bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 11
Romans 11
Igbo 1988
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 12 →
1
Ka m jụọ ajụjụ ọzọ. Ọ̀ ga-abụ na Chineke ajụla ndị Juu? Mba! Ana m asị mba nꞌihi na mụ onwe m bụkwa onye Juu. Abụ m nwa nwa Eberaham, bụrụkwa onye si nꞌagburu Benjamin pụta.
2
Chineke ajụbeghị ndị ya ọ họpụtara site na mmalite ihe nile. Chetakwa ihe Chineke gwara Ịlaija mgbe ọ bịakwutere ya na-agwa ya banyere otu ndị Juu si gbuo ndị amụma na otu ha si dọtusịa ebe ịchụ aja Chineke. Ịlaịja gwara Chineke okwu sị, “Onyenwe m, ha egbuchaala ndị amụma gị nile, mebisịakwa ebe ịchụ aja gị nile, ma ọ bụ nanị m fọdụrụ. Ha na-achọkwa ụzọ igbu m.”
4
Gịnị bụ ọsịsa Chineke nyere ya? Chineke zara sị ya, “Amaara m nke ọma na ọ bụghị nanị gị fọdụrụ, nꞌihi na enwere m puku mmadụ asaa ọzọ ndị hụrụ m nꞌanya, ndị na-egbubeghị ikpere ha nꞌala nye arụsị ọ bụla.”
5
Otu a ka ọ dịkwa. Chineke ahọrọla mmadụ ole na ole zọpụta ha nꞌihi obi ebere ya.
6
Ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌobi ebere Chineke mgbe ahụ nzọpụta abụghị site nꞌọrụ ọma ha rụrụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌọrụ ọma ha amara Chineke agaghị abụkwa onyinye a na-anata nꞌefu.
7
Ya mere, nke a bụ ọnọdụ ihe nile. Ndị Juu ji ike ha nile na-achọ Chineke, ma ha enweghị ike ịchọta ya. Ụfọdụ nꞌime ha achọtala ya, ndị ahụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara nꞌetiti ha site na mmalite. Ma Chineke emeela ka obi ndị ọzọ gbaa itiri.
8
Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ na-asị, “Chineke emeela ka ha bụrụ ndị na-arahụbiga ụra oke. O nyela ha anya nke ha na-ejighị ahụ ụzọ, nyekwa ha ntị nke ha na-ejighị anụ ihe: o mere nke a tutuu ruo taa.”
9
Devidi nꞌọnwe ya kwukwara okwu sị, “Ka ihe oriri ha ghọọrọ ha igbudu na ọ̀nya, ha bụrụkwa ndị na-asụ ngọngọ na ndị ahụhụ bịakwasịrị.
10
Ka anya ha gbaa ọchịchịrị, ka ha ghara ịhụ ọzọ. Ka ha bụrụ ndị azụ ha gaehuru ehuhu, ka ha huru ehuru naagagharị ruo mgbe ebighị ebi.”
11
Nke a ò gosiri na Chineke ajụla ndị Juu ruo mgbe ebighị? Mbaa! Kama nzube Chineke bụ na ọ ga-esite nꞌọdịda ndị Juu mee ka nzọpụta ruo ndị mba ọzọ aka. Ọ chọkwara ka nnabata a ga-anabata ndị mba ọzọ kpalie mmụọ ekworo ndị Juu ịchọrọ onwe ha nzọpụta ahụ.
12
Nꞌezie, ọ bụrụ na e mere ka ngọzi pụrụ iche rute ụwa nile aka nꞌihi na ndị Juu mehiere, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye nꞌime mmụọ ha mere ka ndị mba ọzọ keta oke na ngọzi ahụ dị ukwuu, ngọzi babigara ụba oke ọ̀ gaghị adị mgbe a gụnyekọrọ ọnụ ọgụgụ ndị Juu ahụ nile a ga-azọpụta?
13
Geenụ ntị, unu ndị mba ọzọ, matanụ nke ọma na Chineke họpụtara m ịbụ onyeozi Kraịst nye unu. Ana m anyakwa isi nꞌihi ya.
14
Nꞌihi na enwere m olileanya na, ma eleghị anya, apụrụ m isite nꞌụzọ a kpasuo ekworo ụfọdụ ndị Juu, ka e site nꞌekworo ha zọpụta ụfọdụ nꞌime ha.
15
Ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌọjụjụ a jụrụ ndị Juu ka e si mee ka ụwa na Chineke dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ gaghị adị ka ebe ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie ọzọ?
16
Ebe ọ bụkwa na ibiribe achịcha e ji chụọra Chineke aja bụ ihe dị nsọ, mgbe ahụ achịcha ahụ nile bụ ihe dị nsọ. Nꞌihi na ọ bụru na mgbọrọgwụ osisi dị nsọ, otu a kwa alaka ya ga-adịkwa nsọ.
17
Ma a nyakapụrụ ụfọdụ alaka osisi a, bụ ndị Juu, werekwa unu bụ ndị mba ọzọ, ndị bụ alaka osisi ọhịa nyapagide nꞌọnọdụ ha. Ya mere, unu esorola ndị Juu keta oke na ngọzi nile dịrị ha.
18
Ma unu ekwesịghị ịnya isi na a dọkapụrụ alaka ndị ọzọ were unu dọchie nꞌọnọdụ ha. Ihe unu na-aghaghị ịmata bụ nke a: unu bụ nanị alaka dị nꞌosisi. Ọ bụghị unu na-ebu mgbọrọgwụ osisi, kama ọ bụ mgbọrọgwụ osisi na-ebu unu.
19
Ma eleghị anya unu nwere ike kwuo sị, “Ma a nyakapụrụ ha nꞌihi na a chọrọ ka ohere dịrị ebe a ga-anyapagide anyị.”
20
Nke ahụ bụ eziokwu. Ma cheta na a nyakapụrụ ha nꞌihi na ha enweghị okwukwe. Ma ị nọ nꞌebe ahụ nꞌihi na i kweere. Ya mere anyala isi banyere ọnọdụ gị, kama tụọ egwu.
21
Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke emereghị alaka nke osisi ahụ wapụtara nꞌonwe ya ebere, ọ pụkwara iwepụ gị.
22
Lee otu Chineke si bụrụ onye na-eme ebere na onye na-adịghị eme ebere. Ọ bụ nanị ndị na-adịghị erubere ya isi ka ọ na-emesi ike, ma ọ na-enwe obi ebere nꞌebe ndị ahụ na-anọgịde nꞌime obi ebere ya. Ọ bụrụ na unu anọgideghị nꞌobi ebere ya, ọ ga-anyakapụkwa unu.
23
Otu aka ahụ, ọ bụrụ na ndị Juu ahụ e bipụrụ nꞌihi enweghị okwukwe emesịa bụrụ ndị kweere na Chineke, a ga-anyapagidekwa ha dị ka alaka osisi ahụ.
24
Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke weere unu bụ alaka osisi ọhịa nyapigide unu nꞌosisi ọma ya ahụ, gịnịkwanụ ga-egbochi Chineke ịnabata ndị Juu, mee ka ha laghachi azụ nꞌosisi ahụ e si nyakapụ ha.
25
Bikonụ ụmụnna m, achọrọ ka unu mata eziokwu Chineke a dị omimi, ka unu ghara isite nꞌọnọdụ unu bido na-anya isi. Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu na-edo onwe ha imegide ozi ọma ahụ ugbu a, ma omume dị otu a ga-adịgide nanị ruo nꞌoge ọnụ ọgụgụ ndị mba ọzọ a na-anabata zuru.
26
Mgbe ahụ a ga-azọpụta Izirel. Nꞌihi na nke a bụ ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye nzọpụta ga-esi na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka ndị Juu nile site na ndụ ekweghị na Chineke tụgharịa.
27
Nke a bụkwa ọgbụgba ndụ m nke ga-adịrị ha, mgbe m wepụrụ mmehie ha nile.”
28
Ugbu a, ndị Juu bụ ndị iro ozi ọma ahụ. Ha kpọrọ ya asị. Ma ịkpọ asị ha kpọrọ ozi ọma a bụ nꞌihi ọdịmma unu, ndị mba ọzọ. Ma ebe ha bụ ndị dị iche a họpụtara, Chineke ka hụkwara ha nꞌanya nꞌihi nkwa ahụ o kwere Eberaham, Aizik na Jekọb.
29
Nꞌihi na Chineke agaghị ala azụ nara mmadụ onyinye ọ bụla o nyere ya. Otu a kwa, ọ gaghị ahapụ imezu nkwa ọ bụla o kwere mmadụ.
30
Chetakwanụ ihe unu bụ na mbụ, ndị na-enupụ isi nꞌebe Chineke nọ. Ma mgbe ndị Juu jụrụ onyinye Chineke nyere ha, Chineke chigharịrị meere unu ebere.
31
Otu a ka ọ dịkwa ndị Juu taa. Ha bụ ndị na-enupụ isi ugbu a, ma otu ụbọchị ha gaesoro unu keta oke nꞌebere Chineke.
32
Nꞌihi na Chineke enyefeela onye ọ bụla nꞌaka mmehie, ka o si otu a gosi mmadụ nile obi ebere ya.
33
Leenụ ka o si dị omimi bụ akụ ahụ Chineke nwere! Lee ka ịba ụba nke amamihe ya na ihe ọmụma ya si dị ukwuu! Ònye pụrụ ịghọta nzube ya nile, na ụzọ o si eme ihe o zubere ime?
34
Ònye maara uche Chineke? Ònye maara ihe ruo ogo ịdụ Chineke ọdụ?
35
Ònye ka mmadụ ahụ bụ, onye pụrụ inyeju Chineke onyinye aka, nke ga-eme ka Chineke meere ya ihe ọ chọrọ?
36
Nꞌihi na Chineke kere ihe nile. Ihe nile na-adịkwa ndụ site nꞌike ya. Ihe nile dịkwa inye ya otuto. Ka otuto dịrị ya ruo mgbe ebighị ebi! Amin.
← Chapter 10
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 12 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16