bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 14
Romans 14
Igbo 1988
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 15 →
1
Nabatanụ ụmụnna ndị akọnuche ha na-esogbu ma ha soro ndị ọzọ okwukwe ha siri ike mee ihe ha na-eme. Unu ekwujọla ha, nꞌihi na ụzọ ha si ele ihe anya abụghị ụzọ unu si ele ya.
2
Nꞌihi na, dị ka ịma atụ, ọ dị ndị okwukwe ha siri ike, ndị kweere na ha nwere ike iri anụ ọ bụla. Ọ dịkwa ndị ọzọ okwukwe ha na-esighị ike ndị na-eri nanị ahihia nri.
3
Onye ahụ kpebiri nꞌobi ya iri ihe nile ekwesịghị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ kpebiri na ya agaghị eri ihe nile ekwesịghị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nꞌihi na Chineke anabatala onye ahụ.
4
Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nꞌihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.
5
E nwekwara ụfọdụ ndị Kraịst ndị na-eche na ọ dị otu ụbọchị dị nsọ karịa ụbọchị ndị ọzọ, ma ndị ọzọ na-eche na ụbọchị nile bụ nke Chineke. Nꞌụdị okwu dị otu a, ọ dị mma ka onye ọ bụla kpebiere onwe ya.
6
Ọ bụrụ na o nwere ụbọchị dị iche ị họpụtara dị ka ụbọchị dị nsọ karịa ibe ya, gaa nꞌihu mee ihe ị na-eme nꞌihi na ọ bụ otuto ka ị naenye Chineke. Ọ bụrụkwa na i kpebie nꞌobi gị ịta anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, gaa nꞌihu nꞌihe ị na-eme, ọ bụ ihe ziri ezi ka ị na-eme, ebe i nyere Chineke ekele nꞌihi anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na ị jụ iso taa ụdị anụ ahụ, i mere nke ọma, nꞌihi na echiche obi gị bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.
7
Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị ikpebi ma anyị ga-adị ndụ ma ọ bụ na anyị ga-anwụ. Ọ bụ nanị Chineke ka ọ dịrị ime ka anyị dị ndụ. Ọ bụkwa ya ga-eme ka anyị nwụọ.
8
Ma anyị na-adị ndụ, ma ọ bụ na anyị na-anwụ anwụ, anyị bụ nke Chineke.
9
Ọ bụ nꞌihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe anyị nꞌọnọdụ ọ bụla anyị nọ, ma ọ bụ na ndụ, ma ọ bụ nꞌọnwụ.
10
Ya mere, o kwesịghị ka i kwujọọ nwanna gị. O kwesikwaghị ka i leda ya anya. Nꞌihi na anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Chineke nꞌụbọchị ahụ ọ ga-ekpe ụwa ikpe.
11
Nꞌihi na Chineke kwuru nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ebe m na-adị ndụ, mmadụ nile nꞌotu nꞌotu aghaghị igbu ikpere nꞌala nye m. Mmadụ nile ga-ekwupụtakwa mmehie ha nꞌihu m.”
12
Ee, anyị nile nꞌotu nꞌotu ga-aza ajụjụ banyere ndụ anyị nꞌihu Chineke.
13
Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie.
14
Ma nꞌụche m, ana m ekwukwa ya nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs, o doro m anya na nri ọ bụla adịghị nke mmadụ na-ekwesịghị iri. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla ekpebie na ụfọdụ nri adịghị mma oriri, nri dị otu a bụụrụ onye ahụ nri na-adịghị ọcha.
15
Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nꞌanya ma ị gaa nꞌihu nọgide na-eri ihe ahụ. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe gaewetara nwanna gị ịla nꞌiyi, nꞌihi na cheta na ọ bụkwa nꞌihi ya ka Kraịst ji bịa nwụọ.
16
A sịkwarị na ihe ị na-eme dị mma, emela ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kwujọọ gị.
17
Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.
18
Nꞌihi na ọ bụrụ na i nye Kraịst ohere ka ọ bụrụ onye ga-ekpebi ụdị omume ị ga-eme, obi ga-atọ Chineke ụtọ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ya nꞌime gị.
19
Ka ihe naagụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe gaeweta udo na ime ihe nꞌụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.
20
Emebila ọrụ Chineke rụrụ nꞌihi ihe oriri. Cheta na nri nile dị ọcha dịkwa mma, ma erila nke ọ bụla ga-eme ka mmadụ mee mmehie.
21
Nꞌezie, ọ ga-aka mma ịhapụ iri ihe nile ga-eme ka nwanna anyị nwee obi ọjọọ, ma ọ bụ daba nꞌime mmehie.
22
Ka okwukwe i nwere banyere ihe dị mma oriri dịrị nꞌetiti gị na Chineke. Egosila ya nꞌebe ọ ga-ewute ndị ọzọ, na mmụọ ha. Ngọzi na-adịrị onye na-adịghị emehie nꞌihi na ọ maara na ihe bụ ezi ihe.
23
Ma onye ahụ maara na ihe ọ na-achọ ime bụ ihe ọjọọ ekwesịghị ime ya. Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ emee ya, ọ bụụrụ ya mmehie. Nꞌihi na ihe ọ bụla na-esiteghị nꞌokwukwe bụ mmehie.
← Chapter 13
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 15 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16