bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 12
Exodus 12
Igbo 2006
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 13 →
1
Jehova we gwa Moses na Eron okwu n'ala Ijipt, si,
2
Ọnwa nka gāburu unu isi ọnwa nile: ọnwa mbu nime ọnwa nile nke arọ ka ọ gāburu unu.
3
Gwanu nzukọ nile nke Israel okwu, si, N'ubọchi nke-iri nke ọnwa nka ka ha gēwere n'onwe-ha, onye ọ bula o were nwa-aturu, dika ulo nna-unu-hà si di, ka otù nwa-aturu diri otù ulo:
4
ma ọ buru na ulo ahu dikari ntà iri nwa-aturu, ya onwe-ya na onye-ab͕ata-obi-ya nke bi nso ulo-ya gēwere kwa otù dika ọnu-ọgugu madu si di; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka unu gāguru nwa-aturu ahu ọgugu.
5
Nwa-aturu unu nwere gābu nke zuru okè, oké nke b͕ara otù arọ: n'etiti aturu ma-ọbu n'etiti ewu ka unu gēsi weputa ya:
6
ọ gābu-kwa-ra unu ihe-ndebe rue ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa nka: nkpọkọta nile nke nzukọ Israel gēb͕u ya n'etiti ehihie na anyasi.
7
Ha gēwere ufọdu nime ọbara-ya, tiyekwasi ya n'awara-uzọ abua na n'ọfiere-uzọ n'ulo nile nke ha gēri ya nime ha.
8
Ha gēri anu-aru-ya n'abali ahu, aruru n'ọku, ya na achicha ekoghi-eko; tiyere ihe di iche iche nēlu ilu ka ha gēri ya.
9
Unu erila ihe nime ya na ndu, ma-ọbu isi ya na miri ma-ọli, kama aruru n'ọkui; isi-ya tiyere ọlu-ukwu-ya na ọlu-aka-ya, tiye-kwa-ra ihe-ime-ya.
10
Unu agaghi-eme ka ihe ọ bula fọdu site na ya rue ututu; ma ihe fọduru site na ya rue ututu, n'ọku ka unu gēsure ya.
11
Otú a ka unu gēri ya; n'iji ihe-ọkiké ke n'úkwù-unu, na akpukpọ-ukwú-unu n'ukwù, na nkpa-n'aka-unu n'aka-unu: unu gēri kwa ya na ngwa: ngabiga nke diri Jehova ka ọ bu.
12
M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.
13
Ọbara ahu gāburu unu ihe-iriba-ama n'aru ulo nile ebe unu onwe-unu nọ: mb͕e M'huru ọbara ahu, M'gāgabiga unu, ọ dighi kwa ihe-otiti gādi n'aru unu ibu ihe-nbibì, mb͕e M'nētib͕u ndi bi n'ala Ijipt.
14
Ubọchi a gāburu unu ihe-ncheta, unu gēme kwa ya ka ọ buru ememe unu nēmere Jehova: n'ọb͕ọ nile unu ka unu ganēme ya ka ọ buru ememe site n'ukpuru ebighi-ebi.
15
Ubọchi asa ka unu gēri achicha ekoghi-eko; ọ buná n'ubọchi mbu ka unu gēme ka ihe nēko achicha ghara idi n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko site n'ubọchi mbu rue ubọchi nke-asa, agēbipu madu ahu n'Israel.
16
N'ubọchi mbu nkpọkọta di nsọ gādi, n'ubọchi nke-asa nkpọkọta di nsọ gādi-kwa-ra unu; ọ dighi ozi ọ bula agēje nime ha, nání ihe onye ọ bula gēri, nání nke ahu ka unu gēme.
17
Unu gēdebe kwa ememe achicha ekoghi-eko; n'ihi na ọ bu nime otù ubọchi a ka M'meworo ka usu nile nke ndi-agha-unu si n'ala Ijipt puta: unu gēdebe kwa ubọchi a rue ọb͕ọ nile unu site n'ukpuru ebighi-ebi.
18
N'onwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-anọ nke ọnwa ahu n'anyasi, ka unu gēri achicha ekoghi-eko, rue ubọchi nke-orú-na-otù nke ọnwa ahu n'anyasi.
19
Ubọchi asa ka anāgaghi-ahu ihe nēko achicha n'ulo nile unu: n'ihi na onye ọ bula nke nēri achicha koro eko, agēbipu madu ahu nime nzukọ Israel, ma n'etiti ndi-ọbìa, ma n'etiti ndi amuru n'ala.
20
Unu agaghi-eri achicha ọ bula koro eko; n'ebe-obibi-unu nile ka unu gēri achicha ekoghi-eko.
21
Moses we kpọ ndi-okenye nile nke Israel, si ha, Kpuputanu, chiri kwa ìgwè ewu na aturu n'onwe-unu, dika ab͕uru-unu nile si di, b͕u-kwa-nu anu ngabiga nka.
22
Unu gēwere kwa ùkwù hyssop, sue ya n'ọbara nke di n'ọkwa, were ya jua ọbara ufọdu nke di n'ọkwa elu-uzọ na n'awara-uzọ abua; unu onwe-unu agaghi-apu kwa, onye ọ bula n'ọnu-uzọ ulo-ya, rue ututu.
23
N'ihi na Jehova gāgabiga iti ndi Ijipt ihe; ma mb͕e Ọ huru ọbara ahu n'elu elu-uzọ na n'elu awara-uzọ abua, Jehova gāgabiga ọnu-uzọ ahu, Ọ gaghi-ekwe onye-nbibì ahu ka ọ ba n'ulo-unu iti unu ihe.
24
Unu gēdebe kwa ihe a ka ọ buru ukpuru n'ebe i nọ na n'ebe umu-gi nọ rue mb͕e ebighi-ebi.
25
O gēru kwa, mb͕e unu gābà n'ala ahu nke Jehova gēnye unu, dika O kwuworo, na unu gēdebe òfùfè a.
26
O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere?
27
na unu gāsi, Àjà ngabiga ka ọ bu nke anāchuru Jehova, Onye gabigara ulo nile nke umu Israel n'Ijipt, mb͕e O tiri ndi Ijipt ihe, O we naputa ulo nile ayi. Ndi Israel we rube isi, kpọ isi ala.
28
Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.
29
O rue, n'etiti abali, na Jehova tib͕uru nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, site na nwa eburu uzọ muru Fero nke nānọkwasi n'oche-eze-ya rue nwa eburu uzọ muru onye adọtara n'agha nke nọ n'ulo olùlù; O tib͕u-kwa-ra nwa anumanu ọ bula eburu uzọ mu.
30
Fero we bilie n'abali, ya onwe-ya, na ndi-orù-ya nile, na ndi Ijipt nile; oké iti-nkpu we di n'Ijipt; n'ihi na ọ dighi ulo ebe onye nwuru anwu nādighi.
31
O we kpọ Moses na Eron n'abali, si, Bilienu, si n'etiti ndim pua, ma unu onwe-unu ma umu Israel; je-kwa-nu, fè Jehova, dika unu kwuru.
32
Chirinu ma ìgwè ewu na aturu-unu ma ìgwè ehi-unu, dika unu kwuru, jenu; gọzi-kwa-num.
33
Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu.
34
Ndi Israel we buru utu ọka flour-ha agwọrọ agwọ tutu o ko, ebe ekere ihe-ha eji agwọ achicha n'uwe-nb͕okwasi-ha tukwasi n'ubu-ha.
35
Umu Israel me-kwa-ra dika okwu Moses si di; ha we riọ n'aka ndi Ijipt ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi:
36
Jehova we nye ndi Israel amara n'iru ndi Ijipt, ha we me ka ha riọta ihe. Ha we napu ndi Ijipt ihe-ha.
37
Umu Israel we bulie ije site na Rameses rue Sukot, ihe ra ka orú nnù ndikom ọgu uzọ atọ na orú nnù uzọ iri-na-ise, ndi ji ukwu eje, bú ndikom, nāgughi umu-ntakiri.
38
Ọzọ kwa, ọtutu ndi gwara ọgwa soro ha rigo; na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, anu-ulo riri nne nke-uku.
39
Ha we were utu ọka flour agwọrọ agwọ, bú nke ha si n'Ijipt bute, sie achicha ekoghi-eko, n'ihi na o koghi eko; n'ihi na achupuru ha n'Ijipt, ha apughi kwa inọ ọdù, ọzọ kwa, ọ dighi ihe iri n'uzọ ha doziri onwe-ha.
40
Ma obibi umu Israel, nke ha biri n'Ijipt, di nnù arọ na orú arọ na iri.
41
O rue, n'ọgwugwu nnù arọ na orú arọ na iri ahu, ọ bu kwa n'otù ubọchi ahu ka o ruru, na usu nile nke ndi-agha Jehova siri n'ala Ijipt pua.
42
Abali nche ka ọ buru Jehova ime ka ha si n'ala Ijipt puta: otù abali ahu bu abali nche diri Jehova nke umu Israel nile nwere rue ọb͕ọ nile ha.
43
Jehova we si Moses na Eron, Nka bu ukpuru ngabiga ahu: ọ dighi onye ala ọzọ gēri ya:
44
ma orù ọ bula nke onye ọ bula, bú nke ejiri ego b͕ata, mb͕e i bìworo ya úgwù, mb͕e ahu o gēri ya.
45
Onye-nnọdu na onye egoro ọlu agaghi-eri ya.
46
N'otù ulo ka agēri ya; i gaghi-esi n'ulo wepu ihe ọ bula n'anu-aru-ya n'èzí; ọ dighi kwa ọkpukpu unu gētiji nime ya.
47
Nzukọ nile nke Israel gēme ya.
48
Ma mb͕e ọbìa gānọ n'ala-gi dika ọbìa, mb͕e ọ gēme-kwa-ra Jehova ememe ngabiga, ka ebìe nwoke ọ bula ọ nwere úgwù, mb͕e ahu ya biarue nso ime ya; ọ gādi kwa ka onye amuru n'ala: ma ọ dighi onye ọ bula anēbighi úgwù gēri ya.
49
Otù iwu ka ha gēnwe, bú onye amuru n'ala na ọbìa nke nọ dika ọbìa n'etiti unu.
50
Umu Israel nile we me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.
51
O rue, n'otù ubọchi ahu, na Jehova mere ka umu Israel si n'ala Ijipt puta n'usu nile nke ndi-agha-ha.
← Chapter 11
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 13 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40