bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 6
Romans 6
Igbo 1988
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 7 →
1
Ugbu a, gịnị ọzọ kwa ka anyị gaekwu? Anyị ga-anọgide nꞌime mmehie ka Chineke nọgide na-emere anyị ebere, ma na-agbaghara anyị?
2
Tụfịakwa! Chineke ekwela! Olee otu anyị ga-esi nọgide na mmehie, mgbe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị.
3
Nꞌihi na unu kwesịrị ịmata, na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtara anyị na ya nꞌọnwụ ya.
4
Ya mere, e likọtara anyị na ya na baptizim ka anyị si otu a keta oke nꞌọnwụ ya. Ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ, mgbe e sitere nꞌike dị ebube nke Nna mee ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.
5
Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nꞌọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nꞌọnwụ.
6
Nꞌihi na anyị maara na a kpọgidekọtara ndụ ochie anyị na Kraịst nꞌelu obe, ime ka anụ ahụ mmehie ahụ bụrụ ihe a lara nꞌiyi, ka anyị bụrụkwa ndị nwere onwe ha site nꞌịbụ ohu nye mmehie.
7
Mgbe mmadụ nwụrụ, ọ bụrụla onye nwere onwe ya site nꞌebe mmehie dị.
8
Ọ bụrụkwa nꞌeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwaara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.
9
Nꞌihi na anyị maara na ebe Chineke mere ka Kraịst site nꞌọnwụ bilie, Kraịst agaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ ọzọ.
10
Mgbe ọ nwụrụ, ọ nwụrụ nanị otu mgbe nye mmehie. Ma ndụ ọ dị ugbu a bụ nke ọ na-adị nye Chineke.
11
Ya mere, gụọ onwe gị ugbu a dị ka onye nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị. Gụọkwa onwe gị dị ka onye dị ndụ nꞌebe Chineke nọ, site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.
12
Ekwela ka mmehie na-achị anụ ahụ gị ọzọ, enyekwala onwe gị nꞌaka mmehie imezu agụụ ihe ọjọọ na-agụ gị.
13
Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile.
14
O kwesikwaghị ka ị bụrụ odibo mmehie ọzọ, nꞌihi na ugbu a ị nọkwaghị nꞌokpuru iwu, kama ị nọ nꞌokpuru amara.
15
Ka m jụọ gị ajụjụ. Ò ziri ezi na anyị ga-anọgide na-eme mmehie ebe anyị nọ ugbu a nꞌokpuru amara Chineke? Mba! Chineke ekwela.
16
Ọ bụ na unu amataghị na onye ọ bụla unu na-ejere ozi, na onye unu na-erubekwara isi bụ Onyenwe unu? Unu ka ọ dịrị ịhọrọ ịbụ ohu mmehie nke na-eduba nꞌọnwụ, ma ọ bụkwanụ irubere Chineke isi onye na-enye ndụ ebighị ebi.
17
Ekele dịrị Chineke nꞌihi na mbụ unu jiri aka unu họrọ ịbụ ohu mmehie, ma ugbu a, unu ekpebiela ịnabatara onwe unu ozizi ahụ Chineke nyefere nꞌaka unu.
18
Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site nꞌaka nna unu ukwu ochie bụ mmehie, unu abụrụla ndị ohu nke nna unu ukwu ọhụrụ, bụ ezi omume.
19
Eji m odibo na nna ya ukwu na-amara unu atụ nꞌihi na ọ ga-eme ka unu ghọta ihe m na-ekwu. Ya mere, dị ka unu si rubere mmehie isi, rụọ ọrụ ọjọọ nile ọ chọrọ na mbụ, sitekwanụ otu a jeere Chineke ozi, ịrụpụta ihe nile dị mma, na ihe dị nsọ na ndụ unu.
20
Na mgbe ochie ahụ, mgbe unu bụ odibo mmehie, ọ naghị agụ unu agụụ ime ihe ọ bụla dị mma.
21
Ma gịnị bụ uru unu nwetara nꞌọrụ ahụ nile unu rụrụ? Amaara m na ọ dịghị uru ọ bụla unu ritere. Nꞌihi na leenụ otu ihere si eme unu, mgbe ọ bụla unu chetara ndụ ochie unu ahụ. Unu makwaara na ọgwụgwụ ihe ndị ahụ nile bụ ọnwụ.
22
Ma ugbu a, ụmụnna m, unu abụkwaghị ohu mmehie, kama unu bụ ohu Chineke. Uru Chineke kwadoro na unu ga-erita nꞌọnọdụ ọhụrụ a, bụ ịdị nsọ na ndụ ebighị ebi.
23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16