bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Ezekiel 34
Ezekiel 34
Igbo 2006
← Chapter 33
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 35 →
1
Okwu Jehova we ruem nti, si,
2
Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-ọzùzù-aturu nāzù Israel, bue amuma, si ha, bú ndi-ọzùzù-aturu ahu, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ahuhu diri ndi-ọzùzù-aturu nāzù Israel ndi nọworo nāzù onwe-ha! ọ̀ bughi ìgwè ewu na aturu ka ndi-ọzùzù-aturu gāzù?
3
Abuba-ha ka unu nēri, aji-ha ka unu nēyi, anu nke mara abuba nime ha ka unu nēb͕u; ma ìgwè ewu na aturu ka unu nāzùghi.
4
Unu emeghi ka ndi aru-ha nādighi ike di ike, unu agwọghi kwa nke nāria ọria, unu ekezighi kwa ọkpukpu b͕ajiri ab͕aji, unu eweghachighi kwa nke achufuru achufu, unu achọghi kwa nke furu efu; kama n'ike na nkpab͕u ka unu zọdaworo ha.
5
Ha we b͕asa, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu anọgh: ha we ghọrọ anu ọhia nile ihe-oriri, we b͕asa.
6
Ìgwè ewu na aturu nkem nākpafu n'ugwu nile, na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu: ọ bu kwa n'elu uwa nile ka ìgwè ewu na aturu nkem b͕asara: ọ dighi kwa onye nāju ajuju bayere ha, ọ dighi kwa onye nāchọ ha.
7
N'ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova:
8
Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ihi na ìgwè ewu na aturu nkem ghọrọ ihe-nluta-n'agha, ìgwè ewu na aturu nkem ewe ghọrọ anu nile ihe-oriri, n'ihi na onye-ọzùzù-aturu adighi, na n'ihi na ndi-ọzùzù-aturum achọghi ìgwè ewu na aturu nkem, kama ndi-ọzùzù-aturu nāzù onwe-ha, ma ìgwè ewu na aturu nkem ka ha nāzùghi;
9
n'ihi nka, unu ndi-ọzùzù-aturu, nurunu okwu Jehova;
10
Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide ndi-ọzùzù-aturu; M'gājuta kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'aka-ha, me ka ha kwusi izù ìgwè ewu na aturu ahu; ndi-ọzùzù-aturu agaghi-azù kwa onwe-ha ọzọ; M'gānaputa kwa ìgwè ewu na aturu nkem n'ọnu-ha, ka ha we ghara ighọrọ ha ihe-oriri.
11
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, M'gāchọ kwa ìgwè ewu na aturu nkem, chọputa ha.
12
Dika onye-ọzùzù-aturu si achọputa ìgwè aturu-ya, n'ubọchi ọ nọ n'etiti ìgwè ewu na aturu-ya nke b͕asara ab͕asa, otú a ka M'gāchọputa ìgwè ewu na aturu nkem; M'gānaputa kwa ha n'ebe nile ha b͕asara n'ubọchi nke igwe-oji na oké ọchichiri.
13
M'gēme kwa ka ha si na ndi nile di iche iche puta, M'gāchikọputa kwa ha n'ala nile, me ka ha ba n'ala-ha; M'gāzù kwa ha n'ugwu nile nke Israel, na n'akuku ebe nile miri si erù, na n'ebe-obibi nile nke ala-ha.
14
Ezi ihe-ọzùzù-aturu ka M'gēji zù ha, ọ bu kwa n'ugwu nile nke ebe di elu nke Israel ka ebe-ita-nri-ha gādi: n'ebe ahu ka ha gāmakpu n'ezi ebe-ita-nri, ọ bu kwa ihe-ọzùzù-aturu makarisiri nma ka ha gēji zù onwe-ha n'ugwu nile nke Israel.
15
Mu onwem gāzù ìgwè ewu na aturu nkem, Mu onwem gēme kwa ka ha makpue amakpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
16
Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.
17
Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēkpe ikpe n'etiti anu na anu, ma ebulu ma nkpi.
18
Ọ̀ bu unu ihe ntà na unu ji ezi ihe-ọzùzù-aturu azù onwe-unu, ma unu gāzọtọ ihe-ọzùzù-aturu-unu fọdurunu n'ukwu-unu? ọ̀ bu kwa unu ihe ntà na ọ bu miri doro edo ka unu nāṅu, ma unu gāb͕aru miri fọdurunu n'ukwu-unu?
19
Ma ìgwè ewu na aturu nkem, ọ bu ihe ukwu-unu zọtọrọ ka ha ji azù onwe-ha, ọ bu kwa miri ukwu-unu b͕aruru ka ha nāṅu.
20
N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, gēkpe kwa ikpe n'etiti anu mara abuba na anu tara aru.
21
N'ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n'ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n'èzi;
22
n'ihi nka M'gāzọputa ìgwè ewu na aturu nkem, ha agaghi-aghọ kwa ihe-nluta-n'agha ọzọ; M'gēkpe kwa ikpe n'etiti anu na anu.
23
M'gēme kwa ka otù onye-ọzùzù-aturu biliere ha, ọ gāzù kwa ha, ọbuná orùm, bú Devid; ya onwe-ya gāzù ha, ya onwe-ya gābu-kwa-ra ha onye-ọzùzù-aturu.
24
Mu onwem, bú Jehova, gābu-kwa-ra ha Chineke, orùm, bú Devid, gābu kwa onye-isi n'etiti ha; Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.
25
Mu na ha gāb͕a kwa ọb͕ub͕a-ndu udo, M'gēme kwa ka ajọ anu-ọhia kwusi n'ala-ha: ha gēbi n'ọzara na ntukwasi-obi, raru ura n'oké ọhia.
26
M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.
27
Osisi ọhia gāmi kwa nkpuru-ya, ala gēme kwa ihe-ọmume-ya, ha gānọ kwa n'elu ala-ha na ntukwasi-obi; ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'tijiworo nkpọrọ nile nke yoke-ha, naputa ha n'aka ndi mere ha ka ha fè ha òfùfè.
28
Ha agaghi-abu-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha ọzọ, anu-ọhia nke uwa agaghi-eri kwa ha; ma ha gēbi na ntukwasi-obi, ọ dighi kwa onye ganēme ka ha ma jijiji.
29
M'gēme kwa ka ihe-ọkukù nke agāma aha-ya biliere ha, ha agaghi-abu kwa ndi oké unwu kpochapuworo n'ala-ha ọzọ, ha agaghi-ebu kwa ihere mba nile ọzọ.
30
Ha ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, bú Chineke-ha, nọyere ha, ha mara kwa na ha onwe-ha bu ndim, bú ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
31
Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, bú ìgwè ewu na aturu nke ebe-ita-nrim, madu ka unu bu, Mu onwem bu Chineke-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
← Chapter 33
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 43
Chapter 44
Chapter 45
Chapter 46
Chapter 47
Chapter 48
Chapter 35 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42
43
44
45
46
47
48