bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 27
Exodus 27
Igbo 2006
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 28 →
1
I gēme kwa ebe-ichu-àjàm ahu; ọ gābu osisi acacia, cubit ise bu ogologo-ya, cubit ise bu kwa obosara-ya; ebe-ichu-àjà ahu gēnwe akuku anọ ra nrata: cubit atọ ka idi-elu-ya gādi kwa.
2
I gēme kwa mpì-ya n'elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla.
3
I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.
4
I gēme-kwa-ra ya ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me; i gēme kwa nb͕a-aka ọla anọ n'elu ub͕u ọla ahu, n'elu nsọtu-ya anọ.
5
I gētiye ya n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ebe-ichu-àjà ahu n'okpuru, ka ub͕u ọla ahu we rue na nkera ebe-ichu-àjà ahu.
6
I gēme-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nkpa-n'aka, bú nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla.
7
Agēme ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu, nkpa-n'aka ahu gādi kwa n'elu akuku abua nke ebe-ichu-aja, mb͕e anēbu ya.
8
I gēwere ibo me ya ka ọ di ka ib͕e: dika emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a, otú a ka ha gēme ya.
9
I gēme kwa ogige ebe-obibi ahu: akuku Ndida nke chere iru na Ndida gēnwe ákwà-ngechi igechi ogige ahu nke ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ọgu cubit ise n'ogologo gādiri otù akuku ahu:
10
ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha.
11
Otú a akuku Ugwu gēnwe kwa n'ogologo-ya ákwà-ngechi ọgu cubit ise n'ogologo, ide-ya gādi orú, ukwu-ha kwa orú, ha gābu ọla; nkpọye nile nke ide ahu na ngegide nile ha gābu ọla-ọcha.
12
Obo-sara ogige ahu n'akuku Ọdida-anyanwu gēnwe kwa ákwà-ngechi nke ọgu cubit abua na iri: ide-ha gādi iri, ukwu-ha iri kwa.
13
Obosara ogige ahu n'akuku Iru-anyanwu nke chere iru n'ọwuwa-anyanwu gādi ọgu cubit abua na iri.
14
Ákwà-ngechi cubit iri na ise ka otù akuku ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa.
15
Akuku nke-ọzọ nke ọnu-uzọ-ama-ya gēnwe kwa ákwà-ngechi cubit iri na ise: ide-ha gādi atọ, ukwu-ha atọ kwa.
16
Ọnu-uzọ-ama nke ogige ahu gēnwe kwa ákwà-nkwuchi orú cubit, nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọdudu-ákwà: ide-ha gādi anọ, ukwu-ha anọ kwa.
17
Ide nile nke ogige ahu buruburu gabu ihe egegidere ngegide n'ọla-ọcha; nkpọye-ha gābu ọla-ọcha; ma ukwu-ha gābu ọla.
18
Ogologo nke ogige ahu gābu ọgu cubit ise, obosara-ya gābu ọgu abua na iri ọgu abua na iri, idi-elu-ya gābu cubit ise; ọ gābu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ma ukwu-ha gābu ọla.
19
Ihe nile nke ebe-obibi ahu n'òfùfè-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ǹtú nile nke ogige ahu, gābu ọla.
20
Ma gi onwe-gi, i gēnye umu Israel iwu, ka ha wetara gi manu olive anāgwaghi agwa nke asuru asu, itiye n'ihe nēnye ìhè, iweli oriọna mb͕e dum.
21
N'ulo-ikwū nzute, bú n'èzí ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ihe-àmà, ka Eron na umu-ya ndikom gēdo ya n'usoro site n'anyasi rue ututu n'iru Jehova: ọ gābu ukpuru mb͕e ebighi-ebi rue ọb͕ọ-ha nile site n'umu Israel.
← Chapter 26
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 28 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40