bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 24
Ezekiel 24
Igbo 2006
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 25 →
1
Okwu Jehova we ruem nti n'arọ nke-iteghete, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri nke ọnwa ahu, si,
2
Nwa nke madu, dere onwe-gi aha nke ubọchi a, bú ubọchi nke ta: eze Babilon kwagidere Jerusalem n'ubọchi nke ta.
3
Tu-kwa-ra ulo nnupu-isi ahu ilu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Sikwasi ite ahu, sikwasi ya, ọzọ kwa, b͕aye ya miri:
4
chikọta anu-ya abọrọ abọ nime ya, bú ọbubọ ọ bula di nma, utaku-ukwu, na ọlu-aka; kpojue ya n'ọkpukpu arọputara arọputa.
5
Were aturu arọputara arọputa n'ìgwè ewu na aturu, tukọba kwa ọkpukpu n'okpuru ya: me ya ka ọ b͕ọ nke-ọma; ka esi kwa ọkpukpu-ya nile n'etiti ya.
6
N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu, bú ite nke nchara-ya di nime ya, nke nchara-ya nāpughi nime ya! weputa ya n'ọbubọ n'ọbubọ; nzà amaghi ya.
7
N'ihi na ọbara-ya adiwo n'etiti ya; n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya ka ọ debere ya; ọ wusighi ya n'ala, ikpuchi ya ájá;
8
ka o we me ka ọnuma rigota ibọ̀ ọ́bọ̀, ya ka M'ji tiye ọbara-ya n'elu nkume di elu nke ọhia nādighi ya, ka ewe ghara ikpuchi ya.
9
N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ahuhu diri obodo ọbara ahu! Mu onwem gēme kwa ka obo-ya di uku.
10
Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile.
11
Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.
12
O jiwo ndọbu nile ọ nādọbu onwe-ya n'ọlu me ka ike gwu ya: ma nchara-ya nke riri nne esighi nime ya pua; n'ọku ka nchara-ya di.
13
N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.
14
Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M'gēme kwa ya; M'gaghi-arapu, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15
Okwu Jehova we ruem nti, si,
16
Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.
17
Ze ume, debe ọnu-gi du; i gaghi-emere ndi nwuru anwu oruru-újú, ke ihe-ike-n'isi-gi n'onwe-gi, akpukpọ-ukwu-gi ka i gētiye kwa n'ukwu-gi abua, i gaghi-ekpuchi kwa eb͕ub͕ere-ọnu-elu-gi, i gaghi-eri kwa nri ndi ọzọ.
18
M'we gwa ndi Israel okwu n'ututu; nwunyem we nwua n'anyasi: m'we me n'ututu dika ihe ahu si di enyerem n'iwu.
19
Ndi Israel we sim, Ì gaghi-egosi ayi ihe ihe ndia bu n'ebe ayi nọ, na gi onwe-gi nēme otú a?
20
M'we si ha, Okwu Jehova rurum nti, si,
21
Si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ebe nsọm ghara idi nsọ, bú ihe-npako nke ike-unu, na ihe anya-unu abua nāchọsi ike, na ihe nke nkpuru-obi-unu nwere ọmiko n'aru ya; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom, ndi unu rapuworo, gāda kwa site na mma-agha.
22
Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.
23
Ihe-ike-n'isi-unu gādi kwa unu n'isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n'ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n'obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n'ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude.
24
Ezikiel ewe ghọrọ unu ihe-ebube; dika ihe nile nke o meworo si di, otú a ka unu gēme: mb͕e nka gābia, unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.
25
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi mb͕e M'napuru ha ebe-ha siri ike, bú ihe-obi-utọ nke ima-nma-ha, na ihe anya-ha abua nāchọsi ike, na ihe ha buliworo nkpuru-obi-ha nye, bú umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,
26
ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi ahu na onye b͕apuru ab͕apu gābiakute gi, ime ka i were nti-gi abua nu ya?
27
N'ubọchi ahu ka agāsaghe ọnu-gi n'ebe onye b͕apuru ab͕apu nọ, i gēkwu kwa okwu, ghara ida kwa ob͕i ọzọ: i we ghọrọ ha ihe-ebube; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
← Chapter 23
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 25 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48