bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 33
Exodus 33
Igbo 2006
← Chapter 32
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 34 →
1
Jehova we gwa Moses okwu, si, Je, si n'ebe a rigo, gi onwe-gi na ndi ahu nke i mere ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, rue ala ahu nke M'ṅuru Abraham iyi, ṅu-kwa-ra Aisak, ṅu-kwa-ra Jekob, si, Nkpuru-gi ka M'gēnye ya:
2
M'gēziga kwa mọ-ozi n'iru gi; M'gāchupu kwa ndi Kenean, na ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus:
3
rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya: n'ihi na M'gaghi-arigo n'etiti gi; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu: ka M'we ghara ime ka i gwusia n'uzọ.
4
Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n'aru ya.
5
Jehova we si Moses, Si umu Israel, Unu onwe-unu bu ndi kwesiri olu ike: asi na ọ bu otù ntabi-anya ka M'gārigo n'etiti gi, M'gēme kwa ka i gwusia; ma ub͕u a wepu ihe-ichọ-nma-gi nile n'aru gi tọb͕ọ, M'we mara ihe M'gēme gi.
6
Umu Israel we napusi onwe-ha ihe-ichọ-nma-ha nile site n'ugwu Horeb gaba.
7
Ma Moses nēwere ulo-ikwū ahu, nāmara onwe-ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, n'ebe di anya site n'ọmuma-ulo-ikwū ahu; ọ we kpọ ya, Ulo-ikwū nzute. O rue, na onye ọ bula nke nāchọ Jehova nāpu je ulo-ikwū nzute ahu nke di n'azu ọmuma-ulo-ikwū.
8
O rue, mb͕e Moses puru ije Ulo-ikwū ahu, na ndi Israel nile biliri, guzo onwe-ha ọtọ, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya, nēlegide Moses anya n'azu, rue mb͕e ọ bara n'Ulo-ikwū ahu.
9
O rue, mb͕e Moses batara n'Ulo-ikwū ahu, na ogidi igwe-oji ahu ridatara, guzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū: Jehova we gwa Moses okwu.
10
Ndi Israel nile we hu ogidi igwe-oji ka o nēguzo n'ọnu-uzọ nke Ulo-ikwū ahu: ndi ahu nile we bilie, kpọ isi ala, nwoke ọ bula n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū-ya.
11
Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua.
12
Moses we si Jehova, Le, Gi onwe-gi nāsim, Me ka ndi nka rigota: ma Gi onwe-gi emeghi ka M'mara onye I gēziga ka mu na ya yikọ je. Ma Gi onwe-gi asiwo, Amawom i n'aha, ọzọ kwa, i hutawo amara n'irum.
13
Ma ub͕u a, biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi, biko, mem ka m'mara uzọ-Gi nile, m'gāmara kwa Gi, ka m'we huta amara n'iru Gi: Gi le kwa na ndi-Gi ka mba nka bu.
14
Ọ si, Irum ganēje, M'gēme kwa ka i zuru ike.
15
Ọ si Ya, Ọ buru na iru-Gi adighi-eje, emela ka ayi si n'ebe a rigo.
16
N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka agāmara ub͕u a na ahutawom amara n'iru Gi, mu onwem na ndi-Gi? ọ̀ bughi n'ojije I nēsoro ayi je, ewe kewapu ayi, bú mu onwem na ndi-Gi, n'ebe ndi nile nọ ndi bi n'elu uwa.
17
Jehova we si Moses, Ihe a nke i kwuworo, M'gēme kwa ya: n'ihi na i hutawo amara n'irum, amawokwam i n'aha.
18
Ọ si, Biko, me ka m'hu ebube-Gi.
19
Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya.
20
Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n'ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu.
21
Jehova we si, Le, ọnọdu di n'akukum, i gēguzo kwa onwe-gi ọtọ n'elu oké nkume ahu.
22
O gēru kwa, mb͕e ebubem nāgabiga, na M'gētiye gi nime oghere nke oké nkume ahu, b͕asa ọbu-akam b͕ochita gi, rue mb͕e M'gabiga-woro:
23
M'gēwezuga kwa ọbu-akam, i gāhu kwa azum anya: ma agaghi-ahu irum anya.
← Chapter 32
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 34 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40