bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Exodus 21
Exodus 21
Igbo 2006
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 22 →
1
Ma ndia bu ikpé nke i gētiye n'iru ha.
2
Mb͕e i b͕ata orù, bú onye-Hibru, arọ isi ka ọ gābu orù-gi: ma n'arọ nke-asa ọ gāpu nwere onwe-ya n'efu.
3
Ọ buru na ọ bata nání ya, ọ gāpu nání ya: ọ buru na onye nwere nwunye ka ọ bu, nwunye-ya gēso kwa ya pua.
4
Ọ buru na onye-nwe-ya enye ya nwunye, nwayi ahu ewe muara ya umu-ndikom ma-ọbu umu-ndinyom; nwayi ahu na umu-ya gābu ihe onye-nwe-ya nwere, ma ọ gapu nání ya.
5
Ma ọ buru na orù ahu asi n'ezie, Ahurum onye-nwem na nwunyem na umum n'anya; m'gaghi-apu nwere onwem:
6
onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
7
Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom.
8
Ọ buru na ọ jọ njọ n'anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n'ihi na ọ ghọb͕uru ya.
9
Ma ọ buru na ọ kwere na nwa-ya nwoke gālu ya, dika ihe ekpere n'ikpe bayere umu-ndinyom si di, otú a ka ọ gēme ya.
10
Ọ buru na ọ lutara ya nwunye ọzọ; ọ gaghi-ewebì anu-oriri-ya, na ihe-nb͕okwasi-ya, na ihe kwesiri ya dika nwunye.
11
Ma ọ buru na ọ meghi ihe atọ ndia nye ya, ọ gāpu kwa n'efu, nēnyeghi ego.
12
Onye nētib͕u madu, ọ we nwua, aghaghi ime ka ọ nwua.
13
Ma onye nēcheghi anwu, ma Chineke mere ka ọ dabà n'aka-ya; M'gēdoro gi ebe ọ gāb͕alaga.
14
Ma mb͕e onye ọ bula gēwere nganga biakwasi ibe-ya, ib͕u ya n'aghughọ; n'ebe-ichu-àjàm ka i gēwepu ya ka ọ nwua.
15
Onye nēti nna-ya, ma-ọbu nne-ya, ihe, aghaghi ime ka ọ nwua.
16
Onye nēzu madu n'ori re ya, ma-ọbu na asi na ahu ya n'aka-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.
17
Onye nākọcha nna-ya, ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua.
18
Mb͕e ndikom nēse okwu, ma otù nime ha ewere nkume ma-ọbu iwere ọkpọ ti ibe-ya, ma ọ nwughi, ma o dina n'ihe-ndina ọria:
19
ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.
20
Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n'aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n'okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya.
21
Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu.
22
Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé.
23
Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,
24
anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,
25
ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.
26
Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.
27
Ọ buru kwa na ọ me ka ezé orù-ya nwoke ma-ọbu ezé orù-ya nwayi dapu; ọ gēzipu kwa ya ka o nwere onwe-ya n'ihi ezé-ya.
28
Mb͕e ehi gāsọ nwoke ma-ọbu nwayi mpì, o we nwua, aghaghi itub͕u ehi ahu na nkume, agaghi-eri kwa anu-ya; ma agāgu onye-nwe ehi ahu n'onye ikpe nāmaghi.
29
Ma ọ buru na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ewe b͕ara onye-nwe-ya àmà, ma o debeghi ya nke-ọma, kama o mere ka nwoke ma-ọbu nwayi nwua; agātub͕u ehi ahu na nkume, ọzọ kwa, agēme ka onye-nwe-ya nwua.
30
Ọ buru na ihe ikpuchi nmehie-ya ka agātukwasi ya, ọ gēnye ihe-nb͕aputa nke ndu-ya, dika ihe nile agātukwasi ya si di.
31
Ma ọ bu nwa-nwoke ka ọ sọrọ mpì, ma ọ bu nwa-nwayi ka ọ sọrọ mpì, dika ikpé a si di ka agēme ya.
32
Ọ buru na orù-nwoke ma-ọbu orù-nwayi ka ehi ahu sọrọ mpì; orú shekel ọla-ọcha na iri ka ọ gēnye onye-nwe-ya, agātub͕u kwa ehi ahu.
33
Mb͕e onye ọ bula gēmeghe olùlù, ma-ọbu mb͕e onye ọ bula gēgwu olùlù, ghara imechi ya, ehi ma-ọbu inyinya-ibu ewe dabà nime ya,
34
onye-nwe olùlù ahu gākwughachi ihe; ego ka ọ gēnyeghachi onye-nwe-ya, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.
35
Mb͕e ehi onye ọ bula gēmeru ehi nke madu-ibe-ya aru, ọ we nwua; ha gēre kwa ehi di ndu, kè ego-ya: ọzọ kwa, nke nwuru anwu ka ha gēkè.
36
Ma-ọbu asi na amara na ehi ahu bu ehi nāsọ mpì na mb͕e gara aga, ma onye-nwe-ya edebeghi ya nke-ọma; ọ ghaghi ikwughachi ehi n'ọnọdu ehi ahu, nke nwuru anwu gābu kwa nke aka ya.
← Chapter 20
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 22 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40