bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 7
Exodus 7
Igbo 2006
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 8 →
1
Jehova we si Moses, Le, emewom i ka i ghọrọ Fero chi: Eron, bú nwa-nne-gi, gābu kwa onye-amuma-gi.
2
Gi onwe-gi gēkwu ihe nile nke M'nēnye gi n'iwu: Eron nwa-nne-gi gāgwa kwa Fero okwu, ka ọ we zipu umu Israel n'ala-ya.
3
Ma Mu onwem gēme ka obi Fero sie ike, M'gēme kwa ka ihe-iriba-amam na ihe-ebubem di ọtutu n'ala Ijipt.
4
Ma Fero agaghi-ege unu nti, M'gētiye kwa akam n'aru ndi Ijipt, were kwa ikpé uku di iche iche me ka usu nile nke ndi-agha nkem, bú ndim umu Israel, si n'ala Ijipt puta.
5
Ndi Ijipt gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'gēseti akam n'aru ndi Ijipt, me ka umu Israel si n'etiti ha puta.
6
Moses na Eron we me ya; dika Jehova nyere ha iwu, otú a ka ha mere.
7
Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu.
8
Jehova we gwa Moses na Eron okwu, si,
9
Mb͕e Fero gāgwa unu okwu, si, Merenu onwe-unu ihe-ebube: i gāsi kwa Eron, Were nkpa-n'aka-gi, tuda ya n'iru Fero, ka ọ ghọ ogologo anu.
10
Moses na Eron we bakuru Fero, me otú a, dika Jehova nyere ha iwu: Eron we tuda nkpa-n'aka-ya n'iru Fero, na n'iru ndi-orù-ya, ọ we ghọ ogologo anu.
11
Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.
12
Ha we tuda, nwoke ọ bula nkpa-n'aka-ya, ha we ghọ ogologo anu: ma nkpa-n'aka Eron lodara nkpa-n'aka-ha.
13
Obi Fero we di ike, Ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
14
Jehova we si Moses, Obi Fero di arọ́, ọ nāju izipu ndim.
15
Jekuru Fero n'ututu; le, ọ nāpu ije miri; i gēguzo onwe-gi n'usọ osimiri Nail izute ya; nkpa-n'aka ahu kwa nke b͕anwere ghọ agwọ, i gēwere ya n'aka-gi.
16
I gāsi kwa ya, Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, O zìwom biakute gi, si, Zipu ndim, ka ha we fèm n'ọzara: ma, le, i nughi rue ub͕u a.
17
Otú a ka Jehova siri, Nime nka ka i gāmara na Mu onwem bu Jehova: le, mu onwem gaje iwere nkpa-n'aka nke di n'akam tikwasi miri nke di n'osimiri Nail, ọ gāb͕anwe ghọ ọbara.
18
Azù nke di n'osimiri Nail gānwu, osimiri Nail gēsì kwa ísì; ndi Ijipt gāsọ iṅu miri si n'osimiri Nail puta oyi.
19
Jehova we si Moses, Si Eron, Were nkpa-n'aka-gi setipu aka-gi n'elu miri nile nke Ijipt, n'elu osimiri nile ha, na n'elu osimiri Nail nile ha, na n'elu ọdọ-miri nile ha, na n'elu ebe-nchikọta-miri-ha nile, ka ha we ghọ ọbara; ọbara gādi kwa n'ala Ijipt nile, ma n'ihe nke osisi ma n'ihe nke nkume.
20
Moses na Eron we me otú a, dika Jehova nyere iwu; ọ we welie nkpa-n'aka ahu tie miri nke di n'osimiri Nail, n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya; miri nile nke di n'osimiri Nail we b͕anwe ghọ ọbara.
21
Azù nke di n'osimiri Nail we nwua; osimiri Nail nēsì kwa ísì, ndi Ijipt apughi kwa iṅu miri si n'osimiri Nail puta; ọbara ahu we di n'ala Ijipt nile.
22
Ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a: obi Fero we di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova kwuru.
23
Fero we chigharia, ba n'ulo-ya, ma o tiyeghi obi-ya ọbuná na nka.
24
Ndi Ijipt nile we gwue olùlù buruburu osimiri Nail inwe miri-ọṅuṅu; n'ihi na ha apughi iṅu miri osimiri Nail.
25
Ubọchi asa we zue, ka Jehova tisiri osimiri Nail ihe.
← Chapter 6
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 8 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40