bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 12
Ezekiel 12
Igbo 2006
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 13 →
1
Okwu Jehova we ruem nti, si,
2
Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
3
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi ihe di iche iche nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, je biri n'ala ọzọ n'ehihie n'anya-ha; i gēsi kwa n'ọnọdu-gi je biri n'ebe ọzọ n'anya-ha: eleghi anya ha gāhu, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
4
I gēbuputa kwa ihe-gi nile n'ehihie n'anya-ha, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ: gi onwe-gi gāpu kwa n'anyasi n'anya-ha, dika ọpupu nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ.
5
Gwupuere onwe-gi mb͕idi n'anya-ha, si n'ebe ahu bupu ihe.
6
N'anya-ha ka i gēbu ya n'ubu-gi, n'ọchichiri ka i gēbupu ya; iru-gi ka i gēkpuchi, ka i we ghara ihu ala: n'ihi na ewereworo gi nye ulo Israel ka i buru ihe-ebube.
7
M'we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m'buputara n'ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, n'anyasi m'we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n'ọchichiri ka m'bupuru ya, n'ubum ka m'buru ya n'anya-ha.
8
Okwu Jehova we ruem nti n'ututu, si,
9
Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme?
10
Si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye-isi nke nọ na Jerusalem ka eboro ibu a, ya na ulo Israel nile nke ndi ahu nọ n'etiti ha.
11
Si, Mu onwem bu ihe-ebube-unu: dika m'meworo, otú a ka agēme ha: ọ bu n'ime ka ha je biri n'ala ọzọ, n'idọta ha n'agha, ka ha gāla.
12
Onye-isi ahu kwa nke nọ n'etiti ha, n'ubu-ya ka o gēbu ihe n'ọchichiri, we pua: mb͕idi ka ha gēgwupú isi na ya bupu ihe: iru-ya ka o gēkpuchi, n'ihi na ya onwe-ya agaghi-eji anya-ya hu ala ahu.
13
M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu.
14
Ọ bu kwa ndi nile ndi di ya buruburu iyere ya aka, na usu-ndi-agha-ya nile, ka M'gēfesara ifufe nile ọ bula; ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.
15
Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gāchusa ha n'etiti mba nile, fesa kwa ha n'ala nile.
16
Ma M'gēme ka ndikom ole-na-ole nime ha fọdu pua na mma-agha, na n'oké unwu, na n'ajọ ọria nēfe efe; ka ha we kọ akukọ ihe-árú nile ha n'etiti mba nile ebe ha gābiawori; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
17
Okwu Jehova we ruem nti, si,
18
Nwa nke madu, nri-gi ka i gēwere ime-nkpatu rie, miri-gi ka i gēwere kwa ọma-jijiji na ncheb͕u ṅua;
19
i gāsi kwa ndi ala nka, Okwu di otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova kwuru bayere ndi bi na Jerusalem, baye-kwa-ra ala Israel, si: Nri-ha ka ha gēwere ncheb͕u rie, miri-ha ka ha gēwere kwa iju-anya ṅua, ka ala-ya we tọb͕ọrọ n'efu ghara inwe ùjú-ya, site n'ihe-ike nke ndi nile bi nime ya.
20
Agēme kwa ka obodo-ya nile ebi ebi ghọ nkpọnkpọ ebe, ala gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
21
Okwu Jehova we ruem nti, si,
22
Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì?
23
N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: M'gēme ka ilu a kwusi, ha agaghi-atu kwa ya dika ilu n'Israel ọzọ; kama gwa ha okwu, si, Ha di nso, bú ubọchi ahu, ha na okwu ọhù ọ bula.
24
N'ihi na ọhù efu ọ bula, ma-ọbu iju-ase ire-utọ, agaghi-adi kwa n'etiti ulo Israel.
25
N'ihi na Mu onwem bu Jehova; M'gēkwu okwu, okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; agaghi-eme kwa ya ka ọ di anya ọzọ: n'ihi na n'ubọchi-unu, unu ulo nke nnupu-isi, ka M'gēkwu okwu, me ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
26
Okwu Jehova we ruem nti, si,
27
Nwa nke madu, le, ulo Israel nāsi, Ọhù ahu nke ya onwe-ya nāhu diri ọtutu ubọchi di n'iru, ọ bu kwa mb͕e di anya ka ya onwe-ya nēburu amuma.
28
N'ihi nka si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọ dighi okwu ọ bula n'okwum nile agēme kwa ka ọ di anya ọzọ, ma okwu nke M'gēkwu, agēme kwa ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48