bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Mark 13
Mark 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 14 →
1
Mgbe Jisọs sitere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ na-apụ nꞌụbọchị ahụ, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onye ozizi, ị hụkwara otu ụlọ ndị a si maa mma! Lee ụdị nkume ọma e ji wuo ha!”
2
Jisọs zara sị ya, “Unu hụrụ ụlọ ndị a, oge na-abịa mgbe unu na-agaghị ahụ ọ bụladị otu nkume nke e ji wuo ụlọ ndị a nꞌelu ibe ya, nꞌihi na a ga-ala ha nꞌiyi.”
3
Mgbe Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọdụrụ ala nꞌugwu olivu, na ncherita ihu ụlọ nsọ ukwu dị na Jerusalem, Pita na Jemes, na Jọn na Anduru bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị,
4
“Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a i kwuru ga-emezu! Anyị ga-esi aṅaa mata na ihe ndị a na-aga ime?”
5
Jisọs sịrị ha, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa nꞌaha m sị na ha bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ ndị ga-ege ha nti.
7
Unu ga-anụ, hụkwa mkpọtụ agha dị iche iche. Ma ka ụjọ hapụ ịtụ unu. Ihe dị otu a aghaghị ime. Ma o gosighị na ọgwụgwụ oge ihe nile eruola.
8
“Mba ga-ebili lụso mba ọsọ agha. Alaeze ga-ebilikwa buso alaeze ọzọ agha. A ga-enwe ala ọma jijiji nꞌọtụtụ obodo dị iche iche. Ụnwụ ga-adịkwa. Ma ihe ndị a nile bụ nanị mmalite ịta ahụhụ nke ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu.
9
Ma mgbe ihe ndị a na-eme, lezienụ anya! A ga-akpụrụ unu gaa nꞌụlọ ikpe, tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere dị iche iche. Nꞌihi m kwa, a ga-agbara unu akwụkwọ nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị. Oge a bụkwa oge unu ga-eji gwa ha ozi ọma ahụ.
10
Nꞌihi na a ga-ebu ụzọ kwusaa ozi ọma nye mmadụ nile tupu ọgwụgwụ oge ihe nile eruo.
11
Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nꞌụlọ ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji sara ọnụ unu. Kama gwanụ ha ihe ọ bụla Chineke tinyere nꞌọnụ unu ikwu nꞌoge ahụ. Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu.
12
“Ụmụnne ga-arara ụmụnne ha nye ka e gbuo ha. Nna ga-arara nwa ya nye. Ụmụ ga-ararakwa nna ha nye ka e gbuo ha.
13
Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m. Ma ndị nile nọgidere bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ruo nꞌogwụgwụ ihe nile, ndị jụrụ ịgọnarị m nꞌoge a, ka a ga-azọpụta.
14
“Mgbe unu hụrụ ihe arụ ahụ ka o guzo nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, ka onye na-agụ ghọta ihe nke a pụtara, gbalaganụ! Gbaranụ ọsọ gaa nꞌugwu Judia!
15
Ọ bụrụ na ị nọ nꞌelu ụlọ agbalịkwala ịrịdata ịbanye nꞌụlọ gị iwere ihe ọ bụla, kama gbaa nnọọ ọsọ dị ka ike gị ha!
16
Ọ bụrụ na ị nọ nꞌubi alaghachila azụ nꞌụlọ ịchịrị uwe i ji achụ oyi.
17
“Ụbọchị ahụ ga-adị nnọọ oke egwu nye ụmụ nwanyị ndị dị ime, na ụmụ nwanyị na-enye ụmụaka ara.
18
Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nꞌoge oyi.
19
Nꞌihi na ahụhụ nke ụbọchị ndị ahụ ga-adị ukwuu karịa ahụhụ ọ bụla mmadụ hụrụla site na mgbe ụwa bidoro. Ọ dịkwaghị ihe ga-adịkwa ka ya ruo mgbe ebighị ebi.
20
Ọ gwụchaala ma Onyenwe anyị mere ka oge ahụhụ ahụ dị mkpirikpi. Ma ọ bụghị ya, ọ dịghị onye ọ bụla ga-afọdụ ndụ nꞌụwa. Ma nꞌihi ndị ya, bụ ndị ọ họpụtara, Chineke emeela ka oge ndị ahụ dị mkpirikpi.
21
“Nꞌoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu sị, ‘Lee! onye a bụ Onye nzọpụta ahụ, ma ọ bụ onye ahụ bụ Onye nzọpụta ahụ,’ unu ekwela.
22
Nꞌihi na ọtụtụ ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta ìhè nꞌoge ahụ. Ha ga-arụ ọrụ ebube ha ga-eji gbalịa ịghọgbu ndị Chineke họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.
23
Kpacharanụ anya! Adọọla m unu aka na ntị!”
24
“Mgbe ahụhụ nke ụbọchị ahụ gasịrị, ọchịchịrị ga-agba nꞌebe nile, nꞌihi na anwụ agaghị enyekwa ìhè. Otu a kwa ọnwa agaghị enyekwa ìhè ya ọzọ.
25
Kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa. Mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.
26
“Nꞌoge ahụ, mmadụ nile, nꞌebe nile, ga-ahụ m, Nwa nke mmadụ, ka m ji ike dị ukwuu na ebube na-abịa nꞌime igwe ojii nke eluigwe.
27
Mgbe ahụ ka m ga-ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke ụwa, site nꞌotu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ.
28
“Ugbu a mụtanụ ihe site nꞌosisi fiigi. Mgbe ọ bụla alaka ya gbụrụ akwụkwọ ya nile ma malite iwepụta ahịhịa ndụ, unu maara na ọkọchị dị nso.
29
Nꞌụzọ dị otu a, mgbe unu hụrụ ihe ndị a nile m gwara unu ka ha bidoro ime, matanụ na ọggwụgwụ oge ihe nile dị nso, nꞌezie ọ dị nnọọ nso!
30
“Ana m agwa unu eziokwu na ọgbọ a agaghị agabiga tutuu ihe ndị a emezuo.
31
Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide tutuu ihe nile m kwuru emezuo.
32
“O nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ihe ndị a ga-eme, ma ọ bụ oge ha ga-emezu. Ndị mmụọ ozi amaghị, Nwa nke mmadụ amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna m maara.
33
Ebe ọ bụ na unu amaghị mgbe ha ga-emezu, nọọnụ na nche ụbọchị nile. Unu arahụkwala ụra.
34
“Ọbịbịa m ka a ga-eji tụnyere otu nwoke hapụrụ ụlọ ya gaa mba ọzọ. Tupu ọ pụọ, ọ kpọrọ ndị ọrụ ya nye ha ọrụ ha ga-arụ tupuu ọ lọta. Emesịa, ọ gwara onye na-eche ụlọ ya nche ka ọ na-ele anya nlọghachi ya.
35
Ya mere, unu onwe unu kwesịrị iche nche, nꞌihi na unu amaghị mgbe Onyenwe ụlọ ga-alọta. Ma ọ bụ nꞌanyasị, ma ọ bụ nꞌetiti abalị, ma ọ bụ mgbe ọkụkọ kwara akwa, ma ọ bụ nꞌụtụtụ.
36
Ọ bụrụ na ọ lọta na mberede, unu ekwela ka ọ lọkwute unu mgbe unu nọ nꞌụra.
37
Ya mere, ihe m na-agwa unu ugbu a kọsaaranụ ya mmadụ nile nꞌebe nile. Na-elenụ anya maka nlọghachi m.”
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16