bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 26
Ezekiel 26
Igbo 2006
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 27 →
1
O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si,
2
Nwa nke madu, n'ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n'ebe m'nọ: m'gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe:
3
n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.
4
Ha gēbibi kwa mb͕idi nile nke Taia, kwatue ulo-elu-ya nile: M'gākọchapu kwa ájá-ya n'aru ya, me ya ka ọ ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya.
5
Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n'etiti oké osimiri; n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha.
6
Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n'ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
7
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.
8
Umu-gi ndinyom ndi nọ n'ọhia ka ọ gēji mma-agha b͕u: ọ gēwu kwa ulo-agha megide gi, wukọta obo-ihe imegide gi, welie ọta uku imegide gi.
9
Ọzọ, ihe-ya eji akwatu mb͕idi ka ọ gādọba imegide mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo-elu-gi nile ka o gēji mma-agha-ya kwada.
10
Site n'ìgwè inyinya-ya ájá-ha gēkpuchi gi: site n'olu ndi-inyinya, na nke wheel nākpọre akpọre, na nke ub͕ọ-ala, mb͕idi-gi nile gēme nkpatu, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, dika esi abata n'obodo nke ab͕awara ab͕awa.
11
O gēji ukwu inyinya-ya nile zọtọ èzí-gi nile: ndi-gi ọ gēji mma-agha b͕u, ogidi nile nke ike-gi gārida n'ala.
12
Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.
13
M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.
14
M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri Taia: Ọ̀ bughi site n'olu ọdida-gi, mb͕e ndi emeruru emeru nāsu ude, mb͕e anēb͕u eb͕u nke-uku n'etiti gi, ka agwe-etiti nile nēme nkpatu?
16
Ndi-isi nile nke oké osimiri gēsi n'oche-eze-ha ridata, chizuga uwe-nwuda-ha, ọ bu kwa uwe nile ha akpara nke-ọma ka ha gēyipu: ọma-jijiji nile ka ha gēyibe dika uwe; n'ala ka ha gānọdu, ma jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, ihe-gi gēju kwa ha anya.
17
Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n'iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n'oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n'oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha!
18
Ub͕u a ka agwe-etiti gāma jijiji n'ubọchi ọdida-gi; e, ibobo gānwu agwe-etiti nile nke di n'oké osimiri n'aru n'ọpupu-gi.
19
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M'gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi;
20
M'gēme kwa ka i rida, gi na ndi nārida n'olùlù, ijekuru ndi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, M'gēme kwa ka i bi n'ala di n'okpuru uwa, n'ebe di nkpọnkpọ site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, gi na ndi nārida n'olùlù, ka madu we ghara ibi nime gi; M'gētiye kwa ima-nma n'ala ndi di ndu:
21
ihe-ima-jijiji ka m'gēme gi ka i buru, i gaghi-adi kwa ọzọ: agāchọ kwa gi, ma agaghi-achọta kwa gi ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
← Chapter 25
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 27 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48