bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 16
Romans 16
Igbo 1988
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
1
Ana m eme ka unu mata na nwanna anyị nwanyị, Fibi, ezi onye Kraịst si na chọọchị dị nꞌobodo Sinkria, ga-abịa ịhụ unu na Rom na mgbe na-adịghị anya site ugbu a.
2
Biko nabatanụ ya nꞌime Onyenwe anyị dị ka nwanne aka unu. Nyekwaranụ ya aka nꞌụzọ nile unu nwere ike, nꞌihi na o nyerela mụ na ọtụtụ ndị Kraịst ọzọ aka.
3
Kelere m Prisilia na di ya Akwila ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ Kraịst Jisọs.
4
Nꞌezie, mmadụ abụọ a nyeere m aka na-ajụghị ajụjụ ihe gaadakwasị ha. Ọ bụkwaghị nanị m na-ekele ha, kama nzukọ Kraịst dị na mba ọzọ nile na-ekelekwa ha.
5
Biko kelekwaranụ m ndị nile naezukọ nꞌụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyị m Epinetus. Nwoke a bụ onye bu ụzọ nabata Kraịst nꞌobi ya, nꞌakụkụ Esia nile.
6
Keleerenụ m Meri, onye unu maara na-arụsi ọrụ ike inyere anyị aka.
7
Ana m ekelekwa Andronaikọs na Juniya, ndị ikwu m, ndị e tinyekọtara mụ na ha nꞌụlọ mkpọrọ. Ndị ozi nile na-asọpụrụ ha. Ha bukwa m ụzọ kwere na Kraịst.
8
Kelekwaaranụ m Ampliatọs onye m hụrụ nꞌanya nꞌime Onyenwe anyị.
9
Ya na Ọbanọs, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ Kraịst, na Stakis ezi enyị m.
10
Otu a kwa, keleekwa Apelis onye ihe ya dị Kraịst mma, na ndị nile na-arụ ọrụ nꞌụlọ Aristobulọs.
11
Keleere m nụ Herodian onye ikwu m. Keleekwanụ ndị bi nꞌụlọ Nasisọs. Ha bụ ndị Chineke.
12
Keleekwanụ Traịfina na Traịfosa nꞌihi na ụmụ nwanyị ndị a na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike. Keleekwanụ Pesis, onye a hụrụ nꞌanya na onye na-arụsi ọrụ Onyenwe anyị ike.
13
Keleere m Rufọs onye Chineke nꞌonwe ya họpụtara, na nne ya, onye na-emekwara m ka nne.
14
Ana m ekele unu Asinkritọs, Elegọn, Hamis, Patrobas, Hamas na ụmụnna anyị nile ndị ha na ha bi.
15
Keleere m nụ Filologọs, Juliya, Nerus na nwanne ya nwanyị. Keleekwanụ Olimpas na ndị Kraịst nile ha na ha nọ.
16
Werekwanụ isurita ọnụ dị nsọ, kelerịtaa onwe unu. Nzukọ Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekelekwa unu.
17
Ugbu a, ụmụnna m, o nwere otu ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu tupuu m mechie akwụkwọ ozi a. Wezuganụ onwe unu site nꞌebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, ndị na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nꞌihi ozizi ha na-ezi banyere Kraịst nke megidere ihe ahụ nile e ziri unu.
18
Ndị ozizi dị otu a abụghị ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ nanị nꞌihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.
19
Obi dị m ụtọ nꞌihi na mmadụ nile maara na unu bụ ndị guzosiri ike nꞌeziokwu, bụrụkwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ma achọrọ m ka unu nọgide na-abụ ndị maara ihe bụ ezi ihe, na ndị aka ha na-adị ọcha nꞌebe ihe ọjọọ nile dị.
20
Mgbe na-adịghị anya, Chineke onye na-enye udo ga-azọpịa ekwensu na ndị ọrụ ya nꞌokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. Yenwe anyị Jisọs dịnyere unu.
21
Timoti onye so m na-arụkọ ọrụ, na Lusiọs, na Jesin na Sospata, ndị ikwu m na-ekele unu.
22
Mụ onwe m bụ Taitọs, ode akwụkwọ Pọl, onye dere akwụkwọ a, na-ekelekwa unu nꞌaha Onyenwe anyị.
23
Gayọs, onye m nọ nꞌụlọ ya, na onye na-elekọta m, na-ekele unu. Otu a kwa, ndị nile naezukọ nꞌụlọ ya na-ekelekwa unu. Irastọs, onye na-eche ego ndị obodo a na nwanna anyị nwoke, na-ekelekwa unu.
24
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu nile. Amin.
25
Ugbu a, ana m enyefe unu nꞌaka Chineke onye pụrụ ime ka unu guzosie ike, dị ka ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa kwuru, na dị ka ihe m gwara unu si dị. Nke a bụ ụzọ Chineke họpụtara a ga-esi zọpụta ndị mba ọzọ, ụzọ dị omimi nke e zoro ezo oge ndị a nile.
26
Ugbu a, ekpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè, dị ka ndị amụma dere nꞌakwụkwọ nsọ na a ga-eme. A na-ekwusakwa ozi ọma a nꞌebe nile ka mmadụ nile nọ nꞌụwa kwere na Kraịst, ma tụkwasịkwa obi ha na ya.
27
Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye nanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. Amin.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16