bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 16
Exodus 16
Igbo 2006
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 17 →
1
Ha si n'Ilim bulie ije, nzukọ nile nke umu Israel we ba n'ọzara Sin, nke di n'etiti Ilim na Sainai, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa nke-abua site n'ọpupu-ha n'ala Ijipt.
2
Nzukọ nile nke umu Israel we tamu ntamu megide Moses, megide kwa Eron, n'ọzara ahu:
3
umu Israel we si ha, Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi nwururi n'aka Jehova n'ala Ijipt, mb͕e ayi nọduru n'akuku ite anu, mb͕e ayi rijuru nri afọ; n'ihi na unu emewo ka ayi puta ba n'ọzara nka, iwere agu me ka nkpọkọta nka nile nwua.
4
Jehova we si Moses, Le, M'gaje ime ka nri si n'elu-igwe zoro unu dika miri; ndim gāpu, chikọta ihe nke otù ubọchi n'ubọchi-ya, ka M'we nwa ha, ma ha gēje ije n'iwum, ma-ọbu na ha agaghi-eje.
5
O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi.
6
Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta:
7
n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?
8
Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.
9
Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n'iru Jehova: n'ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu.
10
O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.
11
Jehova we gwa Moses okwu, si,
12
Anuwom ntamu nile nke umu Israel: gwa ha okwu, si, N'etiti ehihie na anyasi ka unu gēri anu, n'ututu ka unu gēriju kwa afọ na nri; unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.
13
O rue, n'anyasi, na nnunu quail rigotara, kpuchie ebe ọmuma-ulo-ikwū-ha: n'ututu igirigi we dikwasi n'ala buru-buru ọmuma-ulo-ikwū.
14
Mb͕e igirigi nke dikwasi n'ala rigoro, le, n'elu ọzara imurimu ihe nke ekpere ekpè, imurimu ihe dika hoar frost nke di n'elu ala.
15
Umu Israel we hu ya, sirita onwe-ha, Gini ka ọ bu? n'ihi na ha amaghi ihe ọ bu. Moses si ha, Nke ahu bu nri nke Jehova nyeworo unu ka unu rie.
16
Nka bu ihe Jehova nyere n'iwu, Chikọtanu ufọdu nime ya, onye ọ bula dika oriri-ya si di; otù ọtùtù omer otù isi, dika ọnu-ọgugu madu-unu si di, ka unu gēwere ya, onye ọ bula o were ndi nọ n'ulo-ikwū-ya.
17
Umu Israel we me otú a, chikọta, otù onye nāchikọta ri nne, nke-ọzọ nāchikọta nke ntà.
18
Ha we were omer tùa ya, onye chikọtara ri nne enweghi kari nke gēzuru ya, onye chikọta-kwa-ra nke ntà, ọ dighi ihe fọduru ya inwe; onye ọ bula dika oriri-ya si di, otú a ka ha chikọtara.
19
Moses we si ha, Ka onye ọ bula ghara ime ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu.
20
Ma ha egeghi Moses nti; madu ufọdu nime ha we me ka ufọdu nime ya fọdu rue ututu, o we b͕a ikpuru, nēsì ísì: Moses we we iwe n'aru ha.
21
Ha we nāchikọta ya kwa-ututu, onye ọ bula dika oriri-ya si di: ma mb͕e anyanwu di ọku ọ b͕aze.
22
O rue, n'ubọchi nke-isi, na ha chikọtara nri okpukpu abua, ha nwere omer abua n'otù n'otù: ndi-isi nile nke nzukọ we bia, gosi Moses.
23
Ọ si ha, Nke ahu bu ihe Jehova kwuworo, si, Idebe-ubọchi-izu-ike, bú ubọchi-izu-ike di nsọ nye Jehova, ka echi bu: ihe unu nēghe, ghenu ya, ihe unu nēsi kwa, sienu ya; ma ihe nile nke fọduru, dọbaranu onwe-unu ya, ka ọ buru ihe-ndebe rue ututu.
24
Ha we dọba ya rue ututu, dika Moses nyere iwu: ma o sìghi ísì, ikpuru adighi kwa nime ya.
25
Moses we si, Rienu ya ta; n'ihi na ubọchi-izu-ike diri Jehova ka ta bu: ta unu agaghi-achọta ya n'ọhia.
26
Ubọchi isi ka unu gāchikọta ya; ma n'ubọchi nke-asa ka ubọchi-izu-ike di, ọ dighi nke gādi nime ya.
27
O rue, n'ubọchi nke-asa, na ufọdu nime ndi Israel puru apu ichikọta, ma ha achọtaghi.
28
Jehova we si Moses, Rùe ole mb͕e ka unu nāju idebe ihe nile M'nyere n'iwu na iwum nile?
29
Lenu, n'ihi na Jehova enyewo unu ubọchi-izu-ike, n'ihi nka Ya onwe-ya nēnye unu nri nke ubọchi abua n'ubọchi nke-isi; nọdunu, onye ọ bula n'ebe ọ nọ, ka onye ọ bula ghara isi n'ọnọdu-ya pua n'ubọchi nke-asa.
30
Ndi Israel we kwusi ilu ọlu n'ubọchi nke-asa.
31
Ulo Israel we kpọ aha-ya Manna: ihe ahu di ka nkpuru coriander, ọ di ọcha; idetu ya ire ọ di ka achicha wafer eji manu-aṅu me.
32
Moses we si, Nka bu ihe Jehova nyeworo n'iwu, si, Ka nju omer nime ya buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu; ka ha we hu nri M'mere ka unu rie n'ọzara, mb͕e M'mere ka unu si n'ala Ijipt puta.
33
Moses we si Eron, Were otù ite, tiye nju omer nke manna nime ya, dọba ya n'iru Jehova ka ọ buru ihe-ndebe anēdebere ọb͕ọ nile unu.
34
Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka Eron dọbara ya n'iru Ihe-àmà, ka ọ buru ihe-ndebe.
35
Umu Israel we rie manna ahu ọgu arọ abua, rue mb͕e ha batara n'ala ebí ebí; manna ahu ka ha riri, rue mb͕e ha batara na nsọtu ala Kenean.
36
Ma omer, otù uzọ n'uzọ iri nke ọtùtù ephah ka ọ bu.
← Chapter 15
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 17 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40