bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 1988
/
Romans 9
Romans 9
Igbo 1988
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
1
Ihe m na-agwa unu bụ eziokwu dị ka onye Kraịst nke m bụ. Ekwughị m okwu ụgha. Mmụọ m, nke Mmụọ Nsọ na-achị, na-agbakwara m ama, na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu.
2
Ihe banyere ọnọdụ ụmụnna m ndị Juu na-ewute m nnọọ nke ukwu. Ana m anọ nꞌobi ọjọọ ehihie na abalị nꞌihi ha.
3
A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe mee, ejikeere m ịbụ onye Chineke bụrụ ọnụ na onye a ga-ewepụ site nꞌebe Kraịst nọ, ma ọ bụrụ na nke a ga-enyere ụmụnna m ndị Juu a aka ịmata Kraịst, na ịnabata ya nye onwe ha.
4
Nꞌihi na ndị Juu bụ ndị Chineke nyere ọtụtụ onyinye. Chineke mere ha ụmụ ya, mee ka ha keta oke nꞌebube ya. O nyere ha ọgbụgba ndụ ya, na iwu ya. O kwenyere ka ha fee ya ofufe, ma kwekwa ha nkwa ihe dị ukwuu ọ ga-emere ha.
5
Ndị a maara aha ha dị ka ndị ha na Chineke nwere mmekọ ka nna nna ha bụ. Kraịst nꞌonwe ya, site nꞌọmụmụ nke anụ ahụ, sikwa nꞌetiti ha bịa. Ee, Kraịst ahụ, onye bụ Chineke na-achị ihe nile ugbu a. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe ebighị ebi. Amin.
6
Ugbu a, ọ̀ ga-abụ na nkwa Chineke kwere ndị Juu enwekwaghi isi? Mba! Nꞌihi na nkwa ahụ dịrị nanị ndị bụ ndị Juu nꞌezie. Ọ bụkwaghị onye ọ bụla a mụrụ nꞌezinụlọ ndị Juu bụ onye Juu.
7
Na mmadụ sitere nꞌagbụrụ Eberaham pụta emeghị ka ọ bụrụ nwa Eberaham nꞌezie. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ gwara anyị na nkwa ahụ Chineke kwere Eberaham dịrị nanị Aizik na ụmụ ya, Ọ bụ ezie na Eberaham mụtakwara ụmụ ọzọ.
8
Nke a na-egosi na ọ bụghị ụmụ nile a mụrụ nꞌezinụlọ Eberaham bụ ụmụ Chineke. Kama ndị bụ ụmụ Chineke bụ ụmụ Eberaham ndị kweere nkwa nzọpụta ahụ Chineke kwere Eberaham.
9
Lee ka e si kwe nkwa ahụ, “Mgbe oge ahụ a kara aka ruru, aga m alọghachi, Sera ga-amụkwa nwa nwoke.”
10
Ọ bụghị nanị nke a. Aizik toro bụrụ dimkpa, lụọ nwụnye. Mgbe oge ruru ka Rebeka nwụnye ya mụọ nwa, Chineke ziri ha ozi gwa ha na Rebeka gaamụ ụmụ ejima. Chineke gwara Rebeka na Ịsọ, nwa ọ ga-ebu ụzọ mụpụta, ga-abụ odibo Jekọb nwanne ya nke ga-apụta mgbe Ịsọ pụtasịrị.
11
Nꞌakwụwkọ nsọ, Chineke kwuru sị, “Ekpebiela m igọzi nanị Jekọb, ọ bụghị Ịsọ.” Chineke kwuru okwu tupuu a mụọ ụmụ ahụ. O kwuru okwu a tupuu ha etoo, mee ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ọ bụla. Nke a gosiri na Chineke mere ihe o kpebiri na ọ ga-eme site na mmalite. Mkpebi Chineke adabereghị nꞌihe ụmụaka ahụ mere, kama ọ dabeere nꞌihe Chineke chọrọ.
15
Nꞌihi na Chineke gwara Mosisi sị, “Nanị onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ inwe ọmiko nꞌahụ ya ka m gaenwe ọmiko.”
16
Ya mere, Chineke anaghị agọzi mmadụ nꞌihi na onye ahụ chọrọ ka ọ gọzie ya. Ọ naghị agọzi mmadụ nꞌihi na onye ahụ rụsịrị ọrụ ike. Kama ndị Chineke na-agọzi bụ ndị o kpebiri nꞌonwe ya igọzi, ndị o kpebiri imere ebere.
17
Fero bụ onye akwụkwọ nsọ ji maa atụ banyere mmeso Chineke na-emeso ndị mmadụ. Nꞌakwụwkọ nsọ, Chineke gwara Fero sị, “Emere m ka ị bụrụ eze nꞌihi na achọrọ m isite nꞌihe ọjọọ ị na-eme zipụta ike m, ka ụwa nile nụ ihe banyere m.”
18
Ọ pụtara ìhè na ọ bụ nanị ndị Chineke chọrọ ka ọ na-emere ebere, ndị ọ chọkwara ka ọ na-eme ka ha bụrụ ndị isi ike.
19
Ma eleghị anya ajụjụ ị ga-ajụ bụ nke a, “Gịnịkwanụ mere Chineke ji na-ata ndị na-adịghị eme ihe ọ chọrọ ụta, ebe ọ bụ na ha na-eme ihe dị ka o si kee ha?”
20
Ajụkwala ụdị ajụjụ ahụ! Onye ka ị bụ i ji ajụ Chineke ajụjụ? Nkata mmadụ na-akpa ọ ga-ajụ onye na-akpa ya ajụjụ sị, “Ònye sị gị kpaa m otu a?”
21
Otu a kwa, ọ̀ bụghị onye na-akpụ ite ka ọ dịrị ikpebi iji ụrọ o nwere kpụọ ụdị ite ọ bụla masịrị ya, ite mara mma e ji eku mmiri, ma ọ bụ ite e ji ekpofu unyi?
22
Nꞌụzọ dị otu a, Chineke emeghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na o kpebiri igosi ike ya na iwe ya site nꞌịla ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ nꞌiyi, ebe ha na-adịghị eche uche banyere ndidi na ntachi obi Chineke ji anagide ajọ omume ha.
23
Chineke na-emekwa ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na o kpebie iji ndị dị ka anyị, o mere ka anyị jupụta nꞌebube ya, mee ihe nlere anya nye ndị ọzọ, ma anyị bụ ndị Juu, ma ọ bụ ndị mba ọzọ, igosi ha otu o si emere anyị ebere.
25
Chineke sitere nꞌọnụ onye dere akwụkwọ Hosiya kwuo okwu sị, “Aga m achọtara onwe m ndị ọzọ ga-abụ ụmụ m, ndị na-esiteghị nꞌagbụrụ ndị Juu. Aga m ahụ ndị a nꞌanya, bụ ndị onye ọ bụla na-egosibeghị ịhụnanya mgbe ọ bụla.”
26
Chineke kwukwara okwu sị, na ndị mba ọzọ ahụ a gwara na ha abụghị ndị Chineke, ka a gaakpọkwa ụmụ Chineke dị ndụ.
27
Aịzaya onye amụma kwara akwa nꞌihi ụmụ Izirel sị, “Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ụmụ Izirel ga-adị ka ụzụzụ dị nꞌakụkụ osimiri, ma ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ka a ga-azọpụta.
28
Nꞌihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ikpe ahụ ga-adịkwa egwu. Ọ gaekpe ya ọsịịsọ.”
29
Nꞌebe ọzọ kwa, nꞌakwụkwọ nsọ, Aịzaya onye amụma kwuru sị, “Ọ bụrụ na Chineke abụghị onye obi ọma, ndị Juu nile gaara ala nꞌiyi dị ka e si laa ndị nile bi nꞌobodo Sodọm na Gomora nꞌiyi.”
30
Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a? Anyị ga-asị na Chineke enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ọ bụla ha ji obi ha chọọ Chineke, ohere ịbụ ndị a ga-anabata site nꞌokwukwe,
31
ma ndị Juu nọ kemgbe na-agbalisi ike ime ka ha na Chineke dịrị nꞌudo site nꞌidebe iwu, enwebeghị ike ime onwe ha ndị Chineke ga-anabata?
32
Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nꞌihi na ha achọghị isite nꞌokwukwe bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Ha chere na ha pụrụ isite nꞌịrụ ọrụ ọma bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Site nꞌụzọ dị otu a, ha abụrụla ndị sụrụ ngọngọ nꞌoke nkume ịsụ ngọngọ ahụ.
33
Nꞌihi na Chineke dọrọ ha aka na ntị sị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn oke nkume ga-eme ka ụmụ mmadụ sụọ ngọngọ. Ọtụtụ mmadụ ka nkume a ga-eme ka ha daa (oke nkume a bụ Jisọs Kraịst). Ma onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi, ihere agaghị eme ya.”
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16