bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 10
Ezekiel 10
Igbo 2006
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 11 →
1
M'we hu, ma, le, nime mbara-ígwé ahu nke di n'elu isi cherubim, ihe dika nkume sapphire, dika oyiyi oche-eze si di n'ile ya anya, ka ahuru n'elu ha.
2
O we gwa nwoke ahu nke yiri uwe ọcha okwu, si, Ba n'etiti ihe ahu nākpọre, n'okpuru cherub, kpojue icheku ọku nēre ere n'aka-gi abua site n'etiti cherubim, fesa ha n'elu obodo a. O we ba n'etiti ha n'anyam.
3
Ma cherubim ahu nēguzo n'aka-nri nke ulo ahu, mb͕e nwoke ahu bàra; igwe-oji ahu juputa-kwa-ra ogige di nime.
4
Ebube Jehova we si n'elu cherub rigo, guzo n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu; ulo ahu we juputa n'igwe-oji ahu; ogige-ya juputa-kwa-ra n'onwunwu-ìhè nke ebube Jehova.
5
Anu-kwa-ra olu nkù nile nke cherubim rue ogige di n'èzí, dika olu nke Chineke Nke puru ime ihe nile mb͕e Ọ nēkwu okwu.
6
O rue, mb͕e O nyere nwoke ahu nke yiri uwe ọcha iwu, si, Si n'etiti ihe nke nākpọre, si n'etiti cherubim, guputa ọku, na ọ bàra, guzo n'akuku wheel.
7
Cherub ahu we si n'etiti cherubim setipu aka-ya rue ọku ahu nke di n'etiti cherubim, were ufọdu tiye n'aka abua nke onye ahu nke yiri uwe ọcha, o we were ya pua.
8
Ewe hu n'aru cherubim udi nke aka madu n'okpuru nkù-ha.
9
M'we hu, ma, le, wheel anọ di n'akuku cherubim, otù wheel di n'akuku otù cherub, otù wheel di n'akuku otù cherub: wheel ahu n'ile ha anya di ka ib͕u-maramara nkume beryl si di.
10
Ma dika ha si di n'ile ha anya, otù oyiyi ka ha anọ nwere, dika agāsi na wheel di n'etiti wheel.
11
Mb͕e ha nāga, n'akuku anọ ha ka ha nāga: ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga, kama n'ebe ahu nke isi-ha nēche iru, n'azu ya ka ha nāga; ha adighi-agha anya n'azu mb͕e ha nāga.
12
Anu-aru nile ha na azu-ha na aka-ha na nkù-ha na wheel-ha juputara n'anya anya buruburu, ọ bu ha anọ ka wheel nile ha diri.
13
Ma wheel anọ ahu, ha ka anākpọ na ntim abua, Ihe nākpọre.
14
Ma iru anọ diri cherub ọ bula nime ha: otù iru bu iru cherub ahu, iru nke-abua bu iru madu, nke-atọ bu iru ọdum, nke-anọ bu iru ugo.
15
Cherubim we bulie onwe-ha elu: nka bu ihe ahu nke di ndu nke m'huru n'akuku osimiri Keba.
16
Ma mb͕e cherubim nāga, wheel-ha nāga n'akuku ha: ọzọ, mb͕e cherubim nāchili nkù-ha isi n'elu uwa bulie onwe-ha elu, wheel-ha adighi-esi kwa n'akuku ha chigharia.
17
Mb͕e cherubim nēguzo, wheel nēguzo; mb͕e cherubim nēbuli onwe-ha elu, wheel soro ha buli onwe-ha elu: n'ihi na Mọ nke ihe ahu di ndu di nime ha.
18
Ebube Jehova we si n'elu nbata-uzọ nke ulo ahu pua, guzo n'elu cherubim.
19
Cherubim we chilie nkù-ha, si n'ala bulie onwe-ha elu n'anyam mb͕e ha puru, wheel nile ha di kwa n'akuku ha: ha we guzo n'oghere nke ọnu-uzọ-ama Iru-anyanwu nke ulo Jehova; ebube nke Chineke nke Israel di n'elu ha n'elu.
20
Nka bu ihe ahu di ndu nke m'huru n'okpuru Chineke nke Israel n'akuku osimiri Keba; m'we mara na cherubim ka ha bu.
21
Iru anọ iru anọ diri cherub ọ bula, nkù anọ di-kwa-ra cherub ọ bula; oyiyi nke aka madu di kwa n'okpuru nkù-ha.
22
Ma oyiyi nke iru-ha, ha onwe-ha bu iru nke m'huru n'akuku osimiri Keba, ka ha si di n'ile ha anya na ha onwe-ha; ha nāga n'iru, onye ọ bula na ncherita-iru ya.
← Chapter 9
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 11 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48