bible
ra
🌐 Language
English
Español
Français
Deutsch
Português
Italiano
Nederlands
Русский
中文
日本語
한국어
العربية
Türkçe
Tiếng Việt
ไทย
Indonesia
All Languages
Home
/
Igbo
/
Igbo 2006
/
Job 6
Job 6
Igbo 2006
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 7 →
1
Job we za, si,
2
Biko, ka atùa nkpasu-iwem nke-ọma, Ka ha buli kwa nmebim n'ihe-ọtùtù n'otù!
3
N'ihi na ub͕u a ọ di arọ́ kari ájá oké osimiri nile: N'ihi ya ka okwum nile sihieworo uzọ.
4
N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.
5
Inyinya-ibu-ọhia, ò nēti nkpu n'elu ahihia ndu? Ma-ọbu ehi, ò nēti nkpu n'elu nri agwara agwara nye ya?
6
Ànēri ihe nke nādighi utọ n'ire, ma nnú adighi ya? Ma-ọbu ùtọ di na nke di ọcha nime àkwá?
7
Ihe nkpuru-obim nāju imetu, Ihe ndia di ka nrim nke mebiri emebi.
8
Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!
9
Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.
10
Nkasi-obim we nādiru ub͕u a; M'we wulie elu n'ihe-nb͕u nke nādighi-enwe ọmiko: N'ihi na ezoghm okwu-ọnu nile nke Onye Nsọ.
11
Gini bu ikem na m'gēche? Gini bu kwa ọgwugwum, na m'gēme ka ndum di ogologo?
12
Ọ̀ bu ike nkume ka ikem bu? Ma-ọbu anu-arum, ọ̀ bu ọla?
13
Ọ̀ bughi na iye-akam adighi nimem? Na enupuwo kwa nzube-ihe n'ebe m'nọ?
14
Onye obi nālọ ya miri kwesiri inwe ebere site n'aka eyì-ya; Bú onye nārapu kwa egwu Onye Nke puru ime ihe nile.
15
Umu-nnem aghọb͕uwom dika miri-iyi, Dika ebe miri-iyi nke nērùbiga nērù;
16
Nke nēji nji n'ihi ice, Nke snow nēzó onwe-ya nime ha:
17
Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu: Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.
18
Ndi-ije nke uzọ-ha nēchighari onwe-ha; Ha nārigo n'ebe tọb͕ọrọ n'efu, we la n'iyì.
19
Ndi-ije nke Tima legidere anya, Usu-ndi-ije nke Sheba lere anya ha.
20
Ihere mere ha n'ihi na ha tukwasiri ha obi; Ha biaruru ebe ahu, iru-ha we nwughari n'ihi ihere.
21
N'ihi na ub͕u a unu abughi ihe; Unu nāhu ihe-ujọ, we tua egwu.
22
Ọ̀ bu na m'siri, Nyenum ihe? Ma-ọbu, Nyenu ihe-iri-ngo n'ihim site n'àkù-unu?
23
Ma-ọbu, Wepuganum n'aka onye-nkpab͕u? Ma-ọbu, B͕aputanum n'aka ndi nēme ka madu ma jijiji?
24
Zínum ihe, mu onwem gāb͕a kwa nkiti: Me-kwa-num ka m'ghọta ihe m'mehieworo n'amaghi-ama.
25
Le ka okwu-ọnu nke ziri ezi si di irè! Ma gini ka iba-nba nke si n'ọnu-unu puta nābara?
26
Ùnu nēchè na unu gābara okwu nba? Ebe okwu-ọnu nile nke onye nādighi-atukwasi obi-ya n'ihe di ka ifufe.
27
Ọzọ kwa, n'aru nwa-nb͕ei ka unu nēfekwasi nzà, Unu nēwere kwa eyì-unu zua ahia.
28
Ma ub͕u a kwenu ichem iru; Ọ̀ bu kwa n'iru unu ka m'gēkwu okwu-ugha?
29
Biko, chigharianu, ka ajọ omume ghara idi; E, chigharianu ọzọ, ezi omumem di nime ya.
30
Ọ̀ di ajọ omume di n'irem? Òkpo-ọnum agaghi-amata ihe anāchọsi ike?
← Chapter 5
Jump to:
Chapter 1
Chapter 2
Chapter 3
Chapter 4
Chapter 5
Chapter 6
Chapter 7
Chapter 8
Chapter 9
Chapter 10
Chapter 11
Chapter 12
Chapter 13
Chapter 14
Chapter 15
Chapter 16
Chapter 17
Chapter 18
Chapter 19
Chapter 20
Chapter 21
Chapter 22
Chapter 23
Chapter 24
Chapter 25
Chapter 26
Chapter 27
Chapter 28
Chapter 29
Chapter 30
Chapter 31
Chapter 32
Chapter 33
Chapter 34
Chapter 35
Chapter 36
Chapter 37
Chapter 38
Chapter 39
Chapter 40
Chapter 41
Chapter 42
Chapter 7 →
All chapters:
1
2
3
4
5
6
7
8
9
10
11
12
13
14
15
16
17
18
19
20
21
22
23
24
25
26
27
28
29
30
31
32
33
34
35
36
37
38
39
40
41
42