bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 39
Exodus 39
Igbo 2006
← Chapter 38
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 40 →
1
Ha site-kwa-ra n'ogho anunu ahu, na ogho ododo ahu, na ogho uhie ahu, me uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, me kwa uwe nsọ nile nke Eron nwere; dika Jehova nyere Moses iwu.
2
Ọ mekwara ephod ahu, ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.
3
Ha we tisa mbadamba ihe ọla-edo ahu, we bìri ya ka ọ buru eriri, ikpa n'etiti ogho anunu ahu, na n'etiti ogho ododo ahu, na n'etiti ezi ákwà ọcha ahu, ọ bu ọlu onye-ọ̀kà.
4
Ha we mere ya ubu abua ejikọtara: na nsọtu-ya abua ka ejikọtara ya.
5
Ihe-ọkiké ahu nke onye-ọ̀kà kpara, nke di n'elu ya, nke eji ke ya, o site-kwa-ra na ya, ọ di kwa ka ọlu aluru ya si di; ọ bu ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma; dika Jehova nyere Moses iwu.
6
Ha mekwara nkume onyx ahu, nke emere ka ihe ọla-edo akpara akpà b͕a ha buruburu, nke eb͕uru ha eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, dika aha umu Israel si di.
7
O tiye ha n'elu ubu ephod, iburu umu Israel nkume ncheta: dika Jehova nyere Moses iwu.
8
Ọ mekwara ihe-ib͕ochi-obi ahu, ọ bu ọlu nke onye-ọ̀kà, dika ọlu aluru n'ephod ahu; ọla-edo, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma.
9
Ihe nwere akuku anọ ra nrata ka o bu; ha mere ihe-ib͕ochi-obi ahu ka ọ buru ihe apiajiri apiaji: ntù-aka ka ogologo-ya di, ntù-aka ka obosara-ya di kwa, mb͕e apiajiri ya.
10
Ha hiọgide-kwa-ra nime ya ariri nkume anọ: ariri sardius na topaz na carbuncle bu ariri mbu.
11
Ariri nke-abua bu emerald na sapphire na diamond.
12
Ariri nke-atọ bu jacinth na agate na amethyst.
13
Ariri nke-anọ bu beryl na onyx na jasper: etiyere ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha.
14
Nkume ahu di ka aha umu Israel si di, iri na abua, dika aha-ha si di; dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, onye ọ bula dika aha-ya si di, ha diri ebo iri na abua ahu.
15
Ha mekwara n'elu ihe-ib͕ochi-obi ahu iyab͕a emere dika eriri-nma, bú ihe emere dika udọ̀ aturu atu, ha bu ọla-edo anāgwaghi agwa.
16
Ha me-kwa-ra ihe ọla-edo abua akpara akpà, na nb͕a-aka ọla-edo abua: ha we tiye nb͕a-aka abua ahu n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi.
17
Ha tiye-kwa-ra iyab͕a ọla-edo abua ahu aturu atu dika udọ̀ n'elu nb͕a-aka abua ahu di na nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu.
18
Nsọtu abua ọzọ nke iyab͕a abua ahu aturu atu dika udọ̀, ha tiye-kwa-ra ha n'elu ihe ọla-edo abua ahu akpara akpà, tiye ha n'elu ubu ephod ahu, n'ebe iru-ya di.
19
Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.
20
Ha mekwara nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.
21
Ha were kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu; dika Jehova nyere Moses iwu.
22
Ó mekwara uwe-nwuda ephod, ọ bu ọlu ọkpa-akwà, ọ busi ogho anunu ogho anunu;
23
ọnu uwe-nwuda ahu di n'etiti ya, dika ọnu nke uwe-obi agha, ọnu-ọnu ka ọnu-ya nwere buruburu, ka ewe ghara idọwa ya.
24
Ha mekwara n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu pomegranate nke ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ákwà akpara nke-ọma.
25
Ha mekwara ataṅu ọla-edo anāgwaghi agwa, tiye ataṅ ahu n'etiti pomegranate ahu n'elu ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, n'etiti pomegranate ahu;
26
otù ataṅu na otù pomegranate, otù ataṅ na otù pomegranate, di n'ọnu-ọnu-ala uwe-nwuda ahu buruburu, iji je ozi; dika Jehova nyere Moses iwu.
27
Ha we mere Eron, mekwara umu-ya ndikom, uwe-ime ahu, ha bu ezi ákwà ọcha, ọlu nke ọkpa-ákwà,
28
na ákwà-nkukù-isi ahu, ọ bu ezi ákwà ọcha, na ihe ahu mara nma ike n'isi, ha bu ezi ákwà ọcha, na uwe-ukwu ahu nke ezi ákwà ọcha, ha bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma,
29
na ihe ahu ike n'úkwù, ọ bu ezi ákwà ọcha akpara nke-ọma, na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, ọ bu ọlu nke onye-ọdudu-ákwà; dika Jehova nyere Moses iwu.
30
Ha mekwara ihe di mbara nke okpu nsọ ahu nke onye-nchu-àjà, ọ bu ọla-edo anāgwaghi agwa, ha de ihe-odide n'elu ya, dika eb͕ub͕u nb͕a-aka-akàrà, IHE NSỌ JEHOVA NWERE.
31
Ha tiye-kwa-ra n'elu ya eriri-nma ogho anunu, itiye ya n'elu ákwà-nkukù-isi ahu n'elu; dika Jehova nyere Moses iwu.
32
Ewe me ka òfùfè nile nke ebe-obibi nke ulo-ikwū nzute gwusia: umu Israel we me dika ihe nile si di nke Jehova nyere Moses n'iwu, otú a ka ha mere.
33
Ha we butere Moses ebe-obibi ahu, Ulo-ikwū ahu, na ihe-ya nile, nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile;
34
na ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na ihe-nkpuchi akpukpọ seal, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi-ya;
35
na ib͕e ihe-àmà ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie ahu;
36
na table ahu, na ihe-ya nile, na achicha nke iru Chineke;
37
na ihe-idọba-oriọna ahu nke bu ọla-edo anāgwaghi agwa, na oriọna-ya nile, bú oriọna nke ido n'usoro, na ihe-ya nile, na manu nke ihe nēnye ìhè;
38
na ebe-ichu-àjà ọla-edo ahu, na manu otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi nke ọnu-uzọ Ulo-ikwū ahu;
39
na ebe-ichu-àjà ọla ahu, na ihe-ọkpukpa ọla nke o nwere, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu, na ukwu-ala-ya;
40
na ákwà-ngechi nile nke ogige ahu, na ide-ya nile, na ukwu ide-ya, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ-ama ogige ahu nwere, na udọ̀-ya nile, na ǹtú-ya nile, na ihe nile nke òfùfè ebe-obibi ahu, nke diri ulo-ikwū nzute ahu;
41
na uwe nile akpara nke-ọma, iji je ozi n'ebe nsọ ahu, na uwe nsọ nile Eron onye-nchu-àjà nwere, na uwe nile nke umu-ya ndikom, ibu ndi-nchu-àjà.
42
Dika ihe nile Jehova nyere Moses n'iwu si di, otú a ka umu Israel jere ozi-ya nile.
43
Moses we hu ojije-ozi ahu nile, ma, le, ha ejewo ya; dika Jehova nyere iwu, otú a ka ha jere ya: Moses we gọzie ha.
← Chapter 38
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 40 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40