bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 44
Ezekiel 44
Igbo 2006
← Chapter 43
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 45 →
1
O we me ka m'laghachi n'uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n'èzí, nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi.
2
Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi.
3
Ma onye-isi-unu, dika onye-isi ka ya onwe-ya gānọdu ala nime ya iri nri n'iru Jehova; ọ gēsi uzọ nke uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama nka bata, si kwa uzọ-ya pua.
4
O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala.
5
Jehova we sim, Nwa nke madu, tukwasi obi-gi, were anya-gi abua hu, were nti-gi abua nu ihe ahu nile nke Mu onwem nāgwa gi bayere ukpuru nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra iwu-ya nile; tukwasi kwa obi-gi na nbata ulo a, ya na ọpupu nile nke ebe nsọ a.
6
I gāsi kwa ndi nānupu isi, bú ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, site n'ihe-árú nile unu,
7
ebe unu meworo ka ndi ala ọzọ bata, bú ndi anēbighi úgwù n'obi anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, inọ n'ebe nsọm, ime ka ọ ghara idi nsọ, bú ulom, mb͕e unu nēweta nrim nso, bú abuba na ọbara, ha we mebie ọb͕ub͕a-ndum, tiyere ihe-árú nile unu.
8
Unu edebeghi kwa ihe-ndebe nke ihe nsọm nile: unu we do ha ndi nēdebe ihe-ndebem n'ebe nsọm nye onwe-unu.
9
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ dighi onye ala ọzọ, nke anēbighi úgwù n'obi nke anēbighi kwa úgwù n'anu-aru, gābata n'ebe nsọm, bú onye ala ọzọ ọ bula nke di n'etiti umu Israel.
10
Otú ọ di, ndi Livai ndi si n'ebe M'nọ je n'ebe di anya, mb͕e Israel kpafuru akpafu, ndi siri n'ebe M'nọ kpafue so arusi nile ha; ha aghaghi ibū kwa ajọ omume-ha.
11
Ma ha gābu ndi nēje ozi n'ebe nsọm, ndi-nlekọta n'ọnu-uzọ-ama nile nke ulo nkem, nēje kwa ozi n'ulo ahu: ha onwe-ha gēb͕uru ndim anu àjà-nsure-ọku-ha na nke àjà ọzọ ha, ha onwe-ha gēguzo kwa n'iru ha ijere ha ozi.
12
N'ihi na ha nējere ha ozi n'iru arusi nile ha, we ghọrọ ulo Israel ihe-isu-ngọngọ nke ajọ omume; n'ihi nka ka M'weliri akam imegide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ha gēbu kwa ajọ omume-ha.
13
Ma ha agaghi-abiakutem nso, iburum ndi-nchu-àjà, na ibiaru ihe nsọm nile nso, bú ihe nile di nsọ kachasi ihe nsọ nile: ma ha gēbu ọnọdu-ihere-ha, na ihe-árú nile ha nke ha meworo.
14
Ma M'gēme ha ndi nēdebe ihe-ndebe nke ulo a, ifè òfùfè-ya nile, na ime ihe ọ bula nke agēme nime ya.
15
Ma ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, umu Zedok, ndi debere ihe-ndebe nke ebe nsọm mb͕e umu Israel siri n'ebe M'nọ kpafue, ndi ahu gābiakutem nso ijerem ozi; ha gēguzo n'irum iweta nsom abuba na ọbara; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta:
16
ha onwe-ha gābata n'ebe nsọm, ha onwe-ha gābiaru kwa table nkem nso, ijerem ozi, ha gēdebe kwa ihe-ndebem.
17
O gēru kwa, mb͕e ha batara n'ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na ọ bu uwe flax ka ha gēyi; ọ dighi kwa uwe aji-anu gābiakwasi n'aru ha, mb͕e ha nēje ozi n'ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime, na nime ulo.
18
Ihe-ike-n'isi nke flax gādi n'isi-ha, uwe-ukwu nke flax gādi kwa n'úkwù-ha, ha agaghi-eji ihe nākpata ọsusọ ke onwe-ha n'úkwù.
19
Ma mb͕e ha nāpu n'ogige di n'èzí, bú ogige di n'èzí ipukuru ndi Israel, ha gēyipu uwe nile ha, nke onwe-ha nēje ozi nime ha, ha gādọba kwa ha n'ime-ulo nsọ ndia, yiri uwe ọzọ, ka ha we ghara iji uwe-ha do ndi Israel nsọ.
20
Ha agaghi-akọpu kwa isi-ha, ha agaghi-eme kwa ka agiri-isi-ha to ogologo; nání nkpacha ka ha gākpacha isi-ha.
21
Ọ dighi kwa manya-vine onye-nchu-àjà ọ bula gāṅu, mb͕e ha nābata n'ogige di nime.
22
Ọ dighi kwa nwanyi nke di-ya nwuru, ma-ọbu nwanyi nke achupuru achupu, ka ha gālu na nwunye: kama umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke ndi sitere na nkpuru ulo Israel, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru nke bu nwunye onye-nchu-àjà nwuru anwu, ka ha gālu.
23
Ọ bu kwa ndim ka ha gēzí ihe di iche n'etiti ihe nsọ na ihe nādighi nsọ, ọ bu kwa ihe di iche n'etiti ihe di ọcha na ihe ruru árú ka ha gēme ka ha mara.
24
Ọzọ, n'ise-okwu ọ bula ndi ahu gēguzo ikpe ikpe; ikpém nile ka ha gēji kpe ya: ọ bu kwa iwum nile na ukpurum nile nime mb͕em nile akara àkà ka ha gēdebe; ubọchi-izu-ikem nile ka ha gēdo nsọ.
25
Ọ dighi kwa madu nke nwuru anwu ka ha gābiaru nso imeru onwe-ha: ma otú ọ di, ha gēmeru onwe-ha n'ihi nna, na n'ihi nne, na n'ihi nwa-nwoke, na n'ihi nwa-nwanyi, na n'ihi nwa-nne-nwoke, na n'ihi nwa-nne-nwanyi nke nēnweghi di.
26
Mb͕e emesiri ka ọ di ọcha, ọ bu kwa ubọchi asa ka agāguru ya.
27
Ma n'ubọchi ọ gābata n'ebe nsọ, n'ogige di nime, ije ozi n'ebe nsọ, ọ gēweta àjà-nmehie-ya nso; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
28
Ọ gāghọ-kwa-ra na ihe-nketa; Mu onwem bu ihe-nketa-ha: ọ dighi kwa ihe-onwunwe unu gēnye ha n'Israel; Mu onwem bu ihe-onwunwe-ha.
29
Onyinye-inata-iru-ọma na àjà-nmehie na àjà-ikpe-ọmuma ka ndi ahu gēri; ọzọ, ihe nile ọ bula nke ewezugara nye Chineke n'Israel, ha gēnwe ya.
30
Ọzọ, ihe mbu nke nkpuru mbu nile nke ihe ọ bula, àjà-nbuli ọ bula nke ihe ọ bula, site n'àjà-nbuli nile unu, ndi-nchu-àjà gēnwe ya: ọ bu kwa utu ọka mbu unu ka unu gēnye onye-nchu-àjà, ime ka ngọzi dakwasi n'ulo-gi.
31
Ihe ọ bula nke nwuru n'onwe-ya, na ihe adọb͕uru adọb͕u, ma ọ bu anu-ufe ma-ọbu anumanu, ndi-nchu-àjà agaghi-eri ya.
← Chapter 43
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 45 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48