bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 2
Romans 2
Igbo 1988
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 3 →
1
Enyi m nwoke, ọ bụrụ na ị na-edo onwe gị ugbu a dị ka onye ikpe megide ndị ahụ mehiere, achọrọ m ime ka ị mata na o nweghị ụzọ o si kwesị ekwesị ka gị, onye ọ bụla ị bụ, kpee onye ọzọ ikpe. Nꞌihi na mgbe ị mara onye ọzọ ikpe, chetakwa na ọ bụkwa onwe gị ka ị na-ama ikpe, ebe ọ bụ na gị onwe gị na-emekwa otu ụdị mmehie ahụ.
2
Ma anyị maara na Chineke na-ekpe ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a ikpe nꞌụzọ ziri ezi.
3
Ya mere, mgbe gị onwe gị nọdụrụ ala na-atụ onye ọzọ aka nꞌihu nꞌihe ndị ahụ ị na-emekwa, i chere na Chineke ga-ekpe ya ikpe hapụ ikpe gị ike? Ka ị na-eche na o nwere ụzọ ị ga-esi gbanarị ikpe ọmụma Chineke?
4
Ka ị na-eleda obi ebere Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachi obi ya anya? Ị maghị na obi ebere o nwere nꞌebe ị nọ kwesịrị ime ka i site na mmehie gị chegharịa?
5
Ma ọ naghị emetụ gị nꞌobi ikwere na Chineke, nꞌihi mkpọchị nke obi gị kpọchịrị! Ma ihe ị na-eme bụ nanị ijikere onwe gị nye ụbọchị ahụ Chineke ga-esite nꞌiwe ya kpee gị ikpe dị egwu. Mgbe Chineke ga-ekpughe na ọ bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi.
6
Nꞌụbọchị ahụ, Chineke ga-akwụghachi onye ọ bụla dị ka ọrụ ya si dị.
7
Chineke gaenye ndị nile sitere na ntachi obi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide ndụ ebighị ebi.
8
Ma ndị nile na-akpa iche, ndị jụkwara iso eziokwu ahụ, ndị na-anọgidekwa na-eme ihe ọjọọ, ka Chineke ga-ata ahụhụ, gosi ha iwe ọkụ na ọnụma ya.
9
Ee, nsogbu na iru uju gaabịakwasị ha nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, bụ ndị nọgidere na mmehie.
10
Ma otuto na nsọpụrụ na udo nke si nꞌebe Chineke nọ, ga-abụ nke onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, ee, onye Juu ọ bụla na ndị mba ọzọ.
11
Nꞌihi na Chineke anaghị ele mmadụ anya nꞌihu.
12
Nꞌdị nile mehiere nꞌọnọdụ enweghị iwu ga-ala nꞌiyi na-agbanyeghị ihe iwu kwuru. Ma ndị nile mehiere megide iwu ahụ ha maara ihe banyere ya ka a ma-ama ikpe dị ka iwu si kwuo.
13
Nꞌihi na ọ bụghị ndị ahụ na-anụ mgbe a na-agụpụta akwụkwọ iwu ka a na-agụ dị ka ndị ezi omume, kama ọ bụ ndị ahụ nile na-eme ihe ha nụrụ iwu kwuru.
14
Nꞌezie, mgbe ndị mba ọzọ na-enweghị iwu sitere nꞌobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ inwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.
15
Nꞌihi na ndụ ha na-egosipụta na e deela ihe ndị ahụ iwu kwuru nꞌobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ufọdụ, ma na-etokwa ya mgbe ụfọdụ.
16
Ya mere, anyị maara na a ga-agụkọ ihe ndị a nile nꞌụbọchị ahụ Chineke ga-ekpe ndụ nzuzo nile ụmụ mmadụ na-ebi ikpe, site na Kraịst Jisọs. Ihe ndị a sokwa nꞌozi ọma nke m na-ekwusa.
17
Leenụ! gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nꞌiwu ahụ Chineke nyere gị, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke.
18
Ee, o juru gị afọ na ị maara ihe Chineke na-achọ, ọ jukwara gị afọ na i nwere ike ịkọwa ihe dị iche nꞌetiti ajọ ihe na ihe ziri ezi.
19
Ụzọ e si eme uche Chineke doro gị nnọọ anya, ruo na i nwere ike iguso ndị na-amaghị ụzọ a otu ha ga-esi bịakwute Chineke. Ị na-agụ onwe gị dị ka ìhè na-edu ndị nọ nꞌọchịchịrị ụzọ.
20
Ị na-agụkwa onwe gị dị ka onye nkuzi ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nꞌihi na ị maara iwu Chineke nke ọma, jupụtakwa nꞌamamihe na eziokwu.
21
Ma ugbu a, enyi m nwoke, mgbe a nile ị na-ezi ndị mmadụ ihe ị na-ezikwa onwe gị? Ị na-ezi ndị ọzọ na izu ohi bụ ihe ọjọọ, i leziela anya hụ na ị naghị ezu ohi?
22
Ị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịkwa iko, i leziela anya hụ na gị onwe gị adịghị akwa iko? Ị chọghị iji anya hụ ka mmadụ na-ekpere arụsị a kpụrụ akpụ, ma ọ naghị ezukpọ ego dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke?
23
Ị na-akpa nganga na ị maara iwu nke ọma, ma lee na mgbe ị na-emebi otu nꞌime iwu ndị a ọ bụ ihe ihere ka ị na-ewetara Chineke.
24
Ọ bụghị ihe iju anya na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ndị mba ọzọ na-ekwulu aha Chineke nꞌihi unu ndị Juu.”
25
Uru ọ bara na mmadụ bụ onye Juu bụ na onye ahụ na-edebe iwu Chineke. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu emebie iwu ya o nweghị ihe dị iche nꞌetiti unu na ndị na-amaghị Chineke.
26
Nꞌihi na ọ bụrụ na ndị mba ọzọ edebe iwu Chineke, Chineke ga-agụ ha dị ka ndị Juu.
27
Ọ bụ ezie na unu ndị Juu nwere iwu e dere nꞌakwụkwọ, ma ndị ahụ na-abụghị ndị Juu, ndị na-eme ihe iwu na-achọ ga-ama unu ikpe. Ha ga-ama unu ikpe nꞌihi na unu anaghị eme ihe iwu na-achọ.
28
Mmadụ abụghị onye Juu site nanị nꞌọmụmụ a mụrụ ya nꞌezinụlọ ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihi na e biri onye ahụ ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu.
29
É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ.
← Chapter 1
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 3 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16