nꞌime karama akpụkpọ ochie, nꞌihi na ike mmanya ọhụrụ a ga-eme ka karama akpụkpọ ochie ahụ gbawaa. Kama ọ dị mma itinye mmanya ọhụrụ nꞌime karama akpụkpọ ọhụrụ.”
23
Otu ụbọchị, nꞌụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya sitere nꞌubi a kụrụ ọka na-agafe. Mgbe ha na-agafe, ndị na-eso uzọ ya bidoro ịghọ ụfọdụ nꞌime ọka ndị ahụ na-ata.
24
Ma ụfọdụ ndị Farisii hụrụ ha mgbe ha na-eme nke a. Ha kpọkuru Jisọs sị ya, “Ị̀ na-ahụkwa ihe ndị na-eso ụzọ gị na-eme? O megidere iwu iwe ihe ubi nꞌụbọchị izuike anyị!”
25
Ma Jisọs sịrị ha, “Unu agụtaghị nꞌakwụkwọ nsọ ihe Devidi na ndị so ya mere mgbe agụụ gụrụ ha?
26
Nꞌoge Abịata bụ onyeisi nchụaja Devidi na ndị so ya banyere nꞌụlọ nsọ Chineke. Nꞌebe ahụ ha tara beredi e chere nꞌihu Chineke. Ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ kwesịrị ịta beredi nsọ ahụ karịakwa ndị nchụaja. Ma Devidi banyere nꞌebe ahụ were ya taa, nyetụkwa ndị ya na ha so.”
27
Jisọs gwakwara ha sị, “E mere ụbọchị izuike maka ọdịmma ndị mmadụ. E meghị mmadụ nꞌihi idebe ụbọchị izuike nsọ nanị.
28
Ọzọ kwa Nwa nke mmadụ ka ọ dịrị ikpebi ihe e kwesịrị ime nꞌụbọchị izuike, nꞌihi na ạbụ m Onyenwe ụbọchị izuike a!”
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16