bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 22
Exodus 22
Igbo 2006
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 23 →
1
Mb͕e onye ọ bula gēzu ehi ma-ọbu aturu, we b͕ue ya, ma-ọbu re ya; ehi ise ka ọ gākwughachi n'ọnọdu ehi ahu, ma-ọbu aturu anọ ka ọ gākwughachi n'ọnọdu aturu ahu.
2
Ọ buru na ahú onye-ori ka ọ nētipú ulo, ewe tib͕ue ya, o we nwua, ọ dighi ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya.
3
Ọ buru na anyanwu awakwasi ya, ikpe-ọmuma ọbara gādi bayere ya: ọ ghaghi ikwu-ghachi; ọ buru na o nweghi ihe, agēre kwa ya n'ihi ori-ya.
4
Ọ buru na achọta ihe ahu n'aka-ya n'ezie, bú nke o zuru n'ori, ma ọ bu ehi, ma-ọbu inyinya-ibu, ma-ọbu aturu, na ndu; ọ gākwughachi okpukpu abua.
5
Mb͕e onye ọ bula gēme ka anumanu ta nri n'ubi ma-ọbu n'ubi-vine, o we zipu anumanu-ya, o we ta nri n'ubi onye ọzọ; ihe kachasi nma nke ubi-ya, na ihe kachasi nma nke ubi-vine-ya, ka ọ gākwughachi.
6
Mb͕e ọku gāb͕a, we b͕akuru ogwu, ọku ahu we richapu obo ọka, ma-ọbu ọka guzoro eguzo, ma-ọbu ọhia; onye mere ka ọku ahu b͕a aghaghi ikwughachi.
7
Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya ego ma-ọbu ihe idebe, ewe zue ya n'ulo nwoke ahu; ọ buru na achọta onye-ori ahu, ọ ghaghi ikwughachi okpukpu abua.
8
Ọ buru na achọtaghi onye-ori ahu, onye-nwe ulo ahu gābiakute Chineke nso, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe madu-ibe-ya jetara n'ozi.
9
Okwu bayere ihe-njehie ọ bula, ma ọ bu okwu bayere ehi, bayere inyinya-ibu, bayere aturu, bayere uwe-nb͕okwasi, bayere ihe ọ bula furu efu, nke madu nāsi, Nka bu ya, Chineke ka okwu ha abua gābiakute; onye Chineke gāma ikpe, ọ gākwughachi ibe-ya okpukpu abua.
10
Mb͕e onye ọ bula gēnye ibe-ya inyinya-ibu, ma-ọbu ehi, ma-ọbu aturu, ma-ọbu anumanu ọ bula, idebe: o we nwua, ma-ọbu ihe meruru ya aru, ma-ọbu adọta ya n'agha, ma ọ dighi onye nāhu ya:
11
Iyi nke Jehova gādi n'etiti ha abua, imara ma o setipughi aka-ya n'aru ihe ibe-ya jetara n'ozi; onye-nwe anumanu ahu gānara ya, ọ gaghi-akwughachi kwa.
12
Ma o buru na ezuru ya n'ori n'aka-ya n'ezie, ọ gākwughachi onye-nwe-ya.
13
Ọ buru na anu ọhia dọb͕uru ya n'ezie, ya webata ya ka ọ buru ihe-àmà; ọ gaghi-akwughachi ihe anu-ọhia dọb͕uru.
14
Mb͕e onye ọ bula gāriọta anumanu n'aka ibe-ya, ihe we meru ya aru, ma-ọbu ọ nwua, mb͕e onye-nwe-ya nānọghi yere ya, ọ ghaghi ikwughachi.
15
Ọ buru na onye-nwe-ya nọyere ya, ọ gaghi-akwughachi: ọ buru na ọ bu ihe egoro ọlu, ọ biara n'ihi ugwọ-ọlu-ya.
16
Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya.
17
Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.
18
Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.
19
Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua.
20
Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.
21
Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.
22
Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.
23
Ọ buru na i weda ya n'ala ma-ọli, ọ we tikuem n'uzọ ọ bula n'ezie, aghaghm inu ntiku-ya;
24
iwem gādi ọku, M'gēwere kwa mma-agha b͕ue unu; nwunye-unu gāghọ ndinyom di-ha nwuru, umu-unu gāghọ kwa umu-nb͕ei.
25
Ọ buru na i binye onye ọ bula n'etiti ndim ego, bú onye ewedara n'ala, onye gi na ya nọ, aburula ya dika onye nānara ọmuru-nwa; unu atukwasi-kwa-la ya uma.
26
Ọ buru na i were uwe-nb͕okwasi madu-ibe-gi n'ihe-ibe ma-ọli, mb͕e ọdida-anyanwu ruru ka i gēwere ya nyeghachi ya:
27
n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu.
28
Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.
29
Alala azú inye ùjú-gi na ihe-ọṅuṅu-gi. Nwa-nwoke eburu uzọ mu nime umu-gi ndikom ka i gēnyem.
30
Otú a ka i gēmere ehi-gi, na ìgwè ewu na aturu-gi: ubọchi asa ka ya na nne-ya gānọ: n'ubọchi nke-asatọ i gēwere ya nyem.
31
Ndi di nsọ ka unu gāburum: unu eri-kwa-la anu nke anu-ọhia dọb͕uru n'ọhia; nkita ka unu gātudara ya.
← Chapter 21
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 23 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40