bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 29
Ezekiel 29
Igbo 2006
← Chapter 28
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 30 →
1
N'arọ nke-iri, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-iri-na-abua nke ọnwa ahu, okwu Jehova rurum nti, si,
2
Nwa nke madu, che iru-gi imegide Fero, bú eze Ijipt, bue amuma megide ya, megide kwa Ijipt nile:
3
Kwue okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēmegide gi, Fero, eze Ijipt, bú ogologo anu ahu nke nāmakpu n'etiti osimiri Nail-ya nile, nke siworo, Mu nwe Nail nkem, ọ bu kwa mu onwem mere ya n'onwem.
4
M'gētiye kwa nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka azù nke osimiri Nail i nile rapara n'akpirikpa-gi; M'gēme kwa ka i si n'etiti osimiri Nail i nile rigoputa, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile nke nārapara n'akpirikpa-gi.
5
M'gātusa kwa gi n'ọzara, gi na azù nile nke osimiri Nail i nile: n'ọhia ka i gāda; agaghi - achikọta gi, agaghi-ekpokọta kwa gi: anu-ọhia nke uwa na anu-ufe nke elu-igwe ka M'wereworo gi nye ka i ghọ ihe-oriri.
6
Ndi nile bi n'Ijipt gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, n'ihi na ha aburuworo ulo Israel nkpa-n'aka nke bu nání amì.
7
Mb͕e ha jidere gi n'aka, i we nyajie, dọwara ha ubu nile: na mb͕e ha dabere gi, i we b͕ajie, me ka úkwù nile guzoro ha.
8
N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje ime ka mma-agha biakwasi gi, M'gēbipu kwa madu na anumanu nime gi.
9
Ala Ijipt gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu na nkpọnkpọ ebe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova: n'ihi na ọ siwo, Mu nwe osimiri Nail, ọ bu kwa onwem mere ya.
10
N'ihi nka, le, Mu nēmegide gi, megide kwa osimiri Nail i nile, M'gēme kwa ka ala Ijipt ghọ nání nkpọnkpọ ebe nkpọnkpọ ebe na ebe tọb͕ọrọ n'efu, site na Migdol rue Sevene, ọbuná rue ókè-ala Etiopia.
11
Ọ dighi ukwu madu gāgabiga nime ya, ọ dighi kwa ukwu anumanu gāgabiga nime ya, agaghi-ebi kwa nime ya ọgu arọ abua.
12
M'gēme kwa ala Ijipt ebe tọb͕ọrọ n'efu n'etiti ala nile tọb͕ọrọ n'efu, ọzọ, obodo-ya nile nke di n'etiti obodo nile nke emeworo nkpọnkpọ ebe gābu ebe tọb͕ọrọ n'efu ọgu arọ abua: M'gāchusa kwa ndi Ijipt n'etiti mba nile, fesa ha n'ala nile.
13
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ọgwugwu ọgu arọ abua ka M'gāchikọputa ndi Ijipt nime ndi nile di iche iche ebe achusara ha:
14
M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.
15
Ọ gādi ala kari ala-eze nile; ọ gaghi-ebuli kwa onwe-ya ọzọ n'elu mba nile: M'gēme kwa ka ha di ole-na-ole, ka ha ghara inwe ike n'aru mba nile.
16
Ọ gaghi-abu-kwa-ra ulo Israel ihe-ntukwasi-obi nēme ka echeta ajọ omume, mb͕e ha nēche iru ile ha anya n'azu: ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-ha Jehova.
17
O rue, n'arọ nke-oru-na-asa, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na okwu Jehova rurum nti, si,
18
Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya.
19
N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya.
20
Enyewom ya ala Ijipt ibu ihe ọ lutara n'ọlu, bú nke o fère òfùfè n'ihi ya, n'ihi na ha lurum ọlu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
21
N'ubọchi ahu ka M'gēme ka otù mpi puere ulo Israel, ọ bu kwa gi ka M'gēnye nsaghe-ọnu n'etiti ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
← Chapter 28
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 30 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48