bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 10
Romans 10
Igbo 1988
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 11 →
1
Ụmụnna m, ọ na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwuu ịhụ na a zọpụtara ndị Juu. Nke a mere m ji ekpe ekpere banyere ha mgbe nile.
2
Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nꞌobi nke ukwuu. Kama ihe na-ewute m bụ na ịnụ ọkụ nꞌobi ha abụghị site na mmazu Chineke.
3
Nꞌihi na ha jụrụ ịnabata ụzọ ezi omume ahụ si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama ha nọgidere na-agbalịsi ike isite nꞌụzọ idebe iwu ndị Juu ịchọ ime ka Chineke nabata ha. Ma ụzọ ahụ abụghị ụzọ Chineke kwadoro isite ịzọpụta mmadụ.
4
Ha amaghị na Kraịst naenye ndị nile tụkwasịrị ya obi ihe nile ha chọrọ inweta site nꞌidebe iwu. Nꞌihi na ọbịbịa Kraịst mere ka ọgwụgwụ idebe iwu bụrụ ihe dị ire.
5
Nꞌihi na Mosisi kọwara ya nꞌụzọ doro anya sị, a ga-azọpụta onye na-edebe iwu nanị ma onye ahụ debezuo iwu nile na ndụ ya na-adaghị mba nꞌidebe ọ bụladị nanị otu iwu.
6
Ma nzọpụta ahụ si nꞌokwukwe rute mmadụ aka adịghị ajụ ajụjụ sị, “Ònye pụrụ irigo nꞌeluigwe ịchọta Kraịst kudata ya nꞌụwa ka o nyere anyị aka?”
7
Nzọpụta ahụ adịghị ajụkwa sị, “Ònye kwa pụrụ ịrịdata nꞌime ili, ime ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie dịrị ndụ ọzọ?”
8
Kama nzọpụta ahụ, nke okwukwe nꞌime Kraịst na-eweta na-agwa anyị sị, “Ozi ọma nzọpụta ahụ dị onye ọ bụla nso. Nꞌezie ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa ihe gbasara ya dị gị nꞌọnụ, dịkwa nꞌime obi gị.
9
Ọ na-ekwu sị, ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ọ bụrụkwa na ị ga-ekwere nꞌobi gị na Chineke mere ka Jisọs Kraịst si nꞌọnwụ bile, a ga-azọpụta gị.
10
Nꞌihi na ọ bụ nanị mgbe i kweere nꞌobi gị, na mgbe i ji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ka a ga-azọpụta gị.”
11
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ihere agaghị eme ya, bụ onye ọ bụla kweere na Jisọs Kraịst.”
12
Ozi a dịrị ndị Juu na ndị mba ọzọ. Nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌetiti ha. Ha nile nwere otu Chineke ahụ, Onyenwe ihe nile, onye na-agọzi onye ọ bụla na-akpọku ya.
13
Ya mere, onye ọ bụla na-akpọku aha Onyenwe anyị ka a ga-azọpụta.
14
Ma olee otu ha ga-esi kpọkuo aha ya ma ọ bụrụ na ha ekwereghị na ya? Olee otu ha ga-esi kwere nꞌonye ahụ ha na-anụbeghị ihe gbasara ya? Olee otu ha ga-esi nụkwa ma ọ bụrụ na ndị nkwusa adịghị?
15
Oleekwanụ otu mmadụ ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ya? Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ sịrị, “Lee ka ọbịbịa ndị na-ekwusa ozi ọma udo nke dị nꞌetiti Chineke na mmadụ si maa mma.”
16
Ma ọ bụghị ndị nile nụrụ ozi ọma a na-anabata ya. Aịzaya onye amụma kwuru nꞌoge ya sị, “Onyenwe anyị, onye kwanụ nꞌetiti ha bụ onye kweere nꞌihe m kwusara?”
17
Ma ọ bụ ihe doro anya na ọ bụ site nꞌige ntị nꞌozi ọma a ka mmadụ ji ekwere. Ozi ọma bụkwanụ ikwusa Jisọs Kraịst.
18
Ị̀ na-eche na ndị Juu anụghị ozi ọma mgbe e kwusara ya? Nꞌezie, ha nụrụ ya. “Nꞌihi na ụwa nile anụla olu ndị na-ekwusa ozi ọma a. Ihe ha na-ekwusa eruola nꞌebe ụwa sọtụrụ.”
19
O dokwara ndị Juu anya na ọ bụrụ ha ha ajụ ịnabatara onwe ha ụzọ nzọpụta a, na Chineke ga-ewere ya nye ndị ọzọ. Nꞌihi na Mosisi kwuru sị na Chineke ga-akpasu ndị Juu iwe mee ka ha kwosi ndị mba ọzọ ekworo, nꞌihi nzọpụta ọ ga-enye ndị mba ọzọ.
20
Otu a kwa Chineke kwukwara okwu site nꞌọnụ Aịzaya onye amụma sị, “Ndị gaachọta m bụ ndị ahụ na-adịghị achọ m. Ọ bụkwa ha ka m ga-eme ka ha mata onye m bụ.”
21
Ma banyere ndị Juu Chineke kwuru okwu sị, “Agbasara m aka m ehihie na abalị nye ụmụ na-adịghị asọpụrụ nna ha, ma ha jụkwara ịbịakwute m.”
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16