bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 9
Exodus 9
Igbo 2006
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 10 →
1
Jehova we si Moses, Bakuru Fero, gwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
2
N'ihi na, ma ọ buru na gi onwe-gi nāju izipu ha, ma i nējigide ha,
3
le, aka Jehova di n'aru anu-ulo-gi nke di n'ọhia, n'aru inyinya-gi nile, na n'aru inyinya-ibu-gi nile, na n'aru camel-gi nile, na n'aru ìgwè ehi-gi, na n'aru ìgwè ewu na aturu-gi: ajọ ọria nke nēfe efe, nke di arọ́ nke-uku, gādi.
4
Jehova gākpa ókè n'etiti anu-ulo Israel na anu-ulo Ijipt: ọ dighi ihe gānwupu n'ihe nile umu Israel nwere.
5
Jehova we debe mb͕e akara àkà, si, Echi ka Jehova gēme ihe a n'ala nka.
6
Jehova we me ihe ahu n'echi-ya, anu-ulo Ijipt nile we nwua: ma nime anu-ulo umu Israel ọ dighi otù nwupuru.
7
Fero we ziga, ma, le, ọ dighi ma ọbuná otù nwupuru nime anu-ulo Israel. Obi Fero we di arọ́, o zipughi kwa ndi Israel.
8
Jehova we si Moses na Eron, Kporonu n'onwe-unu ntu oké ọku nju aka abua, ka Moses wu kwa ya n'iru elu-igwe n'anya Fero.
9
Ọ gāghọ uzuzu ntà n'elu ala Ijipt nile, ọ gāghọ kwa etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu, n'ala Ijipt nile.
10
Ha we kporo ntu oké ọku, guzo n'iru Fero; Moses we wua ya n'iru elu-igwe; o we ghọ ihe etuto nāb͕apú nb͕apú n'aru madu na n'aru anumanu.
11
Ndi-ode-akwukwọ di nsọ apughi kwa iguzo n'iru Moses, n'ihi ihe-ofifi ahu; n'ihi na ihe-etuto ahu di n'aru ndi-ode-akwukwọ di nsọ, na n'aru ndi Ijipt nile.
12
Jehova we me ka obi Fero di ike, ọ geghi kwa ha nti; dika Jehova gwara Moses.
13
Jehova we si Moses, Bilie n'isi-ututu, guzo onwe-gi n'iru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Zipu ndim, ka ha we fèm.
14
N'ihi na ọ bu na mb͕e a ka Mu gaje izite ihe-otitim nile n'obi-gi, na n'aru ndi-orù-gi, na n'aru ndi-gi; ka i we mara na ọ dighi onye di kam n'uwa nile.
15
N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa:
16
ma otú ọ di ọ bu n'ihi nka ka M'guzoworo gi, ka M'we me ka i hu ikem, ka ewe kọ kwa akukọ aham n'uwa nile.
17
Ì nọ nātuli onwe-gi elu dika obo-ihe imegide ndim rue ub͕u a, na i gaghi-ezipu ha?
18
Le, dika mb͕e a echi M'gaje ime ákú-miri-ígwé di arọ́ nke-uku ka o zo, nke ákú-miri-ígwé dika ya nādighi n'Ijipt site n'ubọchi atọrọ ntọ-ala-ya we rue ub͕u a.
19
Ma ub͕u a, ziga, me anu-ulo-gi na ndi nile i nwere n'ọhia ka ha laghachi n'ulo ọsọsọ; madu ọ bula na anumanu ọ bula nke agāhu n'ọhia, nke agaghi-achikọta ha n'ulo, ákú-miri-ígwé ahu gādakwasi ha, ha we nwua.
20
Onye nātu egwu okwu Jehova n'etiti ndi-orù Fero mere ndi-orù-ya na anu-ulo-ya ka ha b͕aghachi n'ulo:
21
ma onye nētiyeghi obi-ya n'okwu Jehova rapuru ndi-orù-ya na anu-ulo-ya n'ọhia.
22
Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ákú-miri-ígwé we di n'ala Ijipt nile, n'aru madu, na n'aru anumanu, na n'aru ihe-ọkukú ọ bula nke ubi, n'ala Ijipt.
23
Moses we setipu nkpa-n'aka-ya n'iru elu-igwe: Jehova we nye éb͕è-elu-igwe na ákú-miri-ígwé, ọku we nējeru ala; Jehova we me ka ákú-miri-ígwé zokwasi ala Ijipt.
24
Ákú-miri-ígwé we di, ọku nānwude kwa onwe-ya n'etiti ákú-miri-ígwé ahu, di arọ́ nke-uku, nke ihe dika ya nādighi n'ala Ijipt nile site na mb͕e ọ ghọrọ mba.
25
Ákú-miri-ígwé ahu we tib͕ue ihe nile nke di n'ọhia, ma madu ma anumanu, n'ala Ijipt nile; ọ bu kwa ihe-ọkukú nile ọ bula nke ubi ka ákú-miri-ígwé ahu tiri, ọ bu kwa osisi nile ọ bula nke ọhia ka o tipiara.
26
Nání n'ala Goshen, ebe umu Israel nọ, ka ákú-miri-ígwé nādighi.
27
Fero we zìe, kpọ Moses na Eron, si ha, Emehiewom ub͕u a: Jehova bu onye ezi omume, ma mu onwem na ndim bu ndi nēmebi iwu.
28
Riọnu Jehova; n'ihi na o zuwo, bú olu Chineke na ákú-miri-ígwé ndia; m'gēzipu kwa unu, unu agaghi-eguzo kwa ọzọ.
29
Moses we si ya, Mb͕e m'si n'obodo pua, M'gāb͕asara Jehova ọbu-akam abua; éb͕è-elu-igwe nile gākwusi, ákú-miri-ígwé agaghi-adi kwa ọzọ; ka i we mara na Jehova nwe uwa.
30
Ma gi onwe-gi na ndi-orù-gi, amawom na unu akātughi egwu iru Jehova, bú Chineke.
31
Eti-kwa-ra flax na ọka barley: n'ihi na ọka barley nāra oko, flax nāma ifuru.
32
Ma etighi ọka wheat na ọka spelt: n'ihi na ihe ahu etoghi.
33
Moses we si n'ebe Fero nọ, si n'obodo, pua, ọ we b͕asara Jehova ọbu-aka-ya abua: éb͕è-elu-igwe nile na ákú-miri-ígwé we kwusi, awusighi miri-ozuzo n'ala.
34
Fero we hu na miri-ozuzo na ákú-miri-ígwé na éb͕è-elu-igwe kwusiri, ọ we mehie ọzọ, me ka obi-ya di arọ́, ya na ndi-orù-ya.
35
Ewe me ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel; dika Jehova kwuru site n'aka Moses.
← Chapter 8
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 10 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40