bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 1
Romans 1
Igbo 1988
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 2 →
1
Ndị enyi m nọ na Rom, akwụkwọ ozi a si nꞌaka mụ onwe m Pọl, odibo Jisọs Kraịst onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onye na-ekwu ọnụ Kraịst, na onye e zipụkwara ịgbasa ozi ọma Kraịst.
2
Ozi ọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nꞌoge gara aga site nꞌọnụ ndị amụma ya. Ọ bụkwa ozi ọma e dekwara ihe banyere ya nꞌakwụkwọ nsọ.
3
Ozi ọma a metụtara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye bụ nwa nwa Devidi site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ.
4
Chineke gosiri na Jisọs bụ Ọkpara ya, onye ike nile dị nꞌaka ya, na onye nwekwara Mmụọ nke dị nsọ, mgbe o mere ka o si nꞌọnwụ bilie.
5
Ugbu a, ọ bụ site na Kraịst ka Chineke ji họpụta anyị ịbụ ndị ga-ejegharị ebe nile ịgwa ndị nọ ebe nile ihe Chineke meere ha, na ime ka ha kwerekwa na Chineke, kpebiekwa irubere ya isi.
6
Unu sokwa nꞌime ndị ahụ Chineke kpọrọ ka unu bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst.
7
Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya.
8
Aghaghị m imalite site nꞌikele Chineke ekele nꞌihi unu, site nꞌaha Jisọs Kraịst. Nke a bụ nꞌihi na ụwa nile anụla ihe gbasara okwukwe unu, nꞌihi na ebe ọ bụla m gara ana m anụ ka a na-ekwu okwu banyere okwukwe unu nwere na Chineke.
9
Chineke nꞌonwe ya, onye m na-ejere ozi, site nꞌikwusa ozi ọma nke Ọkpara ya, ga-agbara m akaebe na m na-echeta unu mgbe nile nꞌekpere m ehihie na abalị.
10
Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nꞌike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.
11
Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nꞌihi na achọrọ m ka unu keta oke nꞌonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzsi ike nꞌokwukwe.
12
Ọ bụkwaghị nanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume. Unu gbaa m ume, mụ onwe m agbaa unu ume. Site nꞌụzọ dị otu a anyị ga-abụ ngọzi nye onwe anyị.
13
Ụmụnna m, achọrọ ime ka unu mata na atụọla m ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe ma tutuu ruo ugbu a enwebeghị ike ịbịa. Ezubere m ịbịa ime ka unu mata Kraịst dị ka m mere nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-abụghị ndị Juu.
14
Nꞌihi na ọrụ m na-aghaghị ịrụ bụ ikwusa ozi ọma nye mmadụ nile, ikwusa ozi ọma nye ndị Griik na ndị na-abụghị ndị Griik, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu.
15
Nꞌihi ya, dị ka ike Chineke nyere m ha, ejikekwara m ịbịa ikwusa ozi ọma Jisọs Kraịst nye unu nile bi na Rom.
16
Nꞌihi na ihere ikwusa ozi ọma Kraịst adịghị eme m. Nꞌihi na amaara m na ọ bụ ụzọ dị ike nke Chineke kwadooro isite ịzọpụta onye ọ bụla kweere na ya. E buru ụzọ kwusaara ndị Juu ozi ọma a, ugbu a a na-akwusara ya ndị mba ọzọ.
17
Ọ bụ ozi ọma nke naakọrọ anyị na Chineke edoziela ụzọ anyị ga-esi dị ọcha nꞌihu ya site nꞌokwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere na Kraịst. Ozi ọma a na-agwakwa anyị na anyị pụrụ inweta ihe ndị a nile nanị site nꞌokwukwe. Nꞌihi na e deela ya rị nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ bụ nanị site nꞌokwukwe ka onye ezi omume ga-esi dị ndụ.”
18
Nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe mee ka iwe Chineke pụta ìhè megide mmehie na ajọ omumue nile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nꞌajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.
19
Nꞌihi na ndị a maara ihe ha kwesịrị ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nꞌihi na Chineke nꞌonwe ya emeela ka o doo ha anya, site nꞌitinye ụdị amamihe a nꞌime ha.
20
Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke.
21
Ọ bụ eziokwu na ha maara na Chineke dị, ma na ndụ ha, ha adịghị ezipụta na ha maara na Chineke dị. Ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye Chineke ekele nꞌihi nchebe ọ na-echebe ha. Nanị ihe ha na-eche nꞌobi ha bụ ihe nzuzu, ịtụpụta nꞌuche ha ihe ha chere na Chineke yiri, na ihe ha chere na ọ chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ụdị echiche dị otu a mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.
22
Mgbe ha na-eche na ha bụ ndị maara ihe, ha amataghị na ha bụ ndị nzuzu.
23
Kama ife Chineke na-adịghị anwụ anwụ ofufe, ha weere otuto ha kwesịrị inye ya nye ihe ndị ahụ ha jiri aka ha kpụọ, ihe ndị a yiri mmadụ na-anwụ anwụ, na ụmụ anụmanụ, na ihe na-akpụ akpụ nꞌala.
24
Nꞌihi na ha gosiri onwe ha dị ka ndị nzuzu, Chineke gbaketara ha azụ, hapụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ, bụ ịhe ọjọọ ndị ahụ ha ji merụọ anụ ahụ ha.
25
Kama ha ga-ekwere ihe ahụ ha maara na ọ bụ eziokwu Chineke, ha kpebiri ikwere nꞌokwu ụgha. Nꞌihi ya ha gara nꞌihu ife na ịsọ pụrụkwa ihe Chineke kere eke kama ha ga-efe Chineke, Onye kere ha na onye kwesịrị ka e nye otuto mgbe nile ebighị ebi. Amin!
26
Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha.
27
Ọzọ kwa, ndị ikom ha họrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta a. Nꞌụzọ dị otu a ha natakwara ntaramahụhụ kwesịri ha nꞌihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme.
28
Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chine nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ nile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.
29
Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.
30
Ha bụ ndị kpọrọ Chineke asị, bụrụkwa ndị nkwutọ, ndị nganga, ndị na-anya isi, ndị na-eme ibe ha ihe ihere. Oge nile ihe na-eche uche ya bụ ụzọ ha ga-esi gaa nꞌihu asọpụrụghị ndị mụrụ ha.
31
Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ.
32
Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 2 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16