bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 3
Romans 3
Igbo 1988
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 4 →
1
Ọ̀ dị uru pụrụ iche mmadụ nwere nꞌihi na ọ bụ onye Juu? Gịnị bụkwa uru ahụ dị ukwuu nke ndị e biri ugwu nꞌusoro omenala ndị Juu nwere?
2
Ọ bara uru nꞌụzọ nile na mmadụ bụ onye Juu. Nke mbụ, ọ bụ ndị Juu ka e weere okwu Chineke nyefee nꞌaka.
3
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu ekwesịghị ntụkwasị obi, ma ekwesịghị ntụkwasị obi ha ọ̀ pụrụ ime ka Chineke ghara imezu nkwa o kwere ndị ahụ hụrụ ya nꞌanya?
4
Tụfịakwa! Chineke ekwela! Ọ bụrụdị na mmadụ nile nọ nꞌụwa aghọọ ndị okwu ụgha, eziokwu nke Chineke ga-adịgide. Nꞌihi na e dere nꞌakwụwkọ nsọ sị na okwu ọ bụla Chineke kwuru ga-abụ eziokwu mgbe nile. Ka e si otu a mee ka Chineke bụrụ onye mmeri mgbe ọ bụla onye ọ bụla jụrụ ajụjụ banyere okwu ahụ.
5
Ọ bụrụ na ajọ omume anyị na-eme ka ezi omume Chineke pụta ìhè, gịnị ka anyị ga-ekwu? Anyị ga-asị na Chineke adịghị eme ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na ọ taa anyị ahụhụ nꞌihi ajọ omume anyị? Ana m ekwu okwu a dị ka ndị mmadụ si ekwu ya.
6
Ọ̀ bụ ụdị okwu dị aṅaa dị nke a? Ọ bụrụ na ihe esi otu ahụ mee, oleekwanụ otu Chineke ga-esi kpee ụwa ikpe?
7
Nꞌihi na ọ bụrụ na a na-esite nꞌokwu ụgha m na-ewetara Chineke otuto, ebe ọ bụ na okwu ụgha m na-eme ka eziokwu Chineke pụtazie nke ọma, gịnị mere a ga-eji maa m ikpe mmehie?
8
Nꞌihi na ọ bụrụ na ajọ omume m na-ewetara Chineke ezi otuto, mgbe ahụ ihe anyị ga-ekwu bụ na ọ dị mma ka anyị nọgide na-eme ihe ọjọọ ka ihe ọma si na ya bịa. (Nꞌezie, ọmụma ikpe na-eche ndị na-ekwu ụdị okwu a bụ ọmụma ikpe ziri ezi.) Ma ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ụdị okwu a ka m na-ekwusa.
9
Ugbu a, ọ̀ dị ụzọ anyị bụ ndị Juu si ka ndị ọzọ mma? Mbaa! O nweghị ụzọ anyị si ka ha mma. Nꞌihi na e meela ya rị ka ọ pụta ìhè na mmadụ nile bụ ndị mmehie, ndị Juu na ndị mba ọzọ.
10
Akwụkwọ nsọ ekwuola ya sị, “Ọ dịghị onye ọ bụla dị mma nꞌụwa. Ọ dịghị onye ọ bụla, ọ bụladị otu onye nꞌụwa bụ onye ezi omume.
11
“Ọ dịghị onye ọ bụla na-aghọta, ọ dịkwaghị onye ọ na-agụ agụụ igbaso Chineke.
12
“Mmadụ nile esila nꞌebe Chineke nọ kpafuo. Ha nile emehiela. Ọ dịghị onye na-eme ihe dị mma, ọ bụladị otu onye.
13
“Okwu na-esi ha nꞌọnụ apụta bụ okwu rere ure, nke na-esi isi dị ka isi na-esite nꞌili ghe oghe na-apụta. Ire ha jupụtakwara nꞌokwu ụgha. Okwu ọjọọ ha na-ekwu nwere ike igbu mmadụ. Ọ dị ka elo si nꞌọnụ ajụala apụta.
14
“Nanị okwu ilu jupụtara ha nꞌọnụ.
15
“Ihe ha na-eme ọsịịsọ bụ igbu ọchụ na imerụ mmadụ ahụ.
16
Ebe ọ bụla ha gara, ha na-eweta mbibi na nsogbu nye ndị ahụ.
17
Ha amaghị ihe a na-akpọ udo.
18
“Ha amụtabeghị ihe ịtụ Chineke egwu bụ.”
19
Anyị maara na idebe iwu dịịrị ndị ahụ Chineke nyere iwu ya. Ma e mekwara ka iwu bụrụ ihe ga-eme ka ọnụ ndị mmadụ nile dere duu, ka mmadụ nile nọ nꞌụwa mata na nꞌihu Chineke ha bụ ndị ikpe mara.
20
Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a pụrụ ịgụ nꞌonye ezi omume nꞌihu Chineke maka na o debere iwu. Kama ihe iwu na-eme bụ igosi anyị na anyị bụ ndị mmehie.
21
Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a.
22
Chineke ekwuola na ya ga-anabata anyị, gụọ anyị na ndị na-emeghị mmehie, ma ọ bụrụ na anyị ekwere na Jisọs Kraịst. Chineke na-anabatakwa ndị nile kweere na Kraịst na-ajụghị ajụjụ ma ha bụ ndị Juu ma ọ bụkwanụ ndị mba ọzọ.
23
Nꞌihi na mmadụ nile emehiela megide Chineke. Ha adịghị emekwa ihe nile Chineke chọrọ ka ha mee.
24
Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị.
25
Nꞌihi na Chineke zitere Kraịst ka ọ bụrụ aja a chụrụ nꞌihi ikpuchi mmehie anyị, ka ọbara Kraịst na okwukwe anyị nwere nꞌime ya bụrụ ihe ịjụrụ obi nye ya maka mgbaghara mmehie. Chineke sitere nꞌụzọ a mee ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ebe o sitere na ntachi obi ya hapụ ịta ndị ahụ mehiere megide ya nꞌoge mgbe ochie ahụhụ.
26
Ugbu a, Chineke na-anabata ndị mmehie site nꞌụzọ a igosikwa na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ahụ na-agụ ndị nile nwere okwukwe nꞌime Jisọs dị ka ndị na-emeghị mmehie.
27
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst.
28
Ya mere Chineke zọpụtara anyị nꞌihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ bụghị nꞌihi na anyị mere ihe iwu kwuru.
29
Chineke ọ na-azọpụta nanị ndị Juu? Mba! Nꞌihi na Chineke bụkwa Chineke ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabatakwa ndị mba ọzọ bụ ndị bịakwutere ya site nꞌokwukwe nꞌime Kraịst.
30
Nꞌihi na dị ka Chineke si emeso ndị Juu omume, otu a ka o si emesokwa ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabata ndị Juu nile kweere na Kraịst, nabatakwa ndị mba ọzọ site nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs Kraịst.
31
Ọ bụrụ na Chineke na-anabata anyị site nꞌokwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na iwu adịkwaghị mkpa? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesịrị ya.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16