bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 3
Exodus 3
Igbo 2006
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 4 →
1
Ma Moses nāzù ìgwè ewu na aturu nke Jetro, bú nna nwunye-ya, bú onye-nchu-àjà Midian: ọ we duru ìgwè ewu na aturu ahu ga n'azu ọzara, ọ we biarue ugwu nke Chineke, rue Horeb.
2
Mọ-ozi nke Jehova we me ka ọ hu ya anya n'ire ọku site n'etiti osisi ntà: o we hu, ma, le, osisi ntà ahu nēre ọku, ma erepiaghi osisi ntà ahu.
3
Moses we si, Ka m'wezuga onwem, hu oké ihe-ọhuhu nka; gini mere osisi ntà ahu nējighi rechapu?
4
Jehova we hu na o wezugara onwe-ya ihu, Chineke we si n'etiti osisi ntà ahu kpọ ya òkù, si, Moses, Moses. Ọ si, Lekwam.
5
Ọ si, Abiarula nso ebe a: yipu akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi abua, n'ihi na ebe nke gi onwe-gi nēguzo n'elu ya, ala nsọ ka ọ bu.
6
Ọ si kwa, Mu onwem bu Chineke nke nna-gi, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob. Moses we zobe iru-ya; n'ihi na ọ nātu egwu ilegide Chineke anya.
7
Jehova we si, Ahuwom n'ezie nweda-n'ala nke ndim nke di n'Ijipt, anuwokwam iti-nkpu-ha n'ihi ndi nāchi ha n'ihe-ike; n'ihi na amawom ihe-nb͕u-ha nile;
8
M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.
9
Ma ub͕u a, le, iti-nkpu umu Israel eruwom nti: ọzọ kwa, ahuwom nmeb͕u nke ndi Ijipt nēmeb͕u ha.
10
Ub͕u a kwa, bia, M'gēzì kwa gi jekuru Fero; gi me kwa ka ndim, bú umu Israel, si n'Ijipt puta.
11
Ma Moses siri Chineke, Ònye ka m'bu, na m'gējekuru Fero, na m'gēme kwa ka umu Israel si n'Ijipt puta?
12
Ọ si, N'ihi na Mu na gi gānọ; nka bu-kwa-ra gi ihe-iriba-ama na Mu onwem ezigawo gi: mb͕e i gēme-wori ka ndim si n'Ijipt puta, unu gēfè Chineke n'elu ugwu a.
13
Moses we si Chineke, Le, mb͕e mu onwem nābiakute umu Israel, si ha, Chineke nke nna-unu-hà ezitewom n'ebe unu nọ; mb͕e ha gāsikwam, Gini bu aha-Ya? ọ̀ bu gini ka m'gāsi ha?
14
Chineke we si Moses, ABUM IHE M'BU: Ọ si kwa, Otú a ka i gāsi umu Israel, ABUM ezitewom n'ebe unu nọ.
15
Chineke si-kwa-ra Moses ọzọ, Otú a ka i gāsi umu Israel, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham, na Chineke nke Aisak, na Chineke nke Jekob, O zitewom n'ebe unu nọ: nka bu aham rue mb͕e ebighi-ebi, nka bu kwa ihe-nchetam rue ọb͕ọ nile.
16
Je, chikọta ndi-okenye Israel, si ha, Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, Chineke nke Abraham na Aisak na Jekob, Ọ mewom ka m'hu Ya anya, Ọ si, Eletawom unu n'ezie, hu kwa ihe anēme unu n'Ijipt:
17
M'we si, M'gēme ka unu si na nweda-n'ala nke Ijipt rigorue ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Perizait na ndi-Haivait na ndi Jebus, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya.
18
Ha gēge kwa nti n'olu-gi: i gābiakute kwa eze Ijipt, gi onwe-gi na ndi-okenye Israel, unu gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, ezutewo ayi: ub͕u a kwa, biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, ka ayi we chuara Jehova, bú Chineke-ayi, àjà.
19
Ma Mu onwem mara na eze Ijipt agaghi-ekwe unu je, é-è, ọ bughi n'aka di ike.
20
M'gēsetipu kwa akam, tib͕u Ijipt n'oké ọlum nile nke M'gālu n'etiti ya: emesi kwa o gēzilaga unu.
21
M'gēnye kwa ndi nka amara n'iru ndi Ijipt: o gēru kwa, mb͕e unu nāla, na unu agaghi-ab͕a aka la;
22
ma nwayi ọ bula gāriọta n'aka nwayi-ab͕ata-obi-ya, na n'aka nwayi nọ n'ulo-ya dika ọbìa, ihe ọla-ọcha, na ihe ọla-edo, na uwe-nb͕okwasi: unu gētiye kwa ha n'aru umu-unu ndikom na n'aru umu-unu ndinyom; unu gānapu kwa ndi Ijipt ihe-ha n'aka.
← Chapter 2
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 4 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40