bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 4
Romans 4
Igbo 1988
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
1
Ka anyị lee anya nihe ịma atụ anyị nwere nakwụkwọ nsọ. Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Eberaham, nna nna ndị Juu? Gịnị pụtara ìhè na ndụ Eberaham banyere inwe okwukwe na nzọpụta?
2
Gịnị mere Chineke ji nabata ya? Ọ bụ nihi ọrụ ọma ọ rụrụ? Ọ bụrụ na Chineke nabatara Eberaham nihi ọrụ ọma, mgbe ahụ Eberaham nwere ihe ọ ga-eji nyaa isi. Ma nebe Chineke nọ, Eberaham enweghị ihe ọ bụla ọ ga-eji nyaa isi.
3
Nihi na a gwara anyị nakwụkwọ nsọ sị, Chineke gụrụ Eberaham dị ka onye ezi omume nihi na o kweere na Chineke.
4
Mgbe mmadụ rụrụ ọrụ, ụgwọ ọrụ a kwụrụ ya abụghị onyinye, kama ọ bụ ihe ruru ya nihi ọrụ ọ rụrụ.
5
Ma mmadụ ahụ na-arụghị ọrụ ọ bụla, nke tụkwasịrị Chineke ahụ na-agụ ndị ajọ omume dị ka ndị na-enweghị mmehie obi, ka a na-agụrụ okwukwe ahụ o nwere dị ka ezi omume.
6
Ọ bụkwa otu okwu a ka Devidi kwuru ihe banyere ya, mgbe o kwuru sị na, “Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke ọgụgụ Chineke gụrụ ya nonye ezi omume na-esiteghị nọrụ ọma ọ rụrụ.”
7
Devidi kwukwara sị, “Ngọzi na-adịrị ndị nile Chineke gbaghaara ajọ omume ha nile, ndị Chineke kpuchiri mmehie ha.
8
Ngọzi dịịrị nwoke ahụ, onye Chineke na-adịkwaghị agụ mmehie ya, megide ya.”
9
Onye ka ngọzi a Devidi kwuru okwu ya dịịrị? Ọ dịịrị ndị Juu kweere na Kraịst ma na-edebekwa iwu? Ka ọ dịịrị ndị ahụ kweere na Kraịst ma ha adịghị edebekwa iwu? Ka anyị lee anya na ndụ Eberaham. Ihe anyị kwuru bụ na Chineke nabatara ya nihi okwukwe ya. Chineke ọ nabatara ya nihi okwukwe ya nanị? Ka ọ nabatara ya nihi na o debekwara iwu?
10
Anyị ga-asa ajụjụ a site nịjụ ajụjụ ọzọ. Olee mgbe Chineke gụrụ Eberaham dị ka onye ezi omume? Ọ bụ tupuu e bie ya ugwu nke mere ka ọ bụrụ onye Juu, ka ọ bụ mgbe e bichara ya ugwu? Chineke anabatachaala ya dị ka onye ezi omume tupuu e bie ya ugwu.
11
Chineke ekwechaala nkwa na ya ga-agọzi Eberaham tupuu e bie ya ugwu. Obibi ugwu ya bụ nanị ihe ngosi na Chineke anabatala ya, gụọ ya nonye ezi omume nihi okwukwe ya nime Chineke. Ọ bụ nke a mere Eberaham ji bụrụ nna ndị nile kweere na Chineke, ndị ahụ ọ gụrụ dị ka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.
12
Nụzọ di otu a kwa Eberaham bụ nna ndị nile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nihi na Chineke nabatara Eberaham nanị site nokwukwe o nwere tupuu e bie ya ugwu.
13
Ọ pụtala ìhè ugbu a na nkwa ahụ Chineke kwere Eberaham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị nihi na Eberaham debere iwu Chineke, kama ọ bụ nihi na o kweere na Chineke. Ọ bụkwa site nokwukwe ya, ka Chineke ji gụọ Eberaham nonye ezi omume.
14
Nihi na ọ bụrụ na nkwa Chineke dịịrị nanị ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abaghị uru, inwe okwukwe bụkwa nzuzu, nihi na nkwa ahụ Chineke kwere enwekwaghị isi ọ bụla.
15
Ma eziokwu ahụ pụtara ìhè bụ na iwu nonwe ya na-eme ka ọnụma bịa. Nihi na ebe iwu na-adịghị, mmehie adịkwaghị.
16
Ya mere Chineke na-enye anyị ngọzi ya nile site nokwukwe anyị nwere nime ya. Ọ na-enyekwa anyị ya nefu. Anyị ga-anata onyinye ndị a ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị okwukwe Eberaham nwere. Ya mere nihe gbasara inwe okwukwe nime Chineke, Eberaham bụ nna anyị.
17
Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu nebe ahụ e dere ya sị, “Emeela m gị ka ị bụrụ nna ọtụtụ mba.” Ya mere, nihu Chineke ahụ Eberaham kweere nime ya, Eberaham bụ nna anyị. Ee, ọ bụ nna anyị nihu Chineke ahụ na-eme ka ndị nwụrụ anwụ dịkwa ndụ ọzọ, onye na-enye iwu mee ka ihe na-adịbeghị dịrị.
18
Eberaham kweere okwu Chineke mgbe ihe ọ bụla na-adịghị nke ọ pụrụ iji tụkwasị Chineke obi. O sitere nụzọ dị otu a bụrụ nna nke ọtụtụ mba, dị ka Chineke gwara ya na ụmụ ụmụ ya gaamụba.
19
Noge ahụ Eberaham agbaala narị afọ. Ọ maara nke ọma na ọ kaala nka ịmụta nwa. Ọ makwaara na Sera nwụnye ya, onye gbara iri afọ toolu noge a, agaghị amụkwa nwa ọzọ. Ma o kweghị ka ihe ndị a gbochie ya ikwesi ike na Chineke ga-eme ihe o kwere na nkwa, nye ya nwa nwoke.
20
Ọ dịghị mgbe ọ bụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe nile o kwere ya na nkwa. Okwukwe o nwere na Chineke siri nnọọ ike mee ka Eberaham bido ito Chineke nihi mmezu nkwa o kwere ya, tupuu Chineke emeere ya ihe ahụ.
21
O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe nile ọ bụla o kwere ya na nkwa.
22
Ọ bụ nihi ụdị okwukwe a Eberaham nwere ka Chineke ji gụọ ya nonye ezi omume, onye na-enwekwaghị mmehie ọ bụla.
23
Ugbu a, edeghị nakwụkwọ nsọ ihe banyere otu Chineke siri gụọ Eberaham nonye ezi omume, nihi ọdịmma nke Eberaham nanị.
24
Kama e dere ya nihi anyị, iji gosi anyị na Chineke kwadokwara ịnabata anyị site notu ụzọ ahụ o si nabata Eberaham, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na nkwa Chineke, onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si na ndị nwụrụ anwụ bilie.
25
E gburu Jisọs nihi mmehie anyị, ma o si nọnwụ bilie ọzọ ịzọpụta anyị site na mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dị na mma, na imejupụta anyị nịdị mma nke Chineke nonwe ya.
← Chapter 3
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 5 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16