bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 30
Exodus 30
Igbo 2006
← Chapter 29
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 31 →
1
I gēme kwa ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-oku nēsì ísì utọ: osisi acacia ka i gēji me ya.
2
Otù cubit ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi kwa; ihe nwere akuku anọ ra nrata ka ọ gābu: cubit abua ka idi-elu-ya gādi kwa: mpì-ya nile gēsite na ya.
3
I gāmachita ya ọla-edo anāgwaghi agwa, elu-ya, na akuku-ya nile buruburu, na mpì-ya nile; i gēme-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.
4
Nb͕a-aka ọla-edo abua ka i gēme-kwa-ra ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, i gēme ha n'elu akuku-ya abua; ha gābu kwa ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya.
5
I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo.
6
I gētiye ya n'iru ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ib͕e ihe-àmà, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ebe M'gēzute gi.
7
Eron gēsure kwa n'elu ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me: kwa-ututu, mb͕e ọ nēdozi oriọna, ka ọ gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
8
Mb͕e Eron nēweli oriọna n'etiti ehihie na anyasi ka ọ gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ọ bu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure n'iru Jehova mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile.
9
Unu ewerela ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke ala ọzọ, ma-ọbu àjà-nsure-ọku, ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma, sure dika àjà n'elu ya; unu awusi-kwa-la àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya.
10
Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.
11
Jehova we gwa Moses okwu, si,
12
Mb͕e i nāguta ọnu-ọgugu umu Israel, dika ndi anāgukọta agukọta n'etiti ha si di, ha nile n'otù n'otù gēnye kwa Jehova ihe-nb͕aputa bayere nkpuru-obi-ha, mb͕e i nāgukọta ha; ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti ha mb͕e i nāgukọta ha.
13
Ihe a ka ha gēnye, onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, nkera shekel dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: (shekel bu orú gerah:) nkera shekel ahu bu àjà-nbuli anēbuliri Jehova.
14
Onye ọ bula nke nāgabiga n'ebe ndi agukọtaworo nọ, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, ọ gēnye àjà-nbuli nke Jehova.
15
Ọgaranya agaghi-enye kari, ma ob͕eye agaghi-enyebì kari, nkera shekel ahu, mb͕e ha nēnye àjà-nbuli nke Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
16
I gānara kwa ego nkpuchi-nmehie ahu n'aka umu Israel, nye ya n'òfùfè nke ulo-ikwū nzute; ka ọ we buru umu Israel ihe-ncheta n'iru Jehova, ikpuchiri nkpuru-obi-unu nmehie.
17
Jehova we gwa Moses okwu, si,
18
I gēme kwa ite ọsisa-miri, ọ gābu ọla, ukwu-ala-ya gābu kwa ọla, iji sa aru: i gētiye ya n'etiti ulo-ikwū nzute na ebe-ichu-àjà, tiye miri n'ebe ahu.
19
Eron na umu-ya ndikom gāsa aka-ha na ukwu-ha site na ya:
20
mb͕e ha nābà n'ulo-ikwū nzute, ha gāsa miri, ka ha we ghara inwu; ma-ọbu mb͕e ha nābiaru ebe-ichu-àjà nso ije ozi, isurere Jehova àjà-ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ:
21
ha gāsa kwa aka-ha na ukwu-ha, ka ha we ghara inwu: ọ gābu-kwa-ra ha ukpuru mb͕e ebighi-ebi, bú ya na nkpuru-ya rue ọb͕ọ-ha nile.
22
Jehova we gwa Moses okwu, si,
23
Gi onwe-gi kwa, chiri n'onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri,
24
na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin:
25
i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu.
26
I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu,
27
na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,
28
na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya.
29
I gēdo kwa ha nsọ, ka ha we buru ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile: ihe ọ bula nēmetu ha aru gādi nsọ.
30
Eron na umu-ya ndikom ka i gēte kwa manu, we do ha nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.
31
I gāgwa kwa umu Israel okwu, si, Manu otite-manu di nsọ ka nka gāburum rue ọb͕ọ-unu nile.
32
Ọ bughi n'anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu.
33
Onye ọ bula nke gāsugwa nke di ka ya, ma-ọbu onye ọ bula nke gēwere ufọdu nime ya tiye n'aru onye ala ọzọ, agēbipu ya n'etiti umu-nna-ya.
34
Jehova we si Moses, Chiri n'onwe-gi uda utọ di iche iche, stacte, na onycha, na galbanum; bú uda utọ, ha na frankincense anāgwaghi agwa: ha gāra n'ọtùtù;
35
i gēme ya ka ọ buru ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ, nke etiyere nnú, nke anāgwaghi agwa, di kwa nsọ:
36
i gēsu kwa ufọdu nime ya ka ọ di irighiri, were ufọdu nime ya tiye n'iru ihe-àmà ahu n'ulo-ikwū nzute, ebe M'gēzute gi; ihe nsọ kachasi ihe nsọ nile ka ọ gāburu unu.
37
Ma ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke i gēme, unu emerela onwe-unu nke di ka ya n'ọtùtù-ya: nsọ ka ọ gādiri gi n'ebe Jehova nọ.
38
Onye ọ bula nke gēme nke di ka ya, inu ísì-ya, agēbipu kwa ya n'etiti umu-nna-ya.
← Chapter 29
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 31 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40