bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 28
Exodus 28
Igbo 2006
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 29 →
1
Ma gi onwe-gi, me ka Eron, bú nwa-nne-gi, ya na umu-ya ndikom, si n'etiti umu Israel biakute gi nso, ka ọ we burum onye-nchu-aja, bú Eron, ya na Nedab na Abaihu, na Eleeza na Itama, bú umu-ndikom Eron.
2
I gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, uwe nsọ, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma.
3
Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M'mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja.
4
Ndia bu uwe ha gēme; ihe-ib͕ochi-obi, na ephod, na uwe-nwuda, na uwe-ime turu agwa, na nkechi isi, na ihe ike n'úkwù: ha gēme-kwa-ra Eron, bú nwa-nne-gi, na umu-ya ndikom, uwe nsọ, ka ọ we burum onye-nchu-àjà.
5
Ndi ahu gēwere kwa ọla-edo ahu, na ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, na ezi ákwà ọcha ahu.
6
Ha gēme kwa ephod ahu; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, bú ọlu onye-ọ̀kà.
7
Ọ gēnwe kwa ubu abua ejikọtara na nsọtu-ya abua; ka ewe jikọta ya n'otù.
8
Ihe-ọkiké nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, ọ gādi ka ọlu aluru ya si di, o gēsite kwa na ya; ọ gābu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.
9
I gēwere kwa nkume onyx abua, b͕unye aha umu Israel n'elu ha:
10
itinye aha ha n'elu otù nkume, aha nke umu Israel isī nke fọduru n'elu nkume nke-ọzọ, dika ọmumu nile ha si di.
11
Ọlu nke onye-ọ̀kà na nkume ka a gēji b͕u eb͕ub͕u nkume abua ahu, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di: i gēme ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu.
12
I gētiye kwa nkume abua ahu n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: Eron gēbu kwa aha-ha n'iru Jehova n'elu ubu-ya abua, ibu ihe-ncheta.
13
I gēme kwa ihe ọla-edo akpara akpà:
14
na iyab͕a abua nke ọla-edo anāgwaghi agwa; dika eriri-nma ka i gēme ha, ihe emere dika udọ̀ aturu atu; i gētiye kwa iyab͕a ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu ihe ọla-edo ahu akpara akpà.
15
I gēme kwa ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé, ọ gābu ọlu nke onye-ọ̀kà; dika ọlu aluru n'ephod ahu ka i gēme ya; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, ndia ka i gēji me ya.
16
Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu, ihe apiajiri apiaji, ntù-aka ka ogologo-ya gādi, ntù-aka ka obosara-ya gādi kwa.
17
I gāhiọgide kwa nime ya nhiọgide nkume, eriri nkume anọ: eriri sardius na topaz na carbuncle gābu eriri mbu;
18
eriri nke-abua gābu emerald na sapphire na diamond;
19
eriri nke-atọ gābu jacinth na agate na amethyst:
20
eriri nke-anọ gābu beryl na onyx na jasper: agētiye ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha.
21
Nkume ahu gādi ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha gādiri ebo iri na abua ahu.
22
I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu; ha gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.
23
I gēme kwa n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.
24
I gētiye kwa iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.
25
Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, i gētiye ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu n'ebe iru-ya di.
26
I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.
27
I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.
28
Ha gēwere kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu.
29
Eron gēbu kwa aha umu Israel n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n'elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n'iru Jehova mb͕e dum.
30
I gētiye kwa n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n'elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n'iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n'elu obi-ya n'iru Jehova mb͕e dum.
31
I gēme kwa uwe-nwuda ephod, ọ gābusi ogho anunu ogho anunu.
32
Ọnu nke isi-ya gādi n'etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya.
33
I gēme kwa n'ọnu-ọnu-ala-ya pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, n'ọnu-ọnu-ala-ya buru-buru; i gēme kwa ataṅu ọla-edo n'etiti ha buruburu.
34
Otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, otù ataṅu ọla-edo na otù pomegranate, gādi n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu.
35
Ọ gādi kwa n'aru Eron iji je ozi: aganānu kwa olu-ya mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ n'iru Jehova, ya na mb͕e ọ nāputa, ka ọ we ghara inwu.
36
I gēme kwa ihe di mbara nke ọla-edo anāgwaghi agwa, i gēb͕u kwa n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.
37
I gātukwasi ya n'eriri-nma ogho anunu, ọ gādikwasi n'ákwà-nkukù-isi ahu; n'iru ákwà-nkukù-isi ka ọ gādi.
38
Ọ gādi kwa n'egedege-iru Eron, Eron gēbu kwa ajọ omume nke ihe nsọ nile, nke umu Israel gēdo nsọ n'onyinye nsọ ha nile; ọ gādi n'egedege-iru-ya mb͕e dum, ka ha we buru ihe nātọ utọ n'iru Jehova.
39
I gātu-kwa-ra uwe-ime-ya nke ezi ákwà ọcha agwa, i gēme kwa akwa nkechi nke ezi ákwà ọcha, i gēme kwa ihe ike n'úkwù, ọ gābu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà.
40
Umu-ndikom Eron ka i geme-kwa-ra uwe-ime, me-kwa-ra ha ihe ike n'úkwù, ihe ike n'isi ka i gēme-kwa-ra ha, ibu ihe-nsọpuru na ihe mara nma.
41
I gēyi-kwasi ha n'aru Eron, bú nwa-nne-gi, na n'aru umu-ya ndikom tiyere ya; i gēte kwa ha manu, meju aka-ha, do ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà.
42
Gi me-kwa-ra ha uwe-úkwú ákwà ọcha ikpuchi anu-aru ọtọ-ha; site n'úkwù we rue apata-ukwu ka ha gādi:
43
ha gādi n'aru Eron na n'aru umu-ya ndikom, mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ma-ọbu mb͕e ha nābiaru nso ebe-ichu-àjà ahu ije ozi n'ebe nsọ ahu, ka ha we ghara iburu ajọ omume, we nwua: ukpuru mb͕e ebighi-ebi ka ọ gāburu ya, buru kwa nkpuru-ya gānọchi ya.
← Chapter 27
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 29 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40