bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 45
Ezekiel 45
Igbo 2006
← Chapter 44
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 46 →
1
Ma mb͕e unu gēme ka ala-unu dayere onwe-unu n'ihe-nketa, unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli, bú otù òkè di nsọ nke ala ahu: ogologo-ya gādi orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi kwa orú nnù na nnù ise: ihe nsọ ka ọ gābu n'ókè-ala-ya nile buruburu.
2
Site n'ala nka nnù ami na ọgu n'ogologo na nnù na ọgu ise n'obosara gādiri ebe nsọm, ọ gēnwe akuku anọ rara nrata buruburu; ma ọgu cubit abua na iri gāburu ya ebe-ita-nri buruburu.
3
Site n'ọtùtù a ka i gātù kwa, ogologo nke gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, na obosara nke gādi orú nnù ami na nnù ise: ọ bu kwa nime ya ka ebe nsọ, nke bu ebe di nsọ kachasi ebe nsọ nile, gādi.
4
Òkè nsọ nke ala ahu ka ọ bu; ndi-nchu-àjà, bú ndi-oje-ozi nke ebe nsọ, gēnwe ya, bú ndi nābia nso ijere Jehova ozi; ọ gābu-kwa-ra ha ebe ulo nile ha gādi, na ebe nsọ diri ebe nsọ nkem.
5
Orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami na nnù ise n'obosara, gādiri ndi Livai, bú ndi-oje-ozi nke ulom, ighọrọ ha ihe-onwunwe, orú ime-ulo.
6
Ihe-onwunwe nke obodo a ka unu gēnye kwa, nnù ami iri-na-abua na ọgu iri ka obosara-ya gādi, ogologo-ya gādi kwa orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ: ulo Israel nile gēnwe ya.
7
Ihe onye-isi-unu nwere gādi kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo a, n'iru àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na n'iru ihe-onwunwe nke obodo a, n'akuku Ọdida-anyanwu chere iru n'Ọdida-anyanwu, na n'akuku Iru-anyanwu chere iru n'Iru-anyanwu: ogologo-ya gādi kwa n'akuku otù nime òkè ndia, site n'ókè-ala Ọdida-anyanwu rue ókè-ala Iru-anyanwu.
8
N'ala nka ọ gāburu ya ihe-onwunwe n'Israel: ndi-isim agaghi-eme kwa ndim ihe-ike ọzọ; kama ala nka ka ha gēnye ulo Israel dika ebo nile ha si di.
9
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, unu ndi-isi Israel: wezuganu ime-ihe-ike na ipunara-madu-ihe, menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume; wepunu nchupu-unu nile n'aru ndim; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
10
Ihe-osìsì ziri ezi, na ephah ziri ezi, na bath ziri ezi, ka unu gēnwe.
11
Ephah na bath gābu otù ọtùtù, ka bath we ruta otù uzọ n'uzọ iri nke homer, ka ephah we ruta kwa otù uzọ n'uzọ iri nke homer: dika homer si di, otú a ka ọtùtù-ya gādi.
12
Shekel gābu kwa orú gerah: orú shekel, orú shekel na ise, shekel iri na ise, ka maneh-unu gābu.
13
Nka bu àjà-nbuli nke unu gēbuli; otù uzọ n'uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka wheat, unu gēnye kwa otù uzọ n'uzọ isi nke ephah site na homer nke ọka barley:
14
òkè manu, bú nke bath nke manu, gābu kwa otù uzọ n'uzọ iri nke bath sitere na cor, nka bu bath iri, ọbuná otù homer; n'ihi na bath iri bu otù homer:
15
na otù nwa-aturu nke sitere n'ìgwè ewu na aturu, bú nke sitere n'ọgu umu-aturu iri, site n'ebe-ita-nri nke Israel nke miri nēde nke-ọma; ibu onyinye-inata-iru-ọma, na ibu àjà-nsure-ọku, na ibu àjà-udo, ikpuchiri ha nmehie; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
16
Ndi nile nke ala nka gādi n'àjà-nbuli a diri onye-isi n'Israel.
17
Ọlu nke onye-isi ka ọ gābu kwa inye àjà-nsure-ọku nile, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-ihe-ọṅuṅu, n'ememe nile, na n'ọnwa ọhu nile, na n'ubọchi-izu-ike nile, nime mb͕e nile akara àkà nke ulo Israel: ya onwe-ya gēdozi àjà-nmehie, na onyinye-inata-iru-ọma, na àjà-nsure-ọku, na àjà-udo nile, ikpuchiri ulo Israel nmehie-ha.
18
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, i gēwere nwa-oke-ehi nke zuru okè; i gēwepu kwa nmehie nke ebe nsọm.
19
Onye-nchu-ajam gēwere ufọdu n'ọbara àjà-nmehie ahu, tiye ya n'akuku-ọnu-uzọ nke ulo a, na n'ebe nkuku anọ nke ngwe diri ebe-ichu-àjà nka, na n'elu akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime.
20
Ọ bu kwa otú a ka i gēme n'ubọchi nke-asa nke ọnwa bayere onye ọ bula nēmehie n'amaghi-ama, baye-kwa-ra onye nēnweghi uche: unu ewe kpuchiere ulo a nmehie-ya.
21
N'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu, ka unu gēnwe ememe ngabiga, bú ememe nke ubọchi asa; achicha ekoghi-eko ka agēri.
22
Onye-isi gēdozi kwa n'ubọchi ahu otù oke-ehi n'ọnọdu onwe-ya na n'ọnọdu ndi nile nke ala nka, ibu àjà-nmehie.
23
N'ubọchi asa nke ememe ahu ọ ganēdozi àjà-nsure-ọku ichuru Jehova, bú oke-ehi asa na ebulu asa nke zuru okè, kwa-ubọchi n'ubọchi asa ahu; na àjà-nmehie, bú otù nkpi, kwa-ubọchi.
24
Onyinye-inata-iru-ọma ka ọ gēdozi kwa, bú otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, otù hin nke manu di-kwa-ra otù ephah.
25
N'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, n'ememe ahu, ka ọ ganēme dika ihe ndia si di n'ubọchi asa ya; dika àjà-nmehie, na dika àjà-nsure-ọku, na dika onyinye-inata-iru-ọma, na dika manu.
← Chapter 44
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 46 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48