bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 25
Ezekiel 25
Igbo 2006
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 26 →
1
Okwu Jehova we ruem nti, si,
2
Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha:
3
si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ:
4
n'ihi nka, le, M'gaje iwere gi nye umu Iru-anyanwu ibu ihe ha nwetara, ha gēdo kwa ebe-ulo-ikwū nile ha nime gi, me ebe-obibi nile ha nime gi; ndi ahu gēri nkpuru-gi, ọ bu kwa ndi ahu gāṅu miri-ara-ehi-gi.
5
M'gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
6
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;
7
n'ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n'aru gi, M'gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n'agha; M'gēbipu kwa gi n'aru ndi nile di iche iche, me ka i si n'ala nile la n'iyì: M'gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova.
8
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;
9
n'ihi nka, le, M'gaje imeghe akuku Moab site n'obodo ahu nile, site n'obodo-ya nile nke di na nsọtu-ala-ya, nke bu ima-nma nke ala ahu, bú Bet-jeshimot, na Beal-meon, na Kiriataim,
10
nye umu Iru-anyanwu, tiyere umu Amon, M'gēwere kwa ya nye ka ọ buru ihe ha nwetara, ka ewe ghara icheta umu Amon n'etiti mba nile:
11
ọ bu kwa Moab ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
12
Otù a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Edom emegidewo ulo Juda n'ibọ̀ ọ́bọ̀, na n'ihi na ikpe amawo ha nke-uku, ha we bọrọ onwe-ha ọbọ n'aru ha;
13
n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.
14
M'gēsi kwa n'aka ndim, bú Israel, tukwasi Edom ibọ̀-ọ́bọ̀m; ha ewe me n'Edom dika iwem si di na dika ọnumam si di: ha ewe mara ibọ̀-ọ́bọ̀m; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
15
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ndi Filistia emesowo Juda n'ibọ̀-ọ́bọ̀, bọ̀ ọ́bọ̀ na nlelì nke di nime nkpuru-obi-ha ibibi ya n'iro ebighi-ebi;
16
n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, Le, M'gaje iseti akam n'aru ndi Filistia, bipu ndi Keret, me ka ndi ọnu-miri oké osimiri fọduru la n'iyì.
17
M'gēji kwa iba-nba nile nke ọnuma bọ̀ ha ọ́bọ̀ nile di uku; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gātukwasi ha ibọ̀-ọ́bọ̀m.
← Chapter 24
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 26 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48