bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 32
Ezekiel 32
Igbo 2006
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 33 →
1
O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
2
Nwa nke madu, buliere Fero, bú eze Ijipt, abù-ákwá, si ya, Nwa-ọdum nke mba nìle ka i yiworo: ma gi onwe-gi di ka ogologo anu n'oké osimiri nile; i we waputa n'osimiri-gi nile, ji ukwu-gi, b͕arua miri, zọrua osimiri nile ha.
3
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gāchiri nkpọkọta ọtutu ndi di iche iche b͕asa ub͕um n'elu gi; ha gādọgota kwa gi n'ub͕um.
4
M'gātusa kwa gi n'ala-gi, n'ọhia ka M'gētufu gi, me kwa ka anu-ufe nile nke elu-igwe bekwasi gi, M'gēme kwa ka anu-ọhia nke uwa nka nile riju afọ site n'anu-aru-gi.
5
M'gētiyekwasi kwa anu-aru-gi n'ugwu nile, were kwa idi-elu-gi mejue ndagwurugwu nile.
6
M'gēde kwa ọbara-gi n'ala dika miri, bú ebe i nēgwu miri, rue ugwu nile; ebe nile miri si erù gējuputa na gi.
7
Mb͕e M'nēmenyu gi, M'gēkpuchi elu-igwe, me ka kpakpando nile ha jie nji; anyanwu ka M'gēkpuchi n'igwe-oji, ọnwa agaghi-enye kwa ìhè-ya.
8
Ihe nile nke nēnye ìhè n'elu-igwe ka M'gēme ka ha jie nji n'elu gi, M'gētiyekwasi kwa ọchichiri n'ala-gi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
9
M'gākpasu kwa obi nke ọtutu ndi di iche iche, mb͕e M'gēme ka ntipia-gi bia n'etiti mba nile, rue ala di iche iche nke i nāmaghi.
10
M'gēme kwa ka i ju ọtutu ndi anya, ndi-eze-ha gāma jijiji bayere gi nke-uku, mb͕e M'gēfeghari mma-agham n'iru ha; ha gāma kwa jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, onye ọ bula n'ihi ndu-ya, n'ubọchi nke ọdida-gi.
11
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mma-agha nke eze Babilon gābiakwasi gi.
12
ọ bu site na mma-agha nile nke ndi-dike ka M'gēme ka ìgwè ndi-gi da; ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji ka ha nile bu: ọ bu kwa ihe-npako nke Ijipt ka ha gāpunara ya, ewe kpochapu ìgwè ndi-ya nile.
13
M'gēme kwa ka anumanu-ya nile si n'akuku ọtutu miri la n'iyì; ukwu madu agaghi-ab͕aru kwa ha ọzọ, ukwu anumanu agaghi-ab͕aru kwa ha.
14
Mb͕e ahu ka M'gēme ka miri-ha do, me kwa ka osimiri nile ha rùe erù dika manu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15
Mb͕e m'gēme ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, ala b͕a aka n'ihe juru ya-ri, mb͕e M'gētib͕u ndi nile bi ya, ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
16
Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
17
O rue, n'arọ nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-iri-na-ise ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
18
Nwa nke madu, bùara ìgwè ndi Ijipt abù ákwá, me ka ha rida, ya na umu-ndinyom nke mba di iche iche di ebube, rue ala di n'okpuru uwa, ha na ndi nārida n'olùlù.
19
Ònye ka i tọkariri n'utọ? rida, ka eme kwa ka i soro ndi anēbighi úgwù dina.
20
N'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u ka ha gāda: ewerewo ya nye mma-agha: kpupunu ya na ìgwè ndi-ya nile.
21
Ndi di ike nke ndi-dike gēsi n'etiti ala-mọ gwa ya okwu, ha na ndi nēyere ya aka: ha aridawo, ha edinawo ala, bú ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u.
22
N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:
23
ndi etiyere ílì nile ha na nsọtu nile nke olùlù, nkpọkọta ndi-ya di ílì-ya buruburu: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, bú ndi mere ka ujọ di n'ala ndi di ndu.
24
N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
25
N'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka ha nyeworo ya ihe-ndina n'etiti ìgwè ndi-ya nile; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na emere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, ha we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù: n'etiti ndi eb͕uru eb͕u ka etiyeworo ya.
26
N'ebe ahu ka Meshek na Tubal na ìgwè ndi-ya nile nọ; n'ebe nile nke di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi anēbighi úgwù, ndi ejiri mma-agha b͕u; n'ihi na ha mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu.
27
Ha agaghi-esoro ndi-dike dina, bú ndi dara ada site na ndi anēbighi úgwù, ndi ridaworo n'ala-mọ chiri ihe-agha-ha, ha we tọb͕ọrọ mma-agha-ha n'okpuru isi-ha, ajọ omume nile ha dikwasi n'ọkpukpu-ha; n'ihi na ujọ ndi-dike ka ha bu n'ala ndi di ndu.
28
Ma gi onwe-gi, n'etiti ndi anēbighi úgwù ka agētipia gi, i gēso kwa ndi ejiri mma-agha b͕u dina.
29
N'ebe ahu ka Edom na ndi-eze-ya na ndi-isi-ya nile nọ, ndi atọb͕ọworo n'idi-ike-ha n'etiti ndi ejiri mma-agha b͕u: ndi ahu gēsoro ndi anēbighi úgwù, so kwa ndi nārida n'olùlù, dina.
30
N'ebe ahu ka ndi-isi Ugwu nọ, ha nile, na ndi Zaidon nile, ndi soro ndi eb͕uru eb͕u rida; n'ujọ-ha nke ha mere ka atua site n'idi-ike-ha ka ihere nēme ha; ha ewe soro ndi ejiri mma-agha b͕u dina n'ebighi-úgwù, būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.
31
Ndi ahu ka Fero gāhu, ewe kasie ya obi bayere ìgwè ndi-ya nile: ha bu ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na usu-ndi-agha-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
32
N'ihi na emewom ka ujọ-ya di n'ala ndi di ndu: agēme kwa ka o dina n'etiti ndi anēbighi úgwù, ya na ndi ejiri mma-agha b͕u, bú Fero na ìgwè ndi-ya nile; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 33 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48