bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 27
Ezekiel 27
Igbo 2006
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 28 →
1
Okwu Jehova we ruem nti, si,
2
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buliere Taia abù-ákwá;
3
si Taia, Gi onye bi na ab͕ata oké osimiri, onye bu onye-ahia nke ndi nile di iche iche rue ọtutu agwe-etiti, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Taia, gi onwe-gi asiwo, Mu onwem bu ebe mazuru nma.
4
N'etiti oké osimiri ka ókè-ala-gi nile di, ndi wuworo gi emewo ka ima-nma-gi zue okè.
5
Osisi fir nke si na Senia aputa ka ha jiworo mere gi ibo-ub͕ọ nile: osisi cedar nke si na Lebanon aputa ka ha wereworo imere gi akpu-ub͕o.
6
Osisi oak nke si na Beshan aputa ka ha jiworo me umara-gi nile; oche-umara-gi ka ha jiworo ọdu, ekwukọyere n'osisi igbe nke si n'agwe-etiti Kitim aputa, me.
7
Ezi ákwà ọcha nke akpara nke-ọma, bú nke si n'Ijipt aputa, ka ákwà-ifufe-gi buworo, iburu gi ọkọlọtọ; ákwà anunu na ákwà ododo nke si n'agwe-etiti Elaisha aputa ka ákwà-ǹdò-gi buworo.
8
Ndi bi na Zaidon na Avad abuworo gi ndi-umara: ndi-gi ndi mara ihe, gi Taia, anọwo nime gi, ha onwe-ha bu ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi.
9
Ndi-okenye Gebal na ndi-ya ndi mara ihe anọwo nime gi buru ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi: ub͕ọ nile nke oké osimiri na ndi-ub͕ọ-ha anọwo nime gi izu ahia gi.
10
Peasia na Lud na Put anọwo n'usu-ndi-agha-gi, ha bu ndi-agha-gi: ọta na okpu-agha ka ha kobere nime gi; ndi ahu gosiri ima-nma-gi.
11
Umu Avad na usu-ndi-agha-gi nọ n'elu mb͕idi-gi nile buruburu, Gamadim anọwo kwa n'ulo-elu-gi nile: ọta-ha ka ha kokwasiri na mb͕idi-gi nile buruburu; ndi ahu emewo ka ima-nma-gi zue oké.
12
Tashish bu onye-ahia-gi site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; ọla-ọcha na ígwè na b͕amb͕am na opù ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi nile.
13
Jevan, na Tubal, na Meshek, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: madu onwe-ha na ihe di iche iche nke ọla ka ha jiri zu ihe-izu-ahia-gi.
14
Ndi ulo Togama chiri inyinya na ndi-inyinya na inyinya mule zua ihe-ahia-gi nile.
15
Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi.
16
Siria bu Onye-ahia-gi site n'iba-uba nke ihe di iche iche i mere ire ere: emerald, na ákwà ododo, na ákwà akpara nke-ọma, na ezi ákwà ọcha, na coral, na ruby, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi nile.
17
Juda na ala Israel, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ọka wheat nke Minit, na pannag, na manu-aṅu, na manu, na balm, ka ha jiri zu ihe-ahia-gi.
18
Damaskọs bu onye-ahia-gi n'ihi iba-uba nke i mere ire ere, site n'iba-uba nke àkù nile ọ bula; o jiri manya-vine Helbon na aji-anu di ọcha zu.
19
Vedan na Jevan nēwere ogho aturu atu zua ihe-ahia-gi nile: ígwè nwupuru enwupu, na cassia, na calamus, adiwo n'etiti ihe-izu-ahia-gi.
20
Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.
21
Arebia na ndi-isi nile nke Kida, ndi ahu bu ndi-ahia nke aka-gi; n'umu-aturu na ebulu na ewu, n'ihe ndia ka ha bu ndi-ahia-gi.
22
Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.
23
Heran na Kane na Eden, ndi-ahia Sheba, Asiria, Kilmad, ndia bu ndi-ahia-gi.
24
Ndi ahu bu ndi-ahia-gi n'ihe di iche iche mazuru nma, n'ulo ákwà anunu na ákwà akpara nke-ọma, na n'ib͕e juputara n'uwe turu agwa nke-ọma, nke eji udọ̀ ke were kwa osisi cedar me ha, n'etiti ihe-ahia-gi.
25
Ub͕ọ nile nke Tashish bu usu-ndi-ahia-gi iweta ihe-izu-ahia-gi: i we ju eju, di nsọpuru nke-uku n'etiti oké osimiri nile.
26
Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile.
27
Àkù-gi, na ihe-ahia-gi nile, na ihe-izu-ahia-gi, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi, na ndi nākwuchi oghere-ub͕ọ-gi, na ndi nāzu ahia-gi, na ndi-agha-gi nile, ndi nọ nime gi, na nime nkpọkọta-madu nile nke gi nke di n'etiti gi, gādabà n'etiti oké osimiri nile n'ubọchi ọdida-gi.
28
N'olu iti-nkpu nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ-gi azu-obodo-gi nile gēme nkpatu.
29
Ndi nile ndi nānya umara, na ndi-ub͕ọ, na ndi-ọ̀kà-ub͕ọ nile nke oké osimiri, gēsi kwa n'ub͕ọ-ha ridata, n'elu ala ka ha gēguzo,
30
me ka anuru olu-ha n'elu gi, tie nkpu ilu, kpokwasi ájá n'isi-ha, na ntu ka ha gāturu onwe-ha:
31
ha gēme-kwa-ra onwe-ha isi-nkwọcha n'ihi gi, ke ákwà-nkpe n'úkwù, kwara gi ákwá n'idi-ilu nke nkpuru-obi n'iti-aka-n'obi di ilu.
32
Ha gēbuliri gi abù-ákwá n'igo-ákwá-ha, bùara gi abù-ákwá, si, Ònye di ka Taia, ònye di ka obodo ahu nke emere ka o dere du n'etiti oké osimiri?
33
Mb͕e ihe-ahia-gi nile siri n'oké osimiri nile puta, i mere ka afọ ju ọtutu ndi di iche iche; i jiri iba-uba nke àkù-gi na nke ihe-izu-ahia-gi nile me ndi-eze nke uwa ka ha buru ọgaranya.
34
Na mb͕e etiwara gi site n'oké osimiri nile n'ebe miri emi nke miri, ihe-izu-ahia-gi na nkpọkọta-madu nile nke gi dara ada n'etiti gi.
35
I juwo ndi nile bi n'agwe-etiti nile anya, ndi-eze-ha atuwo ujọ nke-uku, iru-ha ab͕arusiwo.
36
Ndi-ahia n'etiti ndi nile di iche iche amawo gi ọsọ; oké egwu ka i ghọworo, i gaghi-adi kwa ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48