bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Job 13
Job 13
Igbo 2006
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 14 →
1
Le, ihe a nile ka anyam huworo, Ntim anuwo, ghọta kwa ya.
2
Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem: Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.
3
Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu, Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
4
Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu, Ndi-dibia efu ka unu nile bu.
5
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti! Ọ we ghọro unu amam-ihe.
6
Biko, nurunu iru-ukam, Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.
7
Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume? Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?
8
Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma? Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
9
Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu? Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?
10
Ọ ghaghi ibara unu nba, Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.
11
Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku? Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?
12
Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu, Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.
13
B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem, Gini gāgabiga kwa n'arum?
14
N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém, Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?
15
Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere: Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.
16
Ọzọ, Ya onwe-ya gāburum nzọputa; N'ihi na onye emeruru emeru agaghi-abia n'iru Ya.
17
Nurunu okwum nile nke-ọma, Ka nkwuputam di kwa na nti-unu.
18
Biko, le, edowom ikpém n'usoro; Amawom na mu onwem bu onye ezi omume.
19
Ònye bu onye ahu nke mu na ya gēkpe ikpe? N'ihi na ub͕u a ka m'gāb͕a nkiti, kubìe ume.
20
Nání emelam ihe abua, Mb͕e ahu m'gaghi-ezopu onwem n'iru Gi:
21
Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya; Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
22
Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa; Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
23
Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole? Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
24
N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?
25
Ì gēme ka akwukwọ osisi nke ifufe nēfepu ma jijiji? Ma-ọbu Ì gāchu ahihia ọ̄ka kpọrọ akpọ?
26
N'ihi na I nēde ihe di ilu n'akwukwọ megidem, I nēme kwa ka m'nweta ajọ omume nile m'mere n'okorọbiam:
27
I nētiye kwa ukwum abua n'ọtọsi, nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya; I nākpa Onwe-gi ókè buruburu ọbu-ukwum:
28
Bú madu nke di ka ihe rere ure nke nāka nká, Dika uwe nke nla riworo.
← Chapter 12
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 14 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42