bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 29
Exodus 29
Igbo 2006
← Chapter 28
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 30 →
1
Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,
2
na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.
3
I gētiye ha n'otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu.
4
Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru.
5
I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya:
6
i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n'isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n'elu ákwà-nkukù-isi ahu.
7
I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n'isi-ya, we te ya.
8
Umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso, i gēyikwasi ha uwe-ime.
9
I gēwere kwa ihe ike n'úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n'isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n'ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.
10
I gākputa kwa oke-ehi ahu nso n'iru ulo-ikwū nzute: Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu.
11
I gēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.
12
I gēwere ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, tiye n'elu mpì nile nke ebe-ichu-àjà na nkpisi-aka-gi: ọ bu kwa ọbara nile ka i gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.
13
I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n'imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.
14
Ma anu oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na nsi-ya, i gēsure ya n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū-unu: àjà-nmehie ka ọ bu.
15
Otù nime ebulu abua ahu ka i gēwere kwa; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.
16
I gēb͕u ebulu ahu, were ọbara-ya, wusa n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.
17
I gābọ kwa ebulu ahu n'ọbubọ-ya, sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, tiye ha n'elu ọbubọ-ya, na n'elu isi-ya.
18
I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.
19
I gēwere kwa ebulu nke-ọzọ; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi kwa aka-ha n'isi ebulu ahu.
20
I gēb͕u kwa ebulu ahu, were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'ọnu-ọnu nti aka-nri umu-ya ndikom, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha, wusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.
21
I gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, na ufọdu nime manu nke otite-manu ahu, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya: ọ gādi kwa nsọ, ya onwe-ya, na uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom tiyere ya.
22
I gēsi kwa n'ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n'elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n'ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu:
23
na otù ob͕e achicha, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, site na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova:
24
i gātukwasi ha nile n'ọbu-aka abua nke Eron, na n'ọbu-aka nke umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.
25
I gānara kwa ha n'aka-ha, sure ha ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu, ka ha buru ihe ísì utọ n'iru Jehova: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.
26
I gēsi kwa n'ebulu nke nmeju-aka nke diri Eron were okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa òkè i nwere.
27
I gēdo kwa okpukpu-obi nke àjà-ofufé nsọ, ya na utaku-ukwu nke àjà-nbuli, nke anēfé, na nke anēbuli, site n'ebulu nke nmeju-aka ahu, bú site na nke diri Eron, site kwa na nke diri umu-ya ndikom:
28
ọ gābu kwa ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe dika ukpuru mb͕e ebighi-ebi sitere n'aka umu Israel: n'ihi na àjà-nbuli ka ọ bu: àjà-nbuli ka ọ gābu kwa sitere n'aka umu Israel, site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha, bú àjà-nbuli-ha anēbuliri Jehova.
29
Uwe nsọ Eron nwere gādiri umu-ya ndikom ndi gānọchi ya, ka ewe te ha manu nime ha, meju kwa aka-ha nime ha.
30
Ubọchi asa ka o gēyiri ha, bú onye-nchu-àjà ahu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom, mb͕e ọ nābà n'ulo-ikwū nzute ije ozi n'ebe nsọ ahu.
31
Ma ebulu nke nmeju-aka ahu, i gēwere ya sie anu-ya n'ebe di nsọ.
32
Eron na umu-ya ndikom gēri kwa anu ebulu ahu, na achicha nke di na nkata ahu, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.
33
Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n'ihi na nsọ ka ha di.
34
Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di.
35
I gēme kwa Eron, me kwa umu-ya ndikom, otú a, dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu: ubọchi asa ka i gēmeju aka-ha.
36
Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n'elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ.
37
Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.
38
Ma nka bu ihe i gāchu n'elu ebe-ichu-àjà ahu; umu-aturu abua, nke b͕ara otù arọ, kwa-ubọchi mb͕e dum.
39
Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu; chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi:
40
otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu.
41
Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi; dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ka ọ buru ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.
42
Ọ gābu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova: ebe M'gēzute unu, igwa gi okwu n'ebe ahu.
43
M'gēzute kwa umu Israel n'ebe ahu; anēji kwa ebubem do Ulo-ikwū ahu nsọ.
44
M'gēdo kwa ulo-ikwū nzute nsọ, ya na ebe-ichu-àjà ahu: Eron na umu-ya ndikom ka M'gēdo kwa nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.
45
M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gābu-kwa-ra ha Chineke.
46
Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-ha, Nke mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ka M'we biri n'etiti ha: Mu onwem bu Jehova Chineke-ha.
← Chapter 28
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 30 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40