bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 13
Romans 13
Igbo 1988
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 14 →
1
Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya.
2
Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma.
3
Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ.
4
Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.
5
Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee.
6
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka unu ga-eji tụọ ụtụ taksi unu nꞌoge, ka ndị ọrụ gọọmentị nwee ike nọgide na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ha ịrụ.
7
Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru.
8
Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ.
9
Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.
10
O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile.
11
Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya na-abịa nso. Ya mere, sitenụ nꞌụra bilie! Ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Nꞌezie ọ dị nso karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.
12
Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ, mgbe Kraịst ga-alọghachi. Ya mere, wezuganụ ọrụ ọjọọ nile nke ọchịchịrị, yikwasịkwanụ onwe unu ihe agha nke ezi ndụ, ụdị nke ndị bi nꞌihè kwesịrị iyiri.
13
Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha.
14
Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16