bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 32
Exodus 32
Igbo 2006
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 33 →
1
Ndi Israel we hu na Moses nọrọ ọdù isi n'ugwu ahu ridata, ndi ahu we kpọkọta onwe-ha n'ebe Eron nọ, si ya, Bilie, mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi; n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.
2
Eron we si ha, Tijipunu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti nke nwunye-unu, na nke umu-unu ndikom, na nke umu-unu ndinyom, chitaram ha.
3
Ndi ahu nile we tijipu nb͕a-aka ọla-edo nke di nime nti-ha, chitara ha Eron.
4
Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.
5
Eron we hu ya, we wue ebe-ichu-àjà n'iru ya; Eron we kpọ òkù, si, Ememe ka agēmere Jehova echi.
6
Ha we bilie n'isi-ututu n'echi-ya, sure àjà-nsure-ọku, chita kwa ihe àjà-udo; ndi ahu we nọdu ala iri ihe na iṅu ihe, ha we bilie igwu egwú.
7
Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, rida; n'ihi na ndi-gi, nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, ebibiwo onwe-ha:
8
ha esiwo n'uzọ nke M'nyere ha n'iwu wezuga onwe-ha ngwa ngwa: ha eme-woro onwe-ha nwa-ehi akpuru akpu, ha we kpọ isi ala nye ya, chu-kwa-ra ya àjà, si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.
9
Jehova si-kwa-ra Moses, Ahuwom ndi nka, ma, le, ndi kwesiri olu ike ka ọ bu:
10
ma ub͕u a kwe ka M'nọduru Onwem, ka iwem we di ọku megide ha, ka M'we me kwa ka ha gwusia; M'gēme kwa gi ka i buru mba uku.
11
Moses we chọ ime ka iwe Jehova, bú Chineke-ya, dajua, ọ si, Jehova, n'ìhi gini ka iwe-Gi di ọku megide ndi-Gi, nke I meworo ka ha si n'ala Ijipt puta n'ike uku na n'aka di ike?
12
N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.
13
Cheta Abraham, na Aisak, na Israel, bú ndi-orù-Gi, ndi I ji Onwe-gi ṅuru iyi, I we gwa ha okwu, si, M'gēme ka nkpuru-unu ba uba dika kpakpando nke elu-igwe, ala nka nile kwa nke M'kwuworo okwu bayere ya, M'gēnye nkpuru-gi ya, ha gēketa kwa ya rue mb͕e ebighi-ebi.
14
Jehova we chegharia uche bayere ihe ọjọ nke O kwuru, si na Ọ gēme ndi-Ya.
15
Moses we chigharia, si n'ugwu ahu rida, mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka-ya; bú mbadamba nkume nke edere ihe n'iru ha abua; n'otù iru na n'iru nke-ọzọ ka edeworo ihe n'elu nkume ahu.
16
Mbadamba nkume ahu, ọlu Chineke ka ha bu; odide ahu kwa, odide Chineke ka ọ bu, bú eb͕ub͕u eb͕uru n'elu mbadamba nkume abua ahu.
17
Joshua we nu olu ndi Israel ka ha nēti nkpu, ọ we si Moses, Olu agha di n'ọmuma-ulo-ikwū.
18
Ọ si, Ọ bughi olu ndi nāza n'idi-ike, ọ bughi kwa olu ndi nāza n'adighi-ike; olu ndi nāza n'ibù abù ka mu onwem nānu.
19
O rue, mb͕e ọ biaruru ọmuma-ulo-ikwū ahu nso, na ọ huru nwa-ehi ahú na otite-egwú ahu: iwe Moses we di ọku, o we tupu mbadamba nkume ahu n'aka-ya, tupia ha n'okpuru ugwu ahu.
20
O we were nwa-ehi ahu nke ha mere, sure ya n'ọku, gwe ya rue mb͕e o mere irighiri, o we fesa ya n'elu miri, me ka umu Israel ṅua ya.
21
Moses we si Eron, Gini ka ndi nka mere gi, na i mewo ka nmehie uku biakwasi ha?
22
Eron we si, Ka iwe onye-nwem ghara idi ọku: gi onwe-gi amawo ndi nka, na ọ bu nime ihe ọjọ ka ha nọ.
23
Ha we sim, Mere ayi chi, ndi ganēje n'iru ayi: n'ihi na Moses a, bú nwoke nke mere ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa, ayi amaghi ihe meworo ya.
24
M'we si ha, Onye ọ bula nke nwere ọla-edo, ka ha tijipu ya n'aru ha; ha we nyem: m'we tubà ya n'ọku, nwa-ehi a we puta.
25
Moses we hu ndi ahu na ndi nādighi nchikọta ka ha bu; n'ihi na Eron emewo ka ha ghara idi nchikọta, ka ha buru ihe-ntakwu n'etiti ndi nēbili imegide ha:
26
Moses we guzo n'ọnu-uzọ-ama nke ọmuma-ulo-ikwū ahu, si, Ònye diri Jehova? ya biakutem. Umu-ndikom Livai nile we chikọta onwe-ha n'ebe ọ nọ.
27
Ọ si ha, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, Turunu, Nwoke ọ bula n'etiti unu, ya turu mma-agha-ya n'apata-ukwu-ya, gabiganu bia-ghachi kwa site n'otù ọnu-uzọ-ama rue ọnu-uzọ-ama ọzọ n'ọmuma-ulo-ikwū a nile, b͕u-kwa-nu, nwoke ọ bula, ya b͕ue nwa-nne-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue eyì-ya, nwoke ọ bula, ya b͕ue onye-aru-ya.
28
Umu-ndikom Livai we me dika okwu Moses si di: ihe ra ka nnù ndikom asa na ọgu iri we si n'etiti ndi Israel da n'ubọchi ahu.
29
Moses we si, Mejuenu aka-unu ta nye Jehova, n'ihi na nwoke ọ bula nēmegide nwa-ya nwoke, nēmegide kwa nwa-nne-ya nwoke; ka Ọ we nye unu ngọzi ta.
30
O rue, n'echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m'gārigokuru Jehova; eleghi anya m'gēkpuchi nmehie-unu.
31
Moses we jeghachikuru Jehova, si, Biko, ndi nka emehiewo nmehie uku, mere onwe-ha chi ọla-edo.
32
Ma ub͕u a, ọ buru na I gāb͕aghara nmehie-ha; ma ọ buru na I meghi ya, biko, hichapum n'akwukwọ-Gi nke I deworo.
33
Jehova we si Moses, Onye ọ bula nke mehieworo megidem, ya ka M'gēhi-chapu n'akwukwọm.
34
Ma ub͕u a, je, duru ndim rue ebe ahu nke M'gwaworo gi okwu bayere ya: le, mọ-ozim ganēje n'iru gi: ma n'ubọchi mb͕e M'nēleta, M'gēwere kwa nmehie-ha leta ha.
35
Jehova we tie ndi Israel ihe, n'ihi na ha mere nwa-ehi ahu, nke Eron mere.
← Chapter 31
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 33 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40