bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 38
Ezekiel 38
Igbo 2006
← Chapter 37
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 39 →
1
Okwu Jehova we ruem nti, si,
2
Nwa nke madu, che iru-gi na Gog, nke ala Megog, bú onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal, bue amuma megide ya,
3
si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:
4
M'gēchighari gi, tiye nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka i puta, gi na usu-ndi-agha-gi nile, ma inyinya ma ndi-inyinya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha nile, ọ bu nkpọkọta madu bara uba chiri ọta uku na ọta, ndi nējide mma-agha, ha nile:
5
Peasia na Etiopia na Put soro ha; ha nile chiri ọta na okpu-agha:
6
Goma na usu-ndi-agha-ya nile; ulo Togama nke akuku Ugwu dikarisiri anya, na usu-ndi-agha-ya nile: ọbuná ọtutu ndi di iche iche so gi.
7
Buru onye jikere, e, jikere onwe-gi, gi onwe-gi, na nkpọkọta ndi-gi nile, ndi akpọkọtaworo n'ebe i nọ, gi buru ha ọchi-agha.
8
Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.
9
I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.
10
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, na ihe di iche iche gābata n'obi-gi, i gēchè kwa èchìchè ọjọ:
11
i gāsi kwa, M'gārigo imegide ala bu nání obodo nēnweghi mb͕idi; m'gābakwasi ndi nọ jū, ndi nọ na ntukwasi-obi, ha nile bi n'ebe nēnweghi mb͕idi, ọ dighi kwa ihe-ntuchi ma-ọbu ibo-ọnu-uzọ ha nwere:
12
ikwata ihe-nkwata na iluta ihe-nluta n'agha; ichighari aka-gi imegide nkpọnkpọ ebe nke madu bi nime ha ub͕u a, na imegide otù ndi nke achikọputaworo na mba di iche iche, nke lutaworo anu-ulo na ihe-ahia n'ọlu, ndi bi n'elu-ala nke uwa.
13
Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n'agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata?
14
N'ihi nka bue amuma, nwa nke madu, si Gog, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bughi n'ubọchi ahu mb͕e ndim, bú Israel, bi na ntukwasi-obi ka i gāmara ya?
15
I gēsi kwa n'ebe-gi, n'akuku nile nke Ugwu dikarisiri anya, bia, gi onwe-gi, na ọtutu ndi di iche iche so gi, ndi nānọkwasi inyinya ka ha nile bu, ha bu nkpọkọta madu di uku na usu-ndi-agha bara uba:
16
i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.
17
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye ahu nke M'kwuru okwu bayere ya na mb͕e ochie site n'aka ndi-orùm, bú ndi-amuma Israel, ndi nēbu amuma n'ubọchi ahu ọtutu arọ, si, na M'gēme ka i biakwasi ha?
18
Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, n'ubọchi Gog nābia imegide ala Israel, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), na ọnumam gārigota n'imim.
19
Ọ bu kwa n'ekworom n'ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'kwuworo, si, N'ezie n'ubọchi ahu ime-nkpatu uku gādi n'elu ala Israel;
20
azù nile nke oké osimiri, na anu-ufe nke elu-igwe, na anu ọhia, na ihe nile nke nākpu akpu, bú nke nākpu akpu n'ala, na madu nile ndi nọ n'elu uwa, ewe me nkpatu site n'irum, agākwatu kwa ugwu nile, ebe nile di nkputankpu gāda kwa, mb͕idi nile ọ bula gādaru kwa ala.
21
M'gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n'ugwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya.
22
Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ajọ ọria nēfe efe na n'ọbara; ọ bu kwa oké miri-ozuzo nēzobiga ókè, na oké ákú-miri-ígwé, na ọku, na brimstone, ka M'gēme ka ha zokwasi ya, zokwasi kwa usu nile nke ndi-agha-ya, zokwasi kwa ọtutu ndi di iche iche so ya.
23
M'gēme kwa Onwem ka M'di uku, M'gēdo kwa Onwem nsọ, me ka amara Mu onwem n'anya ọtutu mba; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
← Chapter 37
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 39 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48