bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 6
Mark 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 7 →
1
Jisọs sitere nꞌebe ahụ pụọ laghachi nꞌobodo nke a mụrụ ya, bụ Nazaret. Ndị na-eso ụzọ ya sooro ya gaa.
2
Nꞌụbọchị izuike, ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu dị nꞌebe ahụ, bido ikwu okwu Chineke. Ọtụtụ ndị gere ya ntị ka o juru anya bụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta. Ha jụrụ sị, “Ebee ka nwoke a nọrọ mụọ ihe ndị a nile? Ònye nyere ya amamihe a? Ebee ka o siri nweta ike ịrụ ọrụ ịrịba ama ndị a nile?
3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.
4
Ma Jisọs zara ha sị, “A na-asọpụrụ onye amụma nꞌebe nile, ma onye amụma adịghị enwe nsọpụrụ ọ bụla nꞌala a mụrụ ya, na nꞌetiti ndị ikwu ya na nꞌezinụlọ o siri pụta.”
5
Ọ rụghị ọrụ ịtụnanya ọ bụla nꞌebe ahụ. Ihe o mere bụ nanị ibikwasị mmadụ ole na ole ahụ na-esighị ike aka nꞌisi ma gwọọ ha.
6
O juru Jisọs anya na ndị a ekwereghị na ya. Mgbe ahụ Jisọs jegharịrị nꞌobodo nta nile dị nꞌebe ahụ na-ezi ndị mmadụ ihe.
7
Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.
8
Ọ gwara ha sị, “Unu ejila ihe ọ bụla mgbe unu na-aga njem a. Werenụ nanị mkpa nꞌaka unu. Unu ewerekwala nri ma ọ bụ akpa. Unu etinyekwala ego nꞌakpa unu.
9
Werenụ nanị akpụkpọ ụkwụ unu yi nꞌụkwụ unu. Unu ewekwala karịa otu uwe.
10
“Mgbe ọ bụla unu batara nꞌobodo ọ bụla nọdụnụ nꞌime ụlọ a nabatara unu tutuu ruo mgbe unu si nꞌobodo ahụ pụọ.
11
Obodo ọ bụla ndị bi nꞌime ya juru ịnabata unu, ma ọ bụ nke ndị bi nꞌime ya jụrụ ige unu ntị, sitenụ nꞌime ya pụọ. Mgbe unu na-ahapụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nꞌụkwụ unu nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Nke a ga-abụ ihe ama igosi na ha jụrụ Chineke na ozi ya.”
12
Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agwa ndị mmadụ ka ha si na mmehie ha chegharịa.
13
Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, wụkwasịkwa ndị ahụ na-esighị ike mmanụ olivu, gwọọ ha.
14
Ọ dịghị anya eze Herọd nụrụ akụkọ banyere Jisọs, nꞌihi na nꞌoge a ndị mmadụ nọ ebe nile na-ekwu okwu banyere ọrụ ebube ọ na-arụ. Ụfọdụ mmadụ sịrị, “Jisọs bụ Jọn omee baptizim. O sitela nꞌọnwụ dịrị ndụ ọzọ. Ọ bụ nke a mere o ji arụ ọrụ ịtụnanya ndị a nile ọ na-arụ.”
15
Ndị ụfọdụ sịrị, “Jisọs bụ Ịlaịja onye amụma ukwu nke mgbe ochie ahụ.” Ndị ọzọ sịkwara, “Jisọs bụ onye amụma ọhụrụ, dị ka ndị amụma nke mgbe ochie ahụ.”
16
Ma mgbe Herọd nụrụ ihe banyere Jisọs, ọ sịrị, “Nwoke a ga-abụkwanụ Jọn omee baptizim, onye m bipụrụ isi. O sitela nꞌọnwụ bilie!”
17
Ọ bụ Herọd nꞌonwe ya nyere iwu ka e jide Jọn. Ọ bụ ya nyere iwu ka e kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ. Herọd mere nke a nꞌihi Herodịas nwụnye ọ lụrụ. Herodịas bụrị nwụnye Filip nwanne Herọd tupuu Herọd emegharịa ya anya, gwa ya ka ọ hapụ Filip ka ya onwe ya, bụ Herọd, lụwa ya.
18
Nꞌoge ahụ, Jọn kwuru okwu megide ihe ọjọọ ahụ Herọd mere. Ọ gwara Herọd sị, “O zighị ezi na ị ga-alụ nwụnye nwanne gị.”
19
Nꞌihi nke a obi jọrọ Herodịas njọ megide Jọn. Ọ chọkwara igbu Jọn nꞌihi okwu ahụ o kwuru. Ma Herọd ekweghị ka e gbuo Jọn.
20
Nꞌihi na Herọd tụrụ egwu Jọn. Ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ, na onye dị nsọ. Nꞌihi nke a o tinyere ya nꞌụlọ mkpọrọ ichebe ndụ ya. Site nꞌoge ruo nꞌoge, Herọd na-akpọpụta Jọn ka ya na ya kparịa ụka. Ma ọ bụ ezie na Herọd adịghị enwe obi udo mgbe ọ bụla ya na Jọn kaparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ịna anụ ihe Jọn na-ekwu.
21
Otu ụbọchị, Herodịas nwetara ihe ọ na-achọ. Nꞌụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha nọ nꞌobi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ dị mkpa bi na Galili ka ha bịa nꞌoriri ahụ.
22
Nꞌoge oriri ahụ, ada Herọd, nke Herodịas mụtara, pụtara tee egwu nꞌihu Herọd na nꞌihu ndị ọbịa ya. Obi tọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ụtọ nꞌihu egwu o tere.
23
Ya mere, Herọd gwara ada ya nwanyị okwu sị ya, “Kpọọ ihe ọ bụla ị chọrọ aha, aga m enye gị ya. Ejikeere m inye gị ọ bụladị otu mpaghara nke ihe nile dị nꞌalaeze m.”
24
Nwanta nwanyị ahụ gbaara ọsọ jekwuru nne ya jụọ ya sị, “Gịnị ka m ga-arịọ nna m ka o nye m?”
25
Nne ya zara ya sị, “Laghachi azụ rịọ ya ka o nye gị isi Jọn omee baptizim ahụ!” Ngwangwa nwanta nwanyị ahụ laghachiri gwa Herọd nna ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.”
26
O wutere eze Herọd mgbe ọ nụrụ ihe ada ya chọrọ ka o meere ya. Ma ebe ọ bụ na o kwere nkwa inye ya ihe ọ bụla nꞌihu ndị ọbịa ya, ọ chọghị ka ha chee na ọ bụ eze nke na-adịghị eme ihe o kwuru.
27
O zipụrụ onye agha na-eche nche ka ọ gaa ngwangwa weta isi Jọn. Onye ahụ gara gbuo Jọn, bipu ya isi.
28
Tinye isi ahụ nꞌime efere butere nwagbọghọ ahụ, onye naara ya bulaara nne ya.
29
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn nụrụ ihe mere, ha bịara buru ozu Jọn gaa lie ya.
30
Ndị ozi ahụ Jisọs zipụrụ lọghachiri. Ha gbara Jisọs gburugburu kọọrọ ya ihe nile ha mere, na ihe ha ziri ndị mmadụ.
31
Nꞌoge ahụ ọtụtụ ndị mmadụ nọ nꞌebe ahụ. Ụfọdụ na-abịakwute Jisọs, ụfọdụ na-esitekwa nꞌebe ọ nọ na-apụ. Nꞌihi nke a ndị na-eso ụzọ ya enweghị ohere iri nri. Mgbe ahụ Jisọs sịrị ha, “Baịanụ soro m. Ka anyị sitenụ nꞌetiti ndị mmadụ a pụọ, gaa ebe anyị ga-ezu ike.”
32
Mgbe ahụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya pụrụ, baa nꞌime ụgbọ mmiri, gaa nꞌebe ha ga-anọdụrụ onwe ha.
33
Ma ọtụtụ mmadụ hụrụ ha mgbe ha na-apụ. Ebe ha maara ebe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-aga, ha sitere nꞌobodo nile dị ebe ahụ gburugburu gbara ọsọ site ụzọ ọzọ gbaruo ebe ahụ tupuu Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya abịaruo.
34
Mgbe Jisọs sitere nꞌụgbọ mmiri wụdata, ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmiko nꞌebe ha nọ, nꞌihi na ha dị ka ụmụ ọkụkọ na-enweghị nne. O bidokwara izi ha ihe mgbe ahụ.
35
Nꞌoge a, ọchịchịrị ebidola ịgba. Nꞌihi ya ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere Jisọs sị ya, “Chi na-akwado iji, ebe a bụkwa ọzara.
36
Zilaganụ ndị a ka ha gaa chọọrọ onwe ha ebe ha ga-azụta nri nꞌobodo ndị a dị anyị gburugburu.”
37
Ma Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Chọọrọnụ ha ihe ha ga-eri.” Ndị na-eso ụzọ ya zara ya sị, “Esi aṅaa eme nke a? Ònye pụrụ ịzụ igwe mmadụ ha otu a nri? Ọ ga-efu oke ego inye ndị a nri!”
38
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị na gịnị ka unu nwere? Gaanụ chọpụta.” Ọ dịghị anya ha bịaghachiri gwa ya sị, “Anyị nwere nanị ogbe beredi ise na azụ abụọ!”
39
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gwa igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala.
40
Ngwangwa ndị ahụ nọdụrụ ala nꞌigwe nꞌigwe. Ihe ruru iri mmadụ ise nọdụkọrọ nꞌotu ebe, ebe ọzọ kwa ihe ruru narị mmadụ nọdụkọrọ. Otu a ka ha nile siri nọdụchaa.
41
Jisọs naara ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị a welie anya ya elu kpee ekpere gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu a kwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha nile.
42
Mmadụ nile riri rijuo afọ.
43
Mgbe ha risịrị ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara ibiribe beredi na azụ dapụrụ nꞌala tụtụjuo ya nkata iri na abụọ.
44
Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ riri nri ahụ dị puku mmadụ ise.
45
Emesịa, na-atụfughị oge, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbọ mmiri bido ịga Betsaida. Ya onwe ya nọdụrụ chere izilaga ndị mmadụ ahụ.
46
Mgbe ndị a nile lara, Jisọs hapụrụ ebe ahụ gaa nꞌelu ugwu ikpe ekpere.
47
Nꞌabalị ahụ, mgbe ndị na-eso ụzọ ya nọ nꞌụgbọ mmiri, nꞌetiti osimiri ahụ, Jisọs nọrị nanị ya nꞌelu ala.
48
Site nꞌebe ọ nọ nꞌelu ala, Jisọs hụrụ ka ndị na-eso ụzọ ya na ebili mmiri na-agba mgba. Ọ hụrụ na ndị na-eso ụzọ ya nọ na nsogbu, hụkwa na ikuku na-efe nꞌụzọ na-emegide ha. Nꞌihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nꞌelu mmiri ịbịakwute ndị na-eso ụzọ ya. Emesịa, o rutere ebe ha nọ, mee dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
49
Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nꞌelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ. Nꞌihi ya ha bidoro iti mkpu akwa.
50
Ọ bụkwa ha nile hụrụ ya. Ụjọ tụkwara ha nile. Ma ngwangwa, Jisọs gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Unu atụla egwu, ọ bụ m.”
51
Emesịa, ọ rigobatara nꞌime ụgbọ mmiri ahụ, soro ha nọdụ. Otu mgbe ahụ ikuku ahụ dara juu. Ihe ndị a jukwara ndị na-eso ụzọ ya anya nke ukwuu.
52
Nꞌihi na ha aghọtabeghị onye Jisọs bụ, ọ bụladị mgbe o nyesịrị puku mmadụ ise ahụ nri. Ha emegheghị obi ha ịnabata ihe nile anya ha hụrụ.
53
Mgbe ha ruru nꞌofe ọzọ nke osimiri ahụ, ọ bụ nꞌobodo Genasaret ka ha kwụsịrị, kenye ụgbọ mmiri ha nꞌosisi.
54
Mgbe ha pụtasịrị, ndị nọ nꞌebe ahụ matara onye Jisọs bụ.
55
Ha gbaara ọsọ gaa nꞌobodo nta nile dị ebe ahụ gburugburu, ịkọsa akụkọ na Jisọs alọtala. Ha bidoro ibutere Jisọs ndị ọrịa nꞌute.
56
Ebe ọ bụla Jisọs gara, nꞌobodo ukwu na obodo nta, ma ọ bụ nꞌubi, ndị mmadụ na-ebupụta ndị ọrịa ha nyibe ha nꞌahịa na nꞌakụkụ ụzọ. Ha rịọrọ Jisọs ka o kwere ka ndị ọrịa ahụ metụ ọnụ uwe ya aka. Ndị nile siri otu a metụ ya aka ka ahụ dịrị mma.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16