bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 15
Romans 15
Igbo 1988
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 16 →
1
Ya mere, ka anyị nile ndị okwukwe ha siri ike hapụ ichefu na anyị ka ọ dịrị inyere ndị okwukwe ha na-esighị ike aka. Anyị ekwesịghị ime nanị ihe na-atọ anyị ụtọ.
2
Ka onye ọ bụla nꞌime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbata obi ya ụtọ. Ka anyị na-eme ihe ga-enyere ha aka, na ihe ga-ewuli okwukwe ha elu nꞌime Onyenwe anyị.
3
Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya emeghị ihe tọrọ onwe ya ụtọ, kama dị ka onye dere akwụkwọ Abụ ọma si gwa anyị, “Ọ bịara ka ịta ụta nile na mkparị nile nke ndị na-emegide Chineke dakwasị ya!”
4
Ihe ndị a nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ nꞌoge gara aga bụ maka izi anyị ntachi obi, na ịgba anyị ume. Ka anyị site na ha na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ Chineke ga-ala ike mmehie na ọnwụ nꞌiyi.
5
Ka Chineke, onye na-enye ntachi obi, onye na-agbakwa ndị na-ada mba ume, nye unu mmụọ nke ịdị nꞌotu, ka unu nwee ike ibi nꞌudo, ka unu nweekwa ike mesoo ibe unu ụdị mmeso ahụ Kraịst mesoro anyị.
6
Nꞌihi na nke a ga-eme ka unu nile jikọtaa obi unu, na olu unu nꞌotu, inye Chineke nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.
7
Ya mere, ọ bụ ihe dị mma na unu ga na-akpọbata onwe unu dị ka Kraịst si kpọbata unu. Nke a ga-ewetara Chineke otuto.
8
Chetakwanụ na Kraịst bịara igosi anyị na Chineke bụ onye na-emezu nkwa o kwere. Chetakwa na ọ bịakwara inyere ndị Juu aka.
9
Chetakwa na ọ bịara ime ka ndị mba ọzọ bụrụ ndị Chineke ga-anabata, ndị ga-eto Chineke nꞌihi obi ebere ya o gosiri ha. Nke a bụ ihe onye dere akwụkwọ Abụ Ọma bu nꞌobi mgbe o dere sị, “Aga m eto aha gị nꞌetiti ndị mba ọzọ. Aga m abụ abụ otuto nye aha gị.”
10
Ọzọ kwa, o kwukwara sị, “Unu ndị mba ọzọ, soronụ ndị Chineke nile ṅụrịa ọṅụ.”
11
Nꞌebe ọzọ kwa, o dekwara sị, “Toonụ Chineke, unu ndị mba ọzọ, gwakwanụ mmadụ nle ka ha na-aja ya mma.”
12
Aịzaya onye amụma dekwara nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ dị onye a gaamụ nꞌezinụlọ Jeesi, onye ga-abụ onye ga-eketa alaeze Devidi. Ọ ga-abụ onye ga-achị ụwa nile. Ndị mba ọzọ gaenwekwa nchekwube na olileanya nꞌime ya.”
13
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.
14
Amaara m, ụmụnna m, na unu jupụtara nꞌezi ndụ, na mmụta. Amakwaara m, na unu maara ihe ndị a nile ruo izi ya ndị ọzọ.
15
Ma ana m ede ụfọdụ ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na amaara m na ihe dị mkpa bụ nanị ime ka unu cheta ha. Nꞌihi na site nꞌamara ahụ Chineke nyere m,
16
abụ m onyeozi Kraịst; ọrụ pụrụ iche e nyere m bụ igbasara ndị mba ọzọ ozi ọma, na iche ha nꞌihu Chineke dị ka aja dị ụtọ nke Chineke ga-anabata. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ emeela ka unu bụrụ ndị dị ọcha, ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ.
17
Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ m mere, ma ọ bụrụ na m anya isi nꞌọrụ ahụ nile Kraịst rụrụ site nꞌaka m.
18
Ọ bụghị m ka ọ dịrị ikwu otu Kraịst si jiri ndị ọzọ rụọ ọrụ ya. Ma nꞌihe banyere mụ onwe m, amaara m na Kraịst esitela nꞌokwu ọnụ m, na ihe ndị ọzọ m mere mee ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke, ka ha bụrụ ndị na-erubere ya isi.
19
Emeela m ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke site na nkwusa m, site nꞌụdị ndụ m biri nꞌetiti ha, na sitekwa nꞌọrụ ịrịba ama nile m rụrụ nke ha hụrụ, bụ ọrụ m rụrụ site nꞌike Mmụọ Nsọ Chineke. Nꞌụzọ dị otu a emezuola m ihe Chineke chọrọ ka m mee, site nꞌikwusa ozi ọma Kraịst site na Jerusalem ruo nꞌobodo Ilirikum.
20
Ma ọ na-agụsikwa m agụụ ike ịga nꞌihu ikwusa ozi ọma Kraịst, karịsịa, nꞌebe ọ bụla ndị mmadụ na-anụbeghị ihe banyere ya. Nꞌihi na achọghị m ịrụ ọrụ nꞌebe onye ọzọ tacharala ahụhụ.
21
Kama, ana m eso ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ka ndị a na-agwabeghị ihe banyere ya, jiri anya ha hụrụ, ka ndị na-anụbeghị nụrụ, ghọtakwa.”
22
Nꞌezie, nke a bụ ihe mere m na-ejibeghị nwee ohere ịbịakwute unu.
23
Nꞌihi na ọ dịla anya kemgbe m bidoro ịpịa na m ga-abịa hụ unu anya, ma ugbu a ọrụ m nwere nꞌakụkụ a agwụla, oge eruola mgbe m ji ahapụ ebe a.
24
Nꞌihi na nzube m bụ ijeru obodo Spen. Mgbe ọ bụla m gaagakwa, aga m akwụsị ịhụ unu na Rom ka mụ na unu nọọ. Emesịakwa unu edupụ m nꞌije m.
25
Ma ugbu a, ana m aga Jerusalem iwejere nzukọ ndị Juu nọ nꞌebe ahụ onyinye.
26
Nꞌihi na nzukọ Kraịst dị na Masidonia, na Akaịa, tụkọrọ ego ha chọrọ ka e nye nzukọ Kraịst dị na Jerusalem, iji inyere ha aka nꞌọnọdụ mkpa ha ugbu a.
27
Ha ji ọṅụ nye onyinye ndị a nꞌihi na o metụrụ ha nꞌobi na o kwesịrị ka ha nyere nzukọ Kraịst dị na Jerusalem aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌaka ndị Juu ka ha si nata ngọzi nile nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nꞌakụ na ụba ha nwere nyere ndị Juu aka na mkpa ha.
28
Mgbe m wegachara onyinye a, mee ka o ruo ndị nwe ya aka, aga m abata ịhụ unu mgbe m na-aga Spen.
29
Ọ bụkwa olileanya m na mgbe m bịara, Chineke ga-esite nꞌaka m wetara unu ngọzi dị ukwuu.
30
Esi m nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nꞌime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m kpee ekpere, na-echeta m nꞌekpere unu nꞌihu Chineke.
31
Biko, rịọnụ Chineke ka ọ zọpụta m nꞌaka ndị na-amaghị ya nọ na Jerusalem. Kpeekwanụ ekpere ka Chineke mee ka ndị Kraịst ahụ anyị na-ewegara onyinye a jiri obi ọma nata ya.
32
Nke a ga-eme ka m nwee ike iji ọṅụ bịakwute unu, ka mụ na unu gbarịtaa onwe anyị ume.
33
Ugbu a ka Chineke anyị onye na-enye udo, nọnyere unu nile. Amin.
← Chapter 14
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 16 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
Recommended Reading
Commentary
Romans Commentaries
→
Devotional
Romans Devotional Guide
→
Get This Bible
Igbo Study Bible
→